< 2 Amakhosi 19 >

1 Kwasekusithi lapho inkosi uHezekhiya isizwile, yadabula izigqoko zayo, yazembesa ngesaka, yangena endlini yeNkosi.
Mgbe eze Hezekaya, nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2 Yasithuma uEliyakhimi owayephezu kwendlu, loShebina umabhalane, labadala babapristi, bembeswe ngamasaka kuIsaya umprofethi indodana kaAmozi.
O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.
3 Basebesithi kuye: Utsho njalo uHezekhiya: Lolusuku lusuku lohlupho lolokusolwa lolokweyiswa; ngoba abantwana sebefikile emlonyeni wesizalo, kanti kakulamandla okubeletha.
Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.
4 Mhlawumbe iNkosi uNkulunkulu wakho izakuzwa wonke amazwi kaRabi-Shake, inkosi yeAsiriya inkosi yakhe eyamthumayo, ukuthi aklolodele uNkulunkulu ophilayo; njalo izasola amazwi iNkosi uNkulunkulu wakho ewezwileyo: Ngakho phakamiselani insali etholakeleyo umkhuleko.
Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
5 Izinceku zenkosi uHezekhiya zasezifika kuIsaya.
Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,
6 UIsaya wasesithi kuzo: Lizakutsho njalo enkosini yenu: Utsho njalo uJehova: Ungesabi amazwi owezwileyo inceku zenkosi yeAsiriya ezingithuke ngawo.
ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.
7 Khangela, ngizafaka umoya kuyo, njalo izakuzwa ihungahunga, ibuyele elizweni layo; ngizayenza ukuthi iwe ngenkemba elizweni layo.
Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’”
8 URabi-Shake wasebuyela, wafica inkosi yeAsiriya isilwa imelene leLibhina; ngoba wayezwile ukuthi isisukile eLakishi.
Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
9 Kwathi isizwa ngoTirihaka inkosi yeEthiyophiya kuthiwa: Khangela, uphumile ukuyakulwa emelene lawe, yabuya yathuma izithunywa kuHezekhiya, isithi:
Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,
10 Lizakhuluma kanje kuHezekhiya inkosi yakoJuda, lithi: UNkulunkulu wakho omthembileyo kangakukhohlisi esithi: IJerusalema kayiyikunikelwa esandleni senkosi yeAsiriya.
“Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’
11 Khangela, wena usuzwile ukuthi amakhosi eAsiriya enzeni kuwo wonke amazwe, ngokuwatshabalalisa. Wena-ke uzakhululwa yini?
Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?
12 Onkulunkulu bezizwe bazikhululile yini, obaba abazichithayo, iGozani leHarani leRezefi labantwana bakaEdeni ababeseTelasari?
Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden, ndị nọ na Tel Asa?
13 Ingaphi inkosi yeHamathi, lenkosi yeArpadi, lenkosi yomuzi weSefavayimi, iHena, leIva?
Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”
14 UHezekhiya waseyemukela incwadi esandleni sezithunywa, wayibala, wasesenyukela endlini yeNkosi, uHezekhiya wayichaya phambi kweNkosi.
Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
15 UHezekhiya wasekhuleka phambi kweNkosi, wathi: Nkosi, Nkulunkulu kaIsrayeli, ohlala phakathi kwamakherubhi, wena unguNkulunkulu, wena wedwa, wayo yonke imibuso yomhlaba; wena wenze amazulu lomhlaba.
Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị, “O, Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.
16 Nkosi, thoba indlebe yakho, uzwe, Nkosi, vula amehlo akho, ubone; uzwe amazwi kaSenakheribi amthume ngawo ukuklolodela uNkulunkulu ophilayo.
Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
17 Qiniso, Nkosi, amakhosi eAsiriya azichithile izizwe lelizwe lazo,
“Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu.
18 aphosela onkulunkulu bazo emlilweni; ngoba babengeyisibo onkulunkulu, kodwa umsebenzi wezandla zabantu, izigodo lamatshe; ngakho bababhubhisa.
Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
19 Ngakho-ke, Nkosi Nkulunkulu wethu, ngicela usisindise esandleni sakhe, ukuze yonke imibuso yomhlaba yazi ukuthi wena uyiNkosi uNkulunkulu, wena wedwa.
Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị, naanị, bụ Chineke.”
