< U-Eksodusi 35 >

1 UMozisi wasebuthanisa inhlangano yonke yabantwana bakoIsrayeli, wathi kubo: La ngamazwi iNkosi ewalayileyo ukuthi liwenze.
Emesịa, Mosis kpọrọ nzukọ ụmụ Izrel niile gwa ha sị, “Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere nke unu na-aghaghị idebe.
2 Insuku eziyisithupha kuzakwenziwa umsebenzi, kodwa ngosuku lwesikhombisa kuzakuba yibungcwele kini, isabatha lokuphumula eNkosini; loba ngubani owenza umsebenzi ngalo uzabulawa.
Rụọnụ ọrụ ụbọchị isii, ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike, ụbọchị dị nsọ nke izuike nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị nke asaa ga-anwụ.
3 Lingabasi umlilo ngosuku lwesabatha kuyo yonke imizi yenu.
Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.”
4 UMozisi wasekhuluma kunhlangano yonke yabantwana bakoIsrayeli esithi: Yile into iNkosi eyilayileyo isithi:
Mgbe ahụ Mosis gwara nzukọ Izrel niile sị, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere,
5 Thathani phakathi kwenu umnikelo ube ngoweNkosi; loba ngubani olenhliziyo evumayo kawulethe, umnikelo weNkosi, igolide lesiliva lethusi,
sitenụ nʼihe unu nwere wetara Onyenwe anyị onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara Onyenwe anyị onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz,
6 lokuluhlaza okwesibhakabhaka lokuyibubende lokubomvu, lelembu elicolekileyo kakhulu, loboya bembuzi,
ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, na ajị ewu;
7 lezikhumba eziphendulwe zababomvu zezinqama, lezikhumba zikamantswane, lezihlahla zesinga,
akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
8 lamafutha ezibane, lamakha amafutha okugcoba lempepha elephunga elimnandi,
mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
9 lamatshe ama-onikse, lamatshe okubekwa awe-efodi lawesembatho sesifuba.
nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
10 Labo bonke abalenhliziyo ehlakaniphileyo phakathi kwenu kabeze benze konke iNkosi ekulayileyo;
“Unu niile ndị nwere onyinye ịkwa ǹka, bịanụ rụọ ihe ahụ niile Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu ịrụ, nke bụ ihe ndị a:
11 ithabhanekele, ithente lalo, lesifulelo salo, ingwegwe zalo, lamapulanka alo, imithando yalo, insika zalo, lezisekelo zalo;
“ụlọ nzute ahụ, na ihe mkpuchi ya, na nko ya niile, na mbudo ibo ya, na mkpọrọ osisi ya, na ogidi ya, na ụkwụ ya niile.
12 umtshokotsho, lemijabo yawo, isihlalo somusa, leveyili lesembeso;
Rụkwanụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na mkpara ahụ e ji ebu ya. Ya na oche ebere ahụ. Mekwaanụ akwa mgbochi nke ga-ekpuchi ebe nsọ ahụ,
13 itafula, lemijabo yalo, lezitsha zalo zonke, lezinkwa zokubukiswa;
na tebul ahụ, na mkpara e ji ebu ya, na ngwongwo ya niile, na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
14 loluthi lwesibane sesikhanyiso, lezitsha zalo, lezibane zalo, lamafutha esikhanyiso;
Mekwaa ebe ịdọkwasị oriọna maka ìhè, ya na ngwongwo ya niile, iheọkụ na mmanụ maka ịmụ ọkụ;
15 lelathi lempepha, lemijabo yalo, lamafutha okugcoba, lempepha elephunga elimnandi, lesilenge somnyango emnyango wethabhanekele;
nʼebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na mkpara ya. Mmanụ nsọ ahụ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke e ji ụda mee; akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ nke dị nʼebe mbata ụlọ nzute ahụ;
16 ilathi lomnikelo wokutshiswa, lesihlengo sethusi elilaso, imijabo yalo, lazo zonke izitsha zalo, inditshi yokugezela lonyawo lwayo;
ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ya na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara e ji ebu ya na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ na ihe ndọkwasị ya.
17 amakhetheni eguma, insika zalo, lezisekelo zazo, lesilenge sesango leguma;
Akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ na ogidi ha, na ihe ndọkwasị ya, nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ;
18 izikhonkwane zethabhanekele, lezikhonkwane zeguma, lentambo zazo;
ǹtu maka ịkpọgide ụlọ ikwu ahụ na nke ogige ahụ, na ụdọ ha,
19 izembatho ezifekethisiweyo zokukhonza endaweni engcwele, izembatho ezingcwele zikaAroni umpristi, lezembatho zamadodana akhe, ukusebenza njengabapristi.
uwe niile a kpara akpa nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja.”
20 Lenhlangano yonke yabantwana bakoIsrayeli yaphuma phambi kukaMozisi.
Ugbu a, ọgbakọ ụmụ Izrel niile siri nʼihu Mosis pụọ.
21 Beza-ke, wonke onhliziyo yakhe eyamvusayo, laye wonke omoya wakhe owamenza wavuma, baletha umnikelo eNkosini emsebenzini wethente lenhlangano lowenkonzo yonke yalo lowezembatho ezingcwele.
