< UHezekheli 13 >
1 Ilizwi leNkosi laselifika kimi lisithi:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 Ndodana yomuntu, profetha umelene labaprofethi bakoIsrayeli abaprofethayo, utsho kubo abaprofetha okwenhliziyo yabo: Zwanini ilizwi leNkosi.
“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
3 Itsho njalo iNkosi uJehova: Maye kubaprofethi abayizithutha, abalandela umoya wabo, abangabonanga lutho!
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ.
4 Israyeli, abaprofethi bakho banjengamakhanka emanxiweni.
Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe.
5 Kalenyukelanga ezikhexeni, kumbe libiyele indlu kaIsrayeli uthango ukuze ime empini ngosuku lweNkosi.
Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị.
6 Babone okuyize, lokuvumisa kwamanga, abathi: INkosi ithi; kanti iNkosi ingabathumanga; bathemba ekuqinisweni kwelizwi.
Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha.
7 Kalibonanga yini umbono oyize njalo likhulume ukuvumisa okungamanga yini? Kanti lithi: INkosi ithi; kodwa mina ngingakhulumanga.
Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?
8 Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Ngoba likhulume okuyize, labona amanga, ngakho, khangelani, ngimelene lani, itsho iNkosi uJehova.
“‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
9 Njalo isandla sami sizakuba phezu kwabaprofethi ababona okuyize, labavumisa amanga; kabayikuba senhlanganweni yabantu bami, futhi kabayikubhalwa embhalweni wendlu yakoIsrayeli, futhi kabayikungena elizweni lakoIsrayeli; njalo lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi uJehova.
Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
10 Ngoba, yebo ngoba beduhise abantu bami, besithi: Ukuthula; khona kungelakuthula; kwathi omunye wakha umduli ongaqinanga, khangela-ke, abanye bawubhada ngodaka olungalunganga.
“‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.
11 Tshono kulabo abawubhada ngekalaga ukuthi uzakuwa. Kuzakuba khona izulu elikhukhulayo; lawe, matshe amakhulu esiqhotho, uzakuwa, lomoya wesiphepho uwuqhekeze.
Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.
12 Khangela-ke, nxa umduli usuwile, kakuyikutshiwo yini kini ukuthi: Lungaphi udaka elalibhade ngalo?
Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?”
13 Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Ngizawuqhekeza ngomoya wesiphepho ekuthukutheleni kwami, kube khona izulu elikhukhulayo ngolaka lwami, lamatshe esiqhotho ngentukuthelo yami ukuwuqeda.
“‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya.
14 Ngokunjalo ngizadiliza umduli eliwubhade ngekalaga, ngiwuwisele emhlabathini, ukuze kwembuleke isisekelo sawo, uwe; njalo lizaqedwa phakathi kwawo; njalo lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
15 Ngokunjalo ngizaphelelisa ulaka lwami emdulini laphezu kwalabo abawubhade ngekalaga, besengisithi kini: Umduli kawusekho, lalabo abawubhadayo kabakho;
Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,
16 okutsho abaprofethi bakoIsrayeli abaprofetha ngeJerusalema, labayibonela umbono wokuthula, kanti kungelakuthula, itsho iNkosi uJehova.
bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”’
17 Wena-ke ndodana yomuntu, misa ubuso bakho bumelene lamadodakazi abantu bakho, abaprofetha okuvela enhliziyweni yabo, uprofethe umelene labo.
“Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha
18 Ubususithi: Itsho njalo iNkosi uJehova: Maye kwabesifazana abathungela izigqizo kuzo zonke izihlakala, abenza izimbombozo ezinde phezu kwekhanda labo bonke ubude, ukuze bazingele imiphefumulo! Lizazingela imiphefumulo yabantu bami yini, njalo lizazigcinela imiphefumulo iphila yini?
sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya?
19 Futhi lizangingcolisa yini phakathi kwabantu bami ngenxa yezandla ezigcwele ibhali, langenxa yezincezu zezinkwa, ukuthi libulale imiphefumulo ebingayikufa, lokuthi ligcine iphila imiphefumulo ebingayikuphila, ngokuqamba amanga kwenu ebantwini bami abalalela amanga?
Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha.
20 Ngalokho itsho njalo iNkosi uJehova: Khangelani, ngimelene lezigqizo zenu, elizingela ngazo lapho imiphefumulo liyenza iphaphe; ngizaziqamula engalweni zenu, ngiyekele imiphefumulo ihambe, ngitsho imiphefumulo eliyizingelayo liyenza iphaphe.
“‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa.
21 Lezimbombozo zenu ezinde ngizazidabula, ngophule abantu bami esandleni senu, ukuthi bengasayikuba sesandleni senu ukuba yimpango; njalo lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
22 Ngoba lidanisile inhliziyo yolungileyo ngamanga, engingamdabukisanga mina, langoba laqinisa izandla zomubi ukuze angaphenduki endleleni yakhe embi, ukumgcina ephila.
Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha.
23 Ngakho kalisayikubona okuyize njalo kaliyikuvumisa okuvunyiswayo; ngoba ngizakophula abantu bami esandleni senu; beselisazi ukuthi ngiyiNkosi.
Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”