< UHezekheli 25 >

1 Ilizwi leNkosi laselifika kimi, lisithi:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 Ndodana yomuntu, misa ubuso bakho bumelene labantwana bakoAmoni, uprofethe umelene labo.
“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha.
3 Uthi kubantwana bakoAmoni: Zwanini ilizwi leNkosi uJehova: Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba wathi: Aha; ngenxa yendawo yami engcwele, lapho ingcoliswa, langenxa yelizwe lakoIsrayeli, lapho lalichithiwe, langenxa yendlu yakoJuda, lapho baya ekuthunjweni,
Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu,
4 ngakho, khangela, ngizakunikela ebantwaneni basempumalanga ube yilifa, ukuthi bamise inkamba zabo phakathi kwakho, benze izindawo zabo zokuhlala phakathi kwakho; bona bazakudla izithelo zakho, bona banathe uchago lwakho.
nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị.
5 Njalo ngizakwenza iRaba ibe yisitebele samakamela, labantwana bakoAmoni babe yindawo yokucambalala yemihlambi. Khona lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
Aga m eme ka obodo Raba ghọọ ebe ịta nri nye ịnyịnya kamel, meekwa ka ala Amọn ghọọ ebe igwe ewu na atụrụ na-amakpu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
6 Ngoba itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba utshayile isandla, watshaya phansi ngonyawo, wathokoza emphefumulweni ngokudelela kwakho konke umelene lelizwe lakoIsrayeli;
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Nʼihi na ị kụrụ aka gị, zọọ ụkwụ gị nʼala gidim, ma sitekwa nʼịkpọ asị nke obi gị ṅụrịa ọṅụ megide ala Izrel,
7 ngakho, khangela, ngizakwelulela isandla sami phezu kwakho, ngikunikele ube yimpango kwabezizwe, ngikuqume usuke ebantwini, ngizakwenza ubhubhe emazweni, ngikuchithe. Khona uzakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
nʼihi ya, lee, aga m esetipụ aka m megide gị, were gị nyefee nʼaka ọtụtụ mba, ndị ga-alụta gị nʼagha. Aga m eme ka ị gwụsịa, mee ka ị hapụ ịdịkwa ọzọ. Aga m ala gị nʼiyi. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
8 Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba oMowabi loSeyiri bathi: Khangela, indlu kaJuda injengezizwe zonke;
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Moab na Sia sịrị, “Lee, Juda adịrịla ka mba ndị ọzọ niile,”
9 ngakho khangela, ngizavula uhlangothi lukaMowabi kusukela emizini, kusukela emizini yakhe, kusukela emngceleni wakhe, ubuhle belizwe, iBeti-Jeshimothi, iBhali-Meyoni, leKiriyathayimi;
nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ.
10 njalo ngizayinikela emadodaneni empumalanga kube yilifa ngimelene labantwana bakoAmoni, ukuze abantwana bakoAmoni bangakhunjulwa phakathi kwezizwe.
Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile.
11 Ngizakwenza izahlulelo laphakathi kukaMowabi; njalo bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
12 Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba uEdoma enze ngokuphindisela impindiselo emelene lendlu kaJuda, wonile ngokona, waziphindisela phezu kwabo;
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara,
13 ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Lami ngizakwelula isandla sami phezu kukaEdoma, ngiqume kuye umuntu lenyamazana, ngimenze incithakalo kusukela eThemani, njalo kuze kufike eDedani bazakuwa ngenkemba.
nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo.
14 Njalo ngizabeka impindiselo yami phezu kukaEdoma ngesandla sabantu bami uIsrayeli, benze kuEdoma njengokwentukuthelo yami lanjengokolaka lwami; khona bezakwazi impindiselo yami, itsho iNkosi uJehova.
Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
15 Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba amaFilisti enze ngempindiselo, aphindisela impindiselo ngokudelela emphefumulweni, ukuthi achithe ngenzondo yaphakade;
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi.
16 ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Khangela, ngizakwelulela isandla sami phezu kwamaFilisti, ngiqume amaKerethi, ngibhubhise insali yokhumbi lolwandle.
Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri.
17 Ngenze izimpindiselo ezinkulu phezu kwabo ngokukhuza kwentukuthelo; khona bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi, lapho ngibeka impindiselo yami phezu kwabo.
Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’”

< UHezekheli 25 >