< 2 Amakhosi 4 >

1 Kwasekukhala kuElisha umfazi othile wabafazi bamadodana abaprofethi esithi: Inceku yakho umkami sewafa; lawe uyazi ukuthi inceku yakho yayiyesaba iNkosi; sekufikile umkweledisi ukuzithathela abantwana bami ababili babe yizigqili.
Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, “Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwuOnyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya.”
2 UElisha wasesithi kuye: Ngingakwenzelani? Ngitshela, ulani endlini? Wasesithi: Incekukazi yakho kayilalutho endlini, ngaphandle kwesiphiso samafutha.
Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?” Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.”
3 Wasesithi: Hamba uyezebolekela izitsha ezivela phandle, kubomakhelwane bakho bonke, izitsha ezingelalutho, zingabi nlutshwana.
Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole.
4 Nxa usungenile uzivalele wena lamadodana akho umnyango, uthele kulezizitsha zonke; lokugcweleyo ukubeke eceleni.
Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.”
5 Wasesuka-ke kuye wazivalela yena lamadodana akhe umnyango; bazisondeza kuye, wathulula.
Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha.
6 Kwasekusithi izitsha sezigcwele wathi endodaneni yakhe: Ngilethela njalo isitsha. Yasisithi kuye: Kakuselasitsha. Amafutha asesima.
Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.” Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.
7 Wasesiza wamazisa umuntu kaNkulunkulu; wasesithi: Hamba uyethengisa amafutha, uhlawule isikwelede sakho; wena-ke lamadodana akho liphile ngaseleyo.
Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, “Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu.”
8 Kwasekusithi ngolunye usuku uElisha wedlulela eShunemi lapho okwakulowesifazana oyisikhulu owamcindezela ukuthi adle isinkwa. Kwakusithi-ke lanini esedlula, aphambukele khona ukuthi adle isinkwa.
Otu ụbọchị, Ịlaisha gara nʼobodo Shunem. Otu nwanyị nwere ugwu bi nʼebe ahụ. Nwanyị ahụ rịọsiri ya ike ka o rie nri. Nʼihi ya, mgbe ọbụla Ịlaisha si nʼebe ahụ gafee, ọ na-akwụsị nʼebe ahụ rie ihe.
9 Wasesithi kumkakhe: Khangela-ke, ngiyazi ukuthi lo ungumuntu ongcwele kaNkulunkulu, owedlula kithi njalonjalo.
Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, “O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke.
10 Ake senze ikamelo elincinyane eliphezulu emdulini, simfakele lapho umbheda letafula lesihlalo lesiqobane sesibane; kuzakuthi-ke lapho efika kithi aphambukele khona.
Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.”
11 Kwasekusithi ngolunye usuku wafika khona, waphambukela ekamelweni eliphezulu, walala khona.
Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ.
12 Wasesithi kuGehazi inceku yakhe: Biza lo umShunamikazi. Esembizile, wema phambi kwakhe.
Ọ sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, “Gaa kpọọ onye Shunem a,” Ya mere, ọ kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼihu ya,
13 Wasesithi kuyo: Tshono kuye-ke uthi: Khangela, usinakekele ngakho konke lokhukunaka; kuyini ongakwenzelwa? Kukhona ongakukhulunyelwa enkosini kumbe enduneni yebutho yini? Wasesithi: Ngihlala phakathi kwabantu bakithi.
Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’” Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.”
14 Wasesithi: Kuyini-ke angakwenzelwa? UGehazi wasesithi: Qiniso, kalamntwana, lomkakhe usemdala.
Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?” Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.”
15 Wasesithi: Mbize. Esembizile, wema emnyango.
Ịlaisha sịrị, “Kpọọ ya.” Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼọnụ ụzọ.
16 Wasesithi: Ngalesisikhathi esimisiweyo njengokwesikhathi sempilo uzagona umntwana. Kodwa wathi: Hatshi, nkosi yami, muntu kaNkulunkulu, ungayiqambeli amanga incekukazi yakho.
Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.” Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.”
17 Owesifazana wasekhulelwa, wabeletha umntwana ngalesosikhathi esimisiweyo njengokwesikhathi sempilo uElisha ayesitshilo kuye.
Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, ọ mụrụ nwa nwoke.
18 Esekhulile umntwana, kwathi ngosuku oluthile waphuma waya kuyise kubavuni.
Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka.
19 Wasesithi kuyise: Ikhanda lami! Ikhanda lami! Wasesithi encekwini: Mthwale umuse kunina.
O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!” Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.”
20 Isimthwele yamusa kunina, wahlala emadolweni akhe kwaze kwaba semini, wasesifa.
O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ.
21 Wasesenyuka, wamlalisa embhedeni womuntu kaNkulunkulu, wamvalela, waphuma.
Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ.
22 Wasememeza umkakhe wathi: Ake uthume kimi enye yezinceku lomunye wabobabhemi, ukuze ngigijime ngiye emuntwini kaNkulunkulu, ngibuye futhi.
O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, “Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ.”
23 Wasesithi. Uyelani kuye lamuhla? Kakusikuthwasa kwenyanga njalo kakusisabatha. Owesifazana wasesithi: Kulungile.
Ọ sịrị, “Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? Ọ bụghị Ọnwa ọhụrụ, ọ bụghịkwa ụbọchị izuike.” Ọ zara sị, “Udo dị.”
24 Esembophelele isihlalo ubabhemi, wathi encekwini yakhe: Tshaya uhambe, ungangibambeleli ekuhambeni, ngaphandle ngikutshele.
Mgbe ahụ, ọ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, “Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma ọ bụghị mgbe m gwara gị kwụsị.”
25 Wahamba-ke, weza emuntwini kaNkulunkulu entabeni iKharmeli. Kwasekusithi umuntu kaNkulunkulu embona esiza, wathi kuGehazi inceku yakhe: Khangela, nanguyana umShunamikazi.
Ya mere, o buliri ije, gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel. Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ.
26 Khathesi akugijime umhlangabeze, uthi kuye: Kulungile yini kuwe? Kulungile yini ngomkakho? Kulungile yini ngomntwana? Wasesithi: Kulungile.
Gbara ọsọ gaa zute ya jụọ ya sị ya, ‘Ọ dịkwa mma? Dị gị ọ nọkwa nʼudo? Nwa gị ọ nọkwa nʼudo?’” Mgbe Gehazi zutere ya jụọ ajụjụ ndị a, nwanyị ahụ zara Gehazi sị ya, “E, anyị niile nọ nʼudo, ihe niile na-aga nke ọma.”
27 Esefikile entabeni kumuntu kaNkulunkulu wabamba inyawo zakhe. Kodwa uGehazi wasondela ukumsunduza asuke. Kodwa umuntu kaNkulunkulu wathi: Myekele, ngoba umphefumulo wakhe umunyu kuye, leNkosi ingifihlele lokhu, kayingitshelanga.
Ma mgbe ọ bịakwutere onye nke Chineke, ọ dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, “Hapụ ya aka, nʼihi na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, ọ gwaghịkwa m ihe mere.”
28 Wasesithi: Ngangicelile indodana enkosini yami yini? Kangitshongo yini ukuthi: Ungangikhohlisi?
Nwanyị ahụ sịrị, “Onyenwe m, arịọrọ m gị nye m nwa nwoke? Ọ bụ na m asịghị gị, ‘emeela m ka m nwee olileanya’?”
29 UElisha wasesithi kuGehazi: Bopha ukhalo lwakho, uthathe udondolo lwami esandleni sakho, uhambe. Uba uhlangana lomuntu ungambingeleli, njalo uba umuntu ekubingelela ungamphenduli; ubeke udondolo lwami ebusweni bomntwana.
Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.”
30 Unina womntwana wasesithi: Kuphila kukaJehova lokuphila komphefumulo wakho, kangiyikukutshiya. Wasesukuma wamlandela.
Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya.
31 UGehazi wedlulela phambi kwabo, walubeka udondolo ebusweni bomntwana, kodwa kakubanga khona ilizwi njalo kwakungelakunaka. Wasebuyela ukumhlangabeza, wamtshela esithi: Umntwana kavukanga.
Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.”
32 UElisha esengenile endlini, khangela, umntwana wayefile, elaliswe embhedeni wakhe.
Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya.
33 Wasengena, wavala umnyango emva kwabo bobabili, wakhuleka eNkosini.
Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.
34 Wenyuka walala phezu komntwana, wabeka umlomo wakhe phezu komlomo wakhe lamehlo akhe phezu kwamehlo akhe lezandla zakhe phezu kwezandla zakhe, wacambalala phezu kwakhe; inyama yomntwana yasikhudumala.
Emesịa, ọ makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ.
35 Wasebuyela, wahambahamba endlini waya kanye ngapha lakanye le, wasesenyuka wacambalala phezu kwakhe; umntwana wasethimula kwaze kwaba kasikhombisa, umntwana wasevula amehlo akhe.
Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ.
36 Wasebiza uGehazi wathi: Mbize lo umShunamikazi. Wasembiza. Esefikile kuye, wathi kuye: Thatha umntanakho.
Ịlaisha kpọrọ Gehazi sị ya, “Kpọọ nwanyị Shunem.” Ya mere, ọ kpọrọ ya. Mgbe ọ bịakwutere ya, ọ sịrị, “Kuru nwa gị.”
37 Wasengena, wawela ezinyaweni zakhe, wakhothamela emhlabathini, waphakamisa umntanakhe, waphuma.
Ọ batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ.
38 UElisha wasebuyela eGiligali, njalo kwakukhona indlala elizweni, amadodana abaprofethi ayehlezi-ke phambi kwakhe, wathi encekwini yakhe: Beka imbiza enkulu eziko, uphekele abaprofethi ukudla okuphekiweyo.
Ịlaisha lọghachiri na Gilgal, mgbe ụnwụ dị nʼala ahụ. Otu ụbọchị, mgbe ya na ụfọdụ ndị amụma nọ na-enwe nzukọ, ọ gwara onye na-ejere ya ozi okwu sị ya: “Sikwasị ite ukwu ahụ nʼọkụ, siere ndị a mụ na ha nọ ihe oriri.”
39 Omunye wasephuma waya egangeni ukukha imibhida, wathola intandela yeganga, wakha amajodwana ayo eganga, isembatho sakhe sagcwala, weza wawaqobelela embizeni yokudla okuphekiweyo, ngoba ayengawazi.
Otu onye nʼime ha pụrụ banye nʼọhịa ịchịkọta akwụkwọ nri. Ọ hụrụ osisi vaịnị toro nʼọhịa, chịkọtaa ụfọdụ afụfa ọhịa, nke o kpojuru nʼuwe mwụda ya dịka ọ ga-ejideli. Mgbe ọ lọghachiri, o gbupịasịrị afụfa ọhịa ndị a, wụnye ha nʼime ite ahụ si nʼọkụ, ọ bụ ezie na o nweghị onye maara ihe ha bụ.
40 Basebethululela abantu ukuze badle; kwasekusithi besadla okokudla okuphekiweyo bona bamemeza bathi: Ukufa embizeni, muntu kaNkulunkulu! Njalo babengelakukudla.
Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya.
41 Wasesithi: Lethani-ke impuphu. Waseyithela embizeni wathi: Thululela abantu, ukuze badle. Kwakungaselalutho oluyingozi embizeni.
Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ.
42 Kwasekufika umuntu evela eBhali-Shalisha, walethela umuntu kaNkulunkulu ukudla kwezithelo zokuqala, izinkwa zebhali ezingamatshumi amabili, lezikhwebu zamabele amatsha emgodleni wakhe. Wasesithi: Banike abantu ukuze badle.
Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.”
43 Kodwa inceku yakhe yathi: Ini, ngibeke lokhu phambi kwabantu abalikhulu? Wasesithi: Banike abantu ukuze badle, ngoba itsho njalo iNkosi: Bazakudla, batshiye.
Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?” Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’”
44 Yasikubeka phambi kwabo, badla, batshiya, njengokwelizwi leNkosi.
Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị.

< 2 Amakhosi 4 >