< UDutheronomi 18 >
1 Abapristi, amaLevi, isizwe sonke sakoLevi, kasiyikuba lesabelo lelifa kanye loIsrayeli; bazakudla iminikelo yeNkosi eyenziwe ngomlilo, lelifa layo.
Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha.
2 Ngakho kabayikuba lelifa phakathi kwabafowabo; iNkosi iyilifa labo, njengokukhuluma kwayo kibo.
Ha agaghị enwe ihe nketa ọbụla nʼetiti ụmụ Izrel ndị ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị abụrụla ihe nketa nke ha dịka o kwere ha na nkwa.
3 Lalokhu kuzakuba lilungelo labapristi elivela ebantwini, kulabo abahlaba umhlatshelo, loba inkabi loba imvu; njalo bazanika umpristi umkhono lemihlathi yomibili lolusu.
Nke ga-abụ oke ruuru ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ nọ, nʼebe ndị na-achụ aja, site nʼanụ ehi maọbụ atụrụ: a ga-enye onye nchụaja ubu aka ya, agba ya abụọ na afọ ya.
4 Okokuqala kwamabele akho, yewayini lakho elitsha, leyamafutha akho, lengqabutho yoboya bezimvu zakho, uzamupha yona.
Ha ga-enwetakwa mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi unu, ya bụ, ọka mbụ unu, mmanya vaịnị ọhụrụ unu, mmanụ oliv unu na ajị mbụ a kpụchapụtara site nʼahụ igwe atụrụ unu.
5 Ngoba iNkosi uNkulunkulu wakho imkhethile kuzo zonke izizwe zakho, ukuthi eme akhonze ebizweni leNkosi, yena lamadodana akhe, zonke izinsuku.
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile.
6 Uba-ke umLevi esiza evela loba kukuliphi lamasango akho kuIsrayeli wonke lapho ahlala khona njengowezizwe, eze ngesifiso sonke somphefumulo wakhe endaweni iNkosi ezayikhetha,
Onye Livayị ọbụla si nʼebe o bi kwapụ gaa biri nʼobodo ọzọ nʼIzrel nwere ike ije nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị họpụtara,
7 khona ezakhonza ebizweni leNkosi uNkulunkulu wakhe njengabo bonke abafowabo amaLevi, emiyo khona phambi kweNkosi.
ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
8 Azakudla izabelo ezilinganayo, ngaphandle kwezinto zakhe ezathengiswayo zaboyise.
Ọ ga-esokwa keta oke a na-ekenye ndị Livayị bi nʼobodo ahụ, nʼagbanyeghị na ọ na-enweta ego site nʼorire e rere ihe onwunwe ezinaụlọ ya.
9 Lapho usufikile elizweni iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona, ungafundi ukwenza ngokwezinengiso zalezozizwe.
Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ.
10 Kakuyikutholakala phakathi kwakho owenza indodana yakhe lendodakazi yakhe idabule emlilweni, owenza ukuvumisa, ochasisa ngemibono, lowenza imilingo, lomthakathi,
Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja,
11 lophosayo, lolamadlozi, lolumbayo, lobuza kwabafileyo.
maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ.
12 Ngoba wonke owenza lezizinto uyisinengiso eNkosini. Langenxa yalezizinengiso iNkosi uNkulunkulu wakho iyabaxotsha elifeni phambi kwakho.
Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.
13 Uzakuba ngopheleleyo eNkosini uNkulunkulu wakho.
Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
14 Ngoba izizwe lezi, ozakudla ilifa lazo, zalalela abachasisa ngemibono labavumisi; kodwa wena, iNkosi uNkulunkulu wakho kayikuvumelanga okunjalo.
Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.
15 INkosi uNkulunkulu wakho izakuvusela uMprofethi ophuma phakathi kwakho kubafowenu onjengami; yena limlalele.
Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị.
16 Njengakho konke owakucelayo eNkosini uNkulunkulu wakho eHorebe ngosuku lokuhlangana, usithi: Kangingaphindi ngilizwe ilizwi leNkosi uNkulunkulu wami, ngingabe ngisawubona lumlilo omkhulu, ukuze ngingafi.
Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.”
17 INkosi yasisithi kimi: Benze kuhle kwabakukhulumileyo.
Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma.
18 Ngizabavusela uMprofethi ophuma phakathi kwabafowabo onjengawe; ngizabeka amazwi ami emlonyeni wakhe, njalo akhulume kibo konke engizamlaya khona.
Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha.
19 Kuzakuthi-ke loba ngubani ongayikulalela amazwi ami azawakhuluma ebizweni lami, ngizakubuza kuye.
Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike.
20 Kodwa umprofethi oziqhenya ekhuluma ilizwi ebizweni lami engingamlayanga ukulikhuluma, loba ekhuluma ebizweni labanye onkulunkulu, lowomprofethi uzakufa.
Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”
21 Njalo uba usithi enhliziyweni yakho: Sizakwazi njani ilizwi iNkosi engalikhulumanga?
I nwere ike ikwu nʼobi gị sị, “Olee otu anyị ga-esi mata na okwu e kwuru si nʼaka Onyenwe anyị nʼezie?”
22 Lapho umprofethi ekhuluma ebizweni leNkosi, uba leyonto ingenzeki kumbe ingafiki, lelo yilizwi iNkosi engalikhulumanga; umprofethi ulikhulume ngokuziqhenya; ungamesabi.
Otu a ka unu ga-esi mata, ọ bụrụ na ihe onye amụma buru nʼamụma nʼaha Onyenwe anyị emezughị, okwu ahụ esighị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa. Ọ bụ okwu onye amụma ahụ chepụtara kwuo nʼonwe ya. Unu atụla ya ụjọ.