< UHezekheli 12 >

1 Ilizwi leNkosi lafika futhi kimi lisithi:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 Ndodana yomuntu, uhlala phakathi kwendlu evukelayo, abalamehlo okubona, kodwa bengaboni, balendlebe zokuzwa, kodwa bengezwa; ngoba bayindlu evukelayo.
“Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.
3 Ngakho, wena ndodana yomuntu, zenzele impahla yokuthunjwa, usuke emini phambi kwamehlo abo, usuke endaweni yakho uye kwenye indawo phambi kwamehlo abo. Mhlawumbe bazabona lanxa beyindlu evukelayo.
“Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi.
4 Ubusukhupha impahla yakho emini phambi kwamehlo abo njengempahla yokuthunjwa; wena-ke uzaphuma ntambama phambi kwamehlo abo njengabaphuma besiya ekuthunjweni.
Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ.
5 Uzibhobozele umduli phambi kwamehlo abo, uyikhuphe kiwo.
Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ.
6 Phambi kwamehlo abo uzayithwala emahlombe, uyikhiphe emnyameni, ugubuzele ubuso bakho ukuze ungaboni umhlabathi; ngoba ngikubeke waba yisibonakaliso kuyo indlu yakoIsrayeli.
Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.”
7 Ngasengisenza ngokunjalo njengokulaywa kwami: Ngakhupha impahla yami emini, njengempahla yokuthunjwa; kwathi kusihlwa ngazibhobozela umduli ngesandla, ngayikhupha emnyameni ngayithwala emahlombe phambi kwamehlo abo.
Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya.
8 Ekuseni ilizwi leNkosi laselifika kimi lisithi:
Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
9 Ndodana yomuntu, kayitshongo yini kuwe indlu kaIsrayeli, indlu evukelayo, ukuthi: Wenzani?
“Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’
10 Tshono kubo: Itsho njalo iNkosi uJehova: Lo umthwalo umayelana lesiphathamandla eJerusalema, layo yonke indlu kaIsrayeli ephakathi kwabo.
“Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’
11 Wothi: Ngiyisibonakaliso senu; njengoba ngenzile, kuzakwenziwa njalo kubo, bazakuya ekuthunjweni ngokuthunjwa.
Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.
12 Njalo isiphathamandla esiphakathi kwabo sizayithwala emahlombe emnyameni, siphume; bazabhoboza umduli ukuze bakhuphe ngawo; sizagubuzela ubuso baso, ukuze singaboni umhlabathi ngamehlo.
“Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.
13 Njalo ngizakwendlala imbule lami phezu kwaso, ukuthi sibanjwe emgibeni wami; ngisilethe eBhabhiloni, ilizwe lamaKhaladiya; kanti kasiyikulibona, loba sizafela khona.
Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya.
14 Labo bonke abasihanqileyo ukuba lusizo lwaso lalo lonke ibutho laso ngizabahlakazela kuwo wonke umoya; ngihwatshe inkemba emva kwabo.
Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.
15 Khona bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi nxa ngibahlakazela ezizweni, ngibachithachithela emazweni.
“Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile.
16 Kodwa ngizatshiya amadoda amalutshwana kubo asuke enkembeni, endlaleni, lakumatshayabhuqe wesifo, ukuze balandise ngawo wonke amanyala abo phakathi kwezizwe abazafika kizo; njalo bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
17 Ilizwi leNkosi lafika kimi futhi lisithi:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
18 Ndodana yomuntu, dlana isinkwa sakho ngokuqhaqhazela, unathe amanzi akho ngokuthuthumela langokukhathazeka.
“Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere.
19 Ubususithi ebantwini belizwe: Itsho njalo iNkosi uJehova ngabahlali beJerusalema, ngelizwe lakoIsrayeli: Bazakudla isinkwa sabo ngokukhathazeka, banathe amanzi abo ngokwesabisayo, ukuze ilizwe labo libe lunxiwa ngokugcwala kwalo ngenxa yodlakela lwabo bonke abahlala kilo.
Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya.
20 Lemizi okuhlalwa kiyo izakuba ngamanxiwa, lelizwe libe yinkangala; njalo lizakwazi ukuthi ngiyiNkosi.
Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’”
21 Ilizwi leNkosi laselifika kimi lisithi:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
22 Ndodana yomuntu, kuyini lesisaga elilaso elizweni lakoIsrayeli esithi: Insuku ziyelulwa, lawo wonke umbono uyabhubha?
“Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’
23 Ngakho batshele uthi: Itsho njalo iNkosi uJehova: Ngizakwenza lesisaga siphele, njalo kabasayikusisebenzisa njengesaga koIsrayeli; kodwa tshono kubo: Kusondele izinsuku lelizwi lawo wonke umbono.
Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu.
24 Ngoba kakusayikuba khona lamunye umbono oyize, lokuvumisa okubutshelezi phakathi kwendlu yakoIsrayeli.
Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel.
25 Ngoba mina Nkosi ngizakhuluma; ilizwi engizalikhuluma lizakwenzeka, kalisayikuphuziswa; ngoba ezinsukwini zenu, lina ndlu evukelayo, ngizakhuluma ilizwi, ngilenze, itsho iNkosi uJehova.
Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
26 Lafika futhi kimi ilizwi leNkosi lisithi:
Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
27 Ndodana yomuntu, khangela, abendlu yakoIsrayeli bathi: Umbono awubonayo ungowensuku ezinengi, njalo uprofetha ngezikhathi ezikhatshana.
“Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’
28 Ngakho uthi kubo: Itsho njalo iNkosi uJehova: Kakusayikuphuziswa lelilodwa lamazwi ami, kodwa ilizwi engizalikhuluma lizakwenzeka, itsho iNkosi uJehova.
“Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”

< UHezekheli 12 >