Onye ọbụla chọrọnụ na onye nke mmụọ ya kwaliri laghachiri azụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye nʼihi ọrụ nke ụlọ nzute ahụ na nʼihi ije ozi dị nʼime ya na nʼihi uwe nsọ ndị ahụ.
22 Beza-ke abesilisa kanye labesifazana, bonke abavumayo ngenhliziyo, baletha iziceco lamacici lendandatho lamasongo, zonke izinto zegolide; laye wonke owazunguza umnikelo wokuzunguzwa wegolide eNkosini.
Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
23 Laye wonke okwatholakala kuye okuluhlaza okwesibhakabhaka lokuyibubende lokubomvu lelembu elicolekileyo kakhulu loboya bembuzi lezikhumba eziphendulwe zababomvu zenqama lezikhumba zikamantswane bakuletha.
Ụfọdụ mmadụ wetara akwa na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie na nke uhie uhie maọbụ ezi akwa ọcha maọbụ akpụkpọ ajị ewu, akpụkpọ ebule e sijiri ọbara ọbara na akpụkpọ ehi mmiri.
24 Wonke owanikela umnikelo wokuzunguzwa wesiliva lowethusi bakuletha kungumnikelo wokuzunguzwa weNkosi; laye wonke okwatholakala kuye izihlahla zesinga ezawo wonke umsebenzi wenkonzo baziletha.
Ndị ọzọ wetara ọlaọcha na bronz, dịka onyinye ha nyere Onyenwe anyị, ụfọdụ wetara osisi akashia nke a ga-eji wuo ụlọ ikwu ahụ.
25 Labo bonke abesifazana ababehlakaniphile ngenhliziyo baphotha ngezandla zabo, baletha okuphothiweyo, okuluhlaza okwesibhakabhaka, lokuyibubende, okubomvu, lelembu elicolekileyo kakhulu.
Ụmụ nwanyị ndị bụ ọka nʼịdụ akwa na ikwe akwa tụrụ eri na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na nke ezi akwa ọcha, webata ha dịka onyinye.
26 Labo bonke abesifazana abanhliziyo zabo zabavusa enhlakanipheni baphotha uboya bembuzi.
Ụfọdụ ụmụ nwanyị kwa ji onyinye ǹka pụrụ iche ha nwere kpaa ajị ewu dịka akwa pụrụ iche.
27 Lezinduna zaletha amatshe ama-onikse lamatshe okubekwa, awe-efodi lawesembatho sesifuba,
Ndị ndu niile wetakwara nkume ọniks na nkume ndị ọzọ nke ịhịọnye nʼihe a ga-eji dụọ efọọd na ihe mgbochi obi ahụ.
28 lamakha lamafutha awesibane, lawamafutha okugcoba, lawempepha elephunga elimnandi.
Ha wetakwara ụda dị iche iche, mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, nke a ga-eji mee mmanụ otite dị nsọ, mekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
29 Abantwana bakoIsrayeli bawuletha umnikelo wesihle eNkosini. Bonke abesilisa labesifazana abanhliziyo zabo zabenza bavuma ukulethela wonke umsebenzi iNkosi eyayiwulayile ukuthi wenziwe ngesandla sikaMozisi.
Nʼụzọ dị otu a ka ụmụ Izrel niile, ma nwoke ma nwanyị, ndị chọrọ inyeaka nʼọrụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si weta onyinye ha. Onye ọbụla nʼime ha nyere Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu.
30 UMozisi wasesithi ebantwaneni bakoIsrayeli: Bonani, iNkosi imbizile ngebizo uBhezaleli indodana kaUri, indodana kaHuri owesizwe sakoJuda;
Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel, sị, “Lee, Onyenwe anyị ahọpụtala Bezalel, nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda.
31 imgcwalisile ngoMoya kaNkulunkulu enhlakanipheni, ekuqedisiseni, lelwazini, lemisebenzini yobungcitshi yonke,
O mejupụtala na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta na ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche.
32 lokuthi acebe ubungcitshi ukusebenza ngegolide langesiliva langethusi,
Ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
33 lekubazeni amatshe okufakwa, lekubazeni izigodo, ukusebenza emisebenzini yonke yeminwe ngobungcitshi.
ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi nakwa ọrụ ǹka niile dị iche iche.
34 Ifakile laye enhliziyweni yakhe ukufundisa, yena loOholiyaba indodana kaAhisamaki owesizwe sakoDani.
Ma o tinyela nʼime ya na Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, amara ikuziri ndị ọzọ ihe.
35 Ibagcwalisile ngokuhlakanipha kwenhliziyo, ukwenza wonke umsebenzi wombazi, lowengcitshi, lowomfekethisi ngenalithi, ngokuluhlaza okwesibhakabhaka langokuyibubende, ngokubomvu langelembu elicolekileyo kakhulu, lowomeluki; besenza wonke umsebenzi beceba ubungcitshi.
O mejupụtala ha nʼike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, dịka igbunye akara, ise ihe osise, ịkpanye ihe ịchọ mma nʼakwa dị iche iche, ya bụ iji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie nakwa nʼezi akwa ọcha na nke ndị ọkpa akwa. Ha niile bụkwa ndị ǹka na ndị nchepụta ihe ịchọ mma doro anya.”

< U-Eksodusi 35 >