< U-Eksodusi 40 >

1 INkosi yasikhuluma kuMozisi isithi:
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 Ngosuku lwenyanga yokuqala, ngolokuqala lwenyanga, uzamisa ithabhanekele, ithente lenhlangano,
“Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ.
3 ubusufaka lapho umtshokotsho wobufakazi, umbomboze umtshokotsho ngeveyili.
Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya.
4 Ungenise itafula, uhlele okuhlelwayo phezu kwalo; ungenise uluthi lwesibane, ulumathise izibane zalo.
Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ.
5 Ubeke ilathi legolide lempepha phambi komtshokotsho wobufakazi, ulengise isilenge somnyango wethabhanekele.
Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ.
6 Ubeke ilathi lomnikelo wokutshiswa phambi komnyango wethabhanekele wethente lenhlangano,
“Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ.
7 ubeke inditshi yokugezela phakathi kwethente lenhlangano lelathi, uthele amanzi lapho.
Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri.
8 Umise iguma inhlangothi zonke, ulengise isilenge sesango leguma.
Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.
9 Uthathe amafutha okugcoba, ugcobe ithabhanekele lakho konke okukulo, ulingcwelise lempahla yalo yonke, njalo lizakuba ngcwele.
“Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ.
10 Njalo ugcobe ilathi lomnikelo wokutshiswa lezitsha zalo zonke, ulingcwelise ilathi, njalo ilathi lizakuba yingcwelengcwele.
Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.
11 Njalo ugcobe inditshi yokugezela lonyawo lwayo, uyingcwelise.
Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.
12 Usondeze uAroni lamadodana akhe emnyango wethente lenhlangano, ubagezise ngamanzi.
“Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.
13 Ugqokise uAroni izembatho ezingcwele, umgcobe, umngcwelise, ukuze angisebenzele njengompristi.
Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja.
14 Usondeze amadodana akhe, uwagqokise izigqoko,
Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ.
15 uwagcobe njengalokhu ugcobe uyise, ukuze angisebenzele njengabapristi; kuzakuthi-ke ukugcotshwa kwabo kuzakuba kubo yibupristi obuphakade kuzizukulwana zabo.
Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
16 UMozisi wenza njengakho konke iNkosi eyayimlaye khona; wenza njalo.
Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.
17 Kwasekusithi ngenyanga yokuqala ngomnyaka wesibili ngolokuqala lwenyanga ithabhanekele lamiswa.
O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ.
18 UMozisi wasemisa ithabhanekele; wabeka phansi izisekelo zalo, wamisa amapulanka alo, wafaka imithando yalo, wamisa insika zalo.
Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha.
19 Wendlala ithente phezu kwethabhanekele, wabeka isifulelo sethente phezu kwalo phezulu, njengokulaya kweNkosi kuMozisi.
Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu.
20 Wathatha wafaka ubufakazi emtshokotshweni, wafaka imijabo emtshokotshweni, wafaka isihlalo somusa ngaphezu komtshokotsho phezulu.
O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
21 Wangenisa umtshokotsho ethabhanekeleni, wamisa iveyili lesembeso wambomboza umtshokotsho wobufakazi, njengokulaya kweNkosi kuMozisi.
Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
22 Wasefaka itafula ethenteni lenhlangano, eceleni kwethabhanekele ngenyakatho ngaphandle kweveyili,
Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ.
23 wahlela isinkwa ngohlelo phezu kwalo phambi kweNkosi, njengokulaya kweNkosi kuMozisi.
Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu Onyenwe anyị nʼelu tebul ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
24 Wafaka uluthi lwesibane ethenteni lenhlangano, maqondana letafula, eceleni kwethabhanekele ngeningizimu.
Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
25 Walumathisa izibane phambi kweNkosi, njengokulaya kweNkosi kuMozisi.
Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu.
26 Wafaka ilathi legolide ethenteni lenhlangano phambi kweveyili,
Mosis debere ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nʼime ụlọ nzute nso nso ebe akwa mgbochi ahụ dị,
27 watshisa kulo impepha elephunga elimnandi, njengokulaya kweNkosi kuMozisi.
surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
28 Walengisa isilenge somnyango wethabhanekele.
Ọ kwụbara akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
29 Wabeka ilathi lomnikelo wokutshiswa emnyango wethabhanekele lethente lenhlangano, wanikela kulo umnikelo wokutshiswa lomnikelo wokudla, njengokulaya kweNkosi kuMozisi.
Debekwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nso ọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute ahụ. O surekwara aja nsure ọkụ nʼelu ya, na aja onyinye mkpụrụ ọka dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu.
30 Wabeka inditshi yokugezela phakathi kwethente lenhlangano lelathi, wathela lapho amanzi okugeza.
Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe.
31 UMozisi loAroni lamadodana akhe bagezela kuyo izandla zabo lenyawo zabo;
Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha.
32 ekungeneni kwabo ethenteni lenhlangano lekusondeleni kwabo elathini bageza, njengokulaya kweNkosi kuMozisi.
Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
33 Wasemisa iguma lazingelezela ithabhanekele lelathi, walengisa isilenge sesango leguma. UMozisi wasewuqeda umsebenzi.
Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.
34 Iyezi laselisibekela ithente lenhlangano, lenkazimulo yeNkosi yagcwalisa ithabhanekele.
Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.
35 Ngakho uMozisi wayengelakungena ethenteni lenhlangano, ngoba iyezi lahlala phezu kwalo lenkazimulo yeNkosi yagcwalisa ithabhanekele.
Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.
36 Lalapho iyezi lisenyuswa lisuka ethabhanekeleni, abantwana bakoIsrayeli baqhubekela phambili enhambeni zabo zonke,
Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.
37 kodwa lapho iyezi lingenyuswanga kabahambanga kuze kufike usuku lokwenyuswa kwalo.
Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.
38 Ngoba iyezi leNkosi laliphezu kwethabhanekele emini, lomlilo wawuphezu kwalo ebusuku, phambi kwamehlo endlu yonke yakoIsrayeli, enhambeni zabo zonke.
Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.

< U-Eksodusi 40 >