< U-Eksodusi 5 >

1 Emva kwalokho-ke uMozisi loAroni bahamba bathi kuFaro: Itsho njalo iNkosi uNkulunkulu wakoIsrayeli: Bayekele abantu bami bahambe, bangigcinele umkhosi enkangala.
Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’”
2 Kodwa uFaro wathi: Ingubani iNkosi ukuthi ngilalele ilizwi layo, ngiyekele uIsrayeli ahambe? Kangiyazi iNkosi, futhi kangiyikumyekela uIsrayeli ahambe.
Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.”
3 Basebesithi: UNkulunkulu wamaHebheru uhlangane lathi; ake usiyekele sihambe uhambo lwensuku ezintathu enkangala, siyihlabele iNkosi uNkulunkulu wethu, hlezi isehlele ngomatshayabhuqe wesifo kumbe ngenkemba.
Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.”
4 Kodwa inkosi yeGibhithe yathi kubo: Kungani, Mozisi loAroni, lisusa abantu emisebenzini yabo? Yanini emithwalweni yenu!
Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!”
5 UFaro wasesithi: Khangelani, abantu belizwe sebebanengi, kanti liyabaphumuza emithwalweni yabo.
Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.”
6 Ngalolosuku uFaro waselaya abaqhubi besibhalo besizwe lezinduna zaso, esithi:
Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị,
7 Lingabe lisabanika abantu amahlanga okwenza izitina njengamandulo; kabahambe bona bayezibuthela amahlanga;
“Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha.
8 lenani lezitina abalenze mandulo lizabamisela lona, lingaphunguli kulo; ngoba bayavilapha; yikho bekhala besithi: Siyekeleni siyehlabela uNkulunkulu wethu.
Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’
9 Yenzani umsebenzi ube nzima kakhulu phezu kwamadoda, ukuze basebenze kuwo, bangalaleli amazwi enkohliso.
Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”
10 Abaqhubi besibhalo babantu baphuma, lezinduna zabo, bakhuluma ebantwini besithi: Utsho njalo uFaro: Kangiyikulinika amahlanga;
Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ.
11 hambani lina, lizithathele amahlanga lapho elingawathola khona; kodwa umsebenzi wenu kakuyikuphungulwa lutho kuwo.
Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’”
12 Abantu basebehlakazeka elizweni lonke leGibhithe ukuze babuthe izidindi zibe ngamahlanga.
Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik.
13 Abaqhubi besibhalo babahaluzelisa besithi: Qedani imisebenzi yenu, umlandu wosuku ngosuku lwawo, njengamhla kulamahlanga.
Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.”
14 Njalo izinduna zabantwana bakoIsrayeli, abaqhubi besibhalo bakaFaro abababekela zona, zatshaywa, kuthiwa: Kaliqedanga ngani umsebenzi wenu omisiweyo wokwenza izitina njengamandulo, layizolo lalamuhla?
Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?”
15 Izinduna zabantwana bakoIsrayeli zasezisiza, zakhala kuFaro zathi: Wenzelani kanje ezincekwini zakho?
Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso?
16 Amahlanga kawanikwa inceku zakho, kanti bathi kithi: Yenzani izitina. Khangela-ke, inceku zakho ziyatshaywa; kodwa icala ngelabantu bakho.
Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”
17 Kodwa wathi: Lina lingamavila, lingamavila; ngalokhu lithi: Siyekeleni siyehlabela iNkosi.
Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’
18 Khathesi-ke hambani, lisebenze; kodwa amahlanga kaliyikuwanikwa, kanti lizaletha inani lezitina.
Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”
19 Izinduna zabantwana bakoIsrayeli zasezibona ukuthi zazisebubini, nxa kuthiwa: Kaliyikuphungula ezitineni zenu, umlandu wosuku ngosuku lwawo.
Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.”
20 Zasezihlangana loMozisi loAroni ababemi ukubahlangabeza ekuphumeni kwabo kuFaro;
Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.
21 zasezisithi kubo: INkosi ilibone yahlulele; ngoba lenze iphunga lethu libe livumba emehlweni kaFaro lemehlweni enceku zakhe; linike inkemba esandleni sabo ukuze basibulale.
Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”
22 UMozisi wasebuyela eNkosini wathi: Nkosi, wenzeleni okubi kulesisizwe? Kungani ungithumile?
Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?
23 Ngoba selokhu ngaya kuFaro ukukhuluma ebizweni lakho, wenzile okubi kulesisizwe; futhi kawusikhululanga lokusikhulula isizwe sakho.
Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”

< U-Eksodusi 5 >