< U-Esta 6 >

1 Ngalobobusuku ubuthongo benkosi babaleka; yasisithi kakulethwe ugwalo lwezikhumbuzo lwemilando; yasibalwa phambi kwenkosi.
Nʼabalị ahụ, ụra abịaghị eze nʼanya ma ọlị. Nʼihi ya, o metụrụ ya nʼobi ịgụ akwụkwọ ihe ncheta. Ya mere, o nyere iwu ka e wetara ya akwụkwọ a na-edekọta ihe niile e mere nʼoge ọchịchị ya.
2 Kwasekutholakala kubhaliwe ukuthi uModekhayi wabika ngoBigithana loTereshi, abathenwa ababili benkosi, abalindi bombundu, ababedinge ukwelulela isandla enkosini uAhasuwerusi.
Nʼime ya, ọ gụtara ihe e dere banyere Mọdekai, otu o si kpughee izuzu ọjọọ Bigtan na Teresh, ndị onozi eze na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọeze, gbara igbu eze Sekses.
3 Inkosi yasisithi: Dumo lobukhulu bani obenziwa kuModekhayi ngalokhu? Izinceku zenkosi ezaziyikhonza zasezisithi: Kakwenziwanga lutho kuye.
Mgbe ahụ eze jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe ọma e meerela Mọdekai nʼihi ihe a o mere?” Ndị ozi ya zara, “O nwebeghị ihe ọbụla e meere ya!”
4 Inkosi yasisithi: Ngubani osegumeni? UHamani wayesengene egumeni elingaphandle lendlu yenkosi ukukhuluma enkosini ukuthi ilengise uModekhayi egodweni ayemlungisele lona.
Eze sịrị, “Onye nọ nʼogige?” Ma Heman ka batachara na mbata ogige ụlọeze, ịgwa eze banyere mkwugbu Mọdekai nʼelu osisi nke o guzobere nʼihi ya.
5 Izinceku zenkosi zasezisithi kuyo: Khangela, uHamani umi egumeni. Inkosi yasisithi: Kangene.
Ndị na-ejere ya ozi zara, “Heman na-eguzo nʼogige.” Eze sịrị, “Kpọbata ya.”
6 UHamani wasengena; inkosi yasisithi kuye: Kwenziweni kumuntu inkosi ethokoza kudumo lwakhe? UHamani wasesithi enhliziyweni yakhe: Ngubani inkosi engathokoza ukumnika udumo okwedlula mina?
Mgbe Heman batara, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ugwu m kwesiri inye onye mere ihe na-atọ m ụtọ?” Heman chere nʼime onwe ya sị, “Oleekwanụ onye ọzọ eze ga-achọ inye ugwu karịa mụ onwe m?”
7 UHamani wasesithi enkosini: Umuntu inkosi ethokoza kudumo lwakhe,
Ya mere ọ zara eze, “Banyere nwoke ahụ ọ masịrị eze ịkwanyere ugwu,
8 kakulethwe isembatho sobukhosi inkosi uqobo esigqokayo, lebhiza inkosi eligadayo, lokuthi umqhele wobukhosi ubekwe enhlokweni yalo;
nye iwu ka e wepụta uwe gị, nke gị bụ eze yitụrụla, na ịnyịnya gị, nke eze gbaarala, nke e kpukwasịrị oyiyi okpueze nʼisi ya.
9 lesembatho lebhiza kunikwe esandleni somunye weziphathamandla zenkosi ezihloniphekayo, lokuthi bagqokise lowomuntu inkosi ethokoza kudumo lwakhe, bamgadise ibhiza adabule igceke lomuzi, bamemeze phambi kwakhe bathi: Kwenziwa nje emuntwini inkosi ethokoza ngodumo lwakhe.
Ka enye uwe ahụ na ịnyịnya ahụ nʼaka otu onye kachasị nwee ugwu nʼime ụmụ eze, ka ha yikwasị nwoke ahụ nke eze chọrọ ịsọpụrụ uwe ahụ, ka ịnyịnya buru ya dịka ha dọkpụ ya na-ejegharị nʼokporoụzọ niile nʼobodo, na-ekwusa nʼihu ya na-asị, ‘Otu a ka a na-emere nwoke ahụ ọ masịrị eze inye nsọpụrụ!’”
10 Inkosi yasisithi kuHamani: Phangisa thatha isembatho lebhiza njengokutsho kwakho, wenze njalo kuModekhayi umJuda ohlala esangweni lenkosi; kungawi lalizwi kukho konke okukhulumileyo.
Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.”
11 UHamani wasethatha isembatho lebhiza, wagqokisa uModekhayi, wamgadisa wadabula igceke lomuzi, wamemeza phambi kwakhe wathi: Kwenziwa nje emuntwini inkosi ethokoza kudumo lwakhe.
Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”
12 Wasebuyela uModekhayi esangweni lenkosi, kodwa uHamani wahaluzela waya endlini yakhe elila embomboze ikhanda.
Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ,
13 UHamani wasetshela uZereshi umkakhe labo bonke abangane bakhe konke okumehleleyo. Abahlakaniphileyo bakhe loZereshi umkakhe basebesithi kuye: Uba uModekhayi engowenzalo yamaJuda, osuqalise ukuwa phambi kwakhe, kawuyikumelana laye, kodwa uzakuwa lokuwa phambi kwakhe.
ọ kọọrọ Zeresh nwunye ya, na ndị enyi ya niile ihe niile nke mere ya. Ndị ndụmọdụ ya na nwunye ya Zeresh sịrị ya, “Ebe ọ bụ na Mọdekai, onye ị bidoro ịda nʼihu ya, bụ onye Juu, ị gaghị enwe ike emegide ya, ị ghaghị ịla nʼiyi.”
14 Besakhuluma loHamani, abathenwa benkosi basondela, bahaluzela ukuletha uHamani edilini uEsta ayelenzile.
Mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, ndị onozi eze bịaruru duru Heman ngwangwa maka ịga nʼoriri ahụ Esta kwadoro.

< U-Esta 6 >