< 2 USamuyeli 1 >

1 Kwasekusithi emva kokufa kukaSawuli, uDavida esephendukile ekutshayeni amaAmaleki, uDavida wahlala insuku ezimbili eZikilagi.
Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag.
2 Kwasekusithi ngosuku lwesithathu, khangela, kwafika umuntu evela enkambeni evela kuSawuli, ozigqoko zakhe zazidatshuliwe, elenhlabathi ekhanda lakhe. Kwasekusithi efika kuDavida wawela emhlabathini, wakhonza.
O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.
3 UDavida wasesithi kuye: Uvela ngaphi? Wasesithi kuye: Ngiphephile enkambeni yakoIsrayeli.
Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”
4 UDavida wasesithi kuye: Lunjani udaba? Akungitshele. Wasesithi: Abantu babalekile empini, labanengi babantu labo bawile njalo bafile, uSawuli laye loJonathani indodana yakhe labo bafile.
Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”
5 UDavida wasesithi kulelojaha elalimbikela: Wazi njani ukuthi uSawuli loJonathani indodana yakhe bafile?
Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
6 Lelojaha elalimbikela laselisithi: Kuthe ngisithi thutshu entabeni yeGilibowa, khangela, uSawuli eyeme emkhontweni wakhe, khangela-ke, inqola labagadi bamabhiza kwakumnamathele.
Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.
7 Lapho enyemukula, wasengibona, wangibiza; ngasengisithi: Khangela ngilapha.
Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
8 Wasesithi kimi: Ungubani? Ngasengisithi kuye: NgingumAmaleki.
“Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’
9 Wasesithi kimi: Ake ume phezu kwami ungibulale; ngoba ubuhlungu obukhulu bungehlele, ngoba impilo yami isaphelele kimi.
“Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
10 Ngakho ngema phezu kwakhe ngambulala, ngoba ngazi ukuthi angeke aphile emva kokuwa kwakhe. Ngasengithatha umqhele owawusekhanda lakhe, lesongo elalisengalweni yakhe, ngikulethile lapha enkosini yami.
“Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”
11 UDavida wasebamba izigqoko zakhe wazidabula, njalo lawo wonke amadoda ayelaye.
Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha.
12 Basebelila, bakhala inyembezi, bazila ukudla kwaze kwahlwa ngenxa kaSawuli, langenxa kaJonathani indodana yakhe, langenxa yabantu beNkosi, langenxa yendlu kaIsrayeli, ngoba babewe ngenkemba.
Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.
13 UDavida wasesithi kulelojaha elalimbikele: Uvela ngaphi? Laselisithi: Ngiyindodana yomuntu wezizweni, umAmaleki.
Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?” Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”
14 UDavida wasesithi kulo: Kawesabanga njani ukwelula isandla sakho ukubhubhisa ogcotshiweyo weNkosi?
Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”
15 UDavida wasebiza elinye lamajaha, wathi: Sondela ulidumele. Laselilitshaya laze lafa.
Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya.
16 UDavida wasesithi kulo: Igazi lakho kalibe phezu kwekhanda lakho; ngoba umlomo wakho ufakaze umelene lawe, usithi: Mina ngimbulele ogcotshiweyo weNkosi.
Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’”
17 UDavida waselila lesisililo ngenxa kaSawuli loJonathani indodana yakhe
Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.
18 (lapho wathi kufundiswe abantwana bakoJuda "IDandili"; khangela, kubhaliwe egwalweni lukaJashari):
O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
19 Ubuhle bukaIsrayeli bubulewe ezindaweni zakho eziphakemeyo. Awe njani amaqhawe!
“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa!
20 Lingakukhulumi eGathi, lingakumemezeli ezitaladeni zeAshikeloni, hlezi athokoze amadodakazi amaFilisti, hlezi ajabule amadodakazi abangasokwanga.
“Ekwutela ya na Gat. Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn. Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.
21 Zintaba zeGilibowa, kakungabi khona amazolo kumbe izulu phezu kwenu, kumbe amasimu eminikelo. Ngoba izihlangu zamaqhawe zangcoliswa khona; isihlangu sikaSawuli singagcotshwanga ngamafutha.
“Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu. Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.
22 Egazini lababuleweyo, emahwahweni amaqhawe idandili likaJonathani kaliphendukanga, lenkemba kaSawuli kayibuyelanga ize.
“Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.
23 USawuli loJonathani babethandeka bebahle empilweni zabo, lekufeni kwabo kabehlukaniswanga; babelesiqubu kulezinkozi, belamandla kulezilwane.
Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.
24 Madodakazi akoIsrayeli, mkhaleleni inyembezi uSawuli, owaligqokisa ngokubomvu lentokozo, owafaka imiceciso yegolide phezu kwezigqoko zenu.
“Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
25 Awe njani amaqhawe phakathi kwempi! Jonathani, ubulewe endaweni zakho eziphakemeyo!
“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
26 Ngidabukile ngawe, mfowethu Jonathani; ubumnandi kakhulu kimi, uthando lwakho belumangalisa kimi lusedlula uthando lwabesifazana.
ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
27 Awe njani amaqhawe, zabhubha lezikhali zempi!
“Lee ka ndị dị ike si daa! Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”

< 2 USamuyeli 1 >