< UDanyeli 1 >

1 Ngomnyaka wesithathu wokubusa kukaJehoyakhimi inkosi yakoJuda, kwafika uNebhukadinezari inkosi yeBhabhiloni eJerusalema, wayivimbezela.
Mgbe afọ atọ gafere site na mgbe Jehoiakim bidoro bụrụ eze na-achị Juda, Nebukadneza eze na-achị Babilọn bịara buso Jerusalem agha.
2 INkosi yasinikela uJehoyakhimi inkosi yakoJuda esandleni sakhe, lengxenye yezitsha zendlu kaNkulunkulu; wasezisa elizweni leShinari, endlini kankulunkulu wakhe; waletha izitsha endlini yenotho kankulunkulu wakhe.
Onyenwe anyị nyefere Jehoiakim, eze Juda nʼaka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma. O buuru ha niile gawa Shaịna nʼụlọ chi ya, dobe ha nʼime nʼụlọakụ chi ya.
3 Inkosi yasikhuluma kuAshipenazi induna yabathenwa bayo, ukuthi alethe abanye kubantwana bakoIsrayeli, lakunzalo yesikhosini, lakuziphathamandla;
Eze nyere Ashipenaz, onyeisi ndị ozi ya iwu ka ọ kpọbata ụmụ okorobịa sitere nʼezinaụlọ eze na nke ndị ọchịchị nʼala Izrel nʼije ozi eze.
4 amajaha okungelalasici kuwo, amahle ngesimo, azingcwethi kuyo yonke inhlakanipho, alolwazi ngolwazi, alokuqedisisa ekwazini, lokwakulamandla kuwo okuma esigodlweni senkosi, lokuthi bawafundise izincwadi lolimi lwamaKhaladiya.
Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa.
5 Inkosi yasiwamisela into yosuku ngosuku lwayo esabelweni sokudla kwenkosi, lewayinini lokunatha kwayo, lokuthi bawakhulise iminyaka emithathu, ukuze ekupheleni kwayo azekuma phambi kwenkosi.
Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze.
6 Njalo kwakukhona phakathi kwabo kubantwana bakoJuda: ODaniyeli, uHananiya, uMishayeli, loAzariya.
Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda.
7 Njalo induna yabathenwa yabatha amabizo; ngoba yamutha uDaniyeli ngokuthi nguBeliteshazari; loHananiya ngokuthi nguShadraki; loMishayeli ngokuthi nguMeshaki; loAzariya ngokuthi nguAbedinego.
Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
8 Kodwa uDaniyeli wazimisela enhliziyweni yakhe ukuthi angazingcolisi ngesabelo sokudla kwenkosi, langewayini yokunatha kwayo; ngakho wacela enduneni yabathenwa ukuthi angazingcolisi.
Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.
9 UNkulunkulu wasemnika uDaniyeli umusa lesihawu phambi kwenduna yabathenwa.
Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha.
10 Induna yabathenwa yasisithi kuDaniyeli: Ngiyayesaba inkosi yami, inkosi, emise ukudla kwenu lokunathwayo kwenu; ngoba kungani izabona ubuso benu budanile kulamajaha ayintanga yenu? Ngokunjalo lizafaka ikhanda lami engozini enkosini.
Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”
11 UDaniyeli wasesithi kumphathi, induna yabathenwa eyayimmise waba phezu kwaboDaniyeli, uHananiya, uMishayeli, loAzariya:
Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka,
12 Ake ulinge inceku zakho insuku ezilitshumi; njalo basinike okwemibhida eyimidumba ukuthi sidle, lamanzi ukuthi sinathe.
“Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri.
13 Kakuthi-ke izimo zethu zibonakale phambi kwakho, lezimo zamajaha adla isabelo sokudla kwenkosi; wenze-ke ezincekwini zakho njengokubona kwakho.
Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.”
14 Wasebalalela kuloludaba, wabalinga insuku ezilitshumi.
O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.
15 Kwathi ekupheleni kwezinsuku ezilitshumi izimo zabo zabonakala zizinhle njalo zizimukile enyameni kulawo wonke amajaha ayesidla isabelo sokudla kwenkosi.
Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ.
16 Ngakho-ke umphathi wasusa isabelo sokudla kwabo, lewayini lokunatha kwabo, wabanika imibhida.
Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.
17 Mayelana lala amajaha amane, uNkulunkulu wawanika ulwazi lokuqedisisa kuzo zonke izincwadi, lenhlakanipho. Njalo uDaniyeli waqedisisa ngayo yonke imibono lamaphupho.
Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
18 Kwathi ekupheleni kwezinsuku inkosi eyayitshilo ukuthi bazawangenisa ngazo, induna yabathenwa yawangenisa phambi kukaNebhukadinezari.
Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza.
19 Inkosi yasikhuluma lawo; njalo phakathi kwawo wonke kakutholwanga onjengoDaniyeli, uHananiya, uMishayeli, loAzariya; ngakho ema phambi kwenkosi.
Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ.
20 Mayelana lazo zonke izindaba zenhlakanipho lokuqedisisa, inkosi eyayiwabuza ngazo, yawathola esedlula ngokuphindwe katshumi bonke abalumbi lezangoma abasembusweni wayo wonke.
Mgbe ọ bụlakwa eze chọrọ ndụmọdụ banyere amamihe na nghọta, ọ na-achọpụta na ndụmọdụ ha na-enye ya na-adị mma okpukpu iri karịa ndụmọdụ nke ndị majiki ya na ndị maara ihe banyere kpakpando nọ nʼalaeze ya na-enye ya.
21 Njalo uDaniyeli waba khona kwaze kwaba ngumnyaka wokuqala wenkosi uKoresi.
Daniel nọgidere bụrụ onye na-adụ eze ọdụ tutu ruo afọ mbụ nke Sairọs bidoro ịchị dịka eze.

< UDanyeli 1 >