20 UIsaya indodana kaAmozi wasethumela kuHezekhiya esithi: Itsho njalo iNkosi, uNkulunkulu wakoIsrayeli: Lokho okukhuleke kimi mayelana loSenakheribi inkosi yeAsiriya ngikuzwile.
Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa.
21 Yileli ilizwi iNkosi elikhulume mayelana laye: Intombi emsulwa, indodakazi yeZiyoni, iyakudelela, iyakuklolodela; indodakazi yeJerusalema inikina ikhanda ngemva kwakho.
Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya: “‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ
22 Ngubani omeyisileyo wamhlambaza? Njalo uphakamisele bani ilizwi, waphakamisela amehlo akho phezulu? Umelene loNgcwele kaIsrayeli.
Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel?
23 Ngesandla sezithunywa zakho uyeyisile iNkosi, wathi: Ngobunengi bezinqola zami ngenyuke indawo ephezulu yezintaba, inhlangothi zeLebhanoni. Ngizagamula imisedari yayo emide, lamafiri ayo akhethekileyo. Ngizangena endaweni yokuhlala yamaphethelo ayo, igusu eliminyeneyo.
I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
24 Mina ngagebha nganatha amanzi angaziwayo, langengaphansi yenyawo zami ngomisa yonke imifula yezindawo ezivinjelweyo.
Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.”
25 Kawuzwanga yini ukuthi ngakwenza endulo, ngakubumba ensukwini zendulo. Khathesi ngikufikisile, ukuthi ube ngowokudiliza imizi evikelweyo ibe zinqumbi zamanxiwa.
“‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
26 Ngakho abahlali bayo babelesandla esifitshane, besaba babe lenhloni, baba njengotshani beganga lemibhida eluhlaza, utshani bempahla, lamabele ahanguliweyo engakami.
Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
27 Kodwa ngiyakwazi ukuhlala kwakho lokuphuma kwakho lokungena kwakho lokungithukuthelela kwakho.
“‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m.
28 Ngenxa yokungithukuthelela kwakho, lokuthi umsindo wakho wenyukele endlebeni zami, ngizafaka umkhala wami emakhaleni akho, letomu lami endebeni zakho, ngikwenze ubuyele ngendlela oweza ngayo.
Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’
29 Lokhu-ke kuzakuba yisibonakaliso kuwe; lonyaka uzakudla okuzikhulelayo, langomnyaka wesibili umkhukhuzela, kuthi ngomnyaka wesithathu lihlanyele livune, lihlanyele izivini lidle izithelo zazo.
“Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
30 Lokuphephileyo kwendlu yakoJuda okuseleyo kuzaphinda kugxumeke impande phansi, kuthele izithelo ngaphezulu.
Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
31 Ngoba kuzaphuma eJerusalema insali, lokuphephileyo entabeni yeZiyoni. Ukutshiseka kweNkosi yamabandla kuzakwenza lokhu.
Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.
32 Ngakho utsho njalo uJehova ngenkosi yeAsiriya: Kayiyikungena kulumuzi, kayiyikutshoka umtshoko khona, kayiyikuza phambi kwawo ilesihlangu, kayiyikubuthelela idundulu maqondana lawo.
“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
33 Ngendlela eyeza ngayo, ngayo izabuyela, kayiyikungena kulo umuzi, itsho iNkosi.
Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
34 Ngoba ngizawuvikela lumuzi ukuwusindisa, ngenxa yami, langenxa kaDavida inceku yami.
Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’”
35 Kwasekusithi ngalobobusuku ingilosi yeNkosi yaphuma yatshaya enkambeni yamaAsiriya izinkulungwane ezilikhulu lamatshumi ayisificaminwembili lanhlanu. Lapho bevuka ekuseni kakhulu, khangela, bonke babeyizidumbu ezifileyo.
Nʼabalị ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.
36 Ngakho uSenakheribi inkosi yeAsiriya wasuka wahamba wabuyela, wahlala eNineve.
Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
37 Kwasekusithi ekhonza endlini kaNisiroki unkulunkulu wakhe, oAdrameleki loSharezeri amadodana akhe bamtshaya ngenkemba, bona baphephela elizweni leArarathi. UEsarihadoni indodana yakhe wasebusa esikhundleni sakhe.
Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

< 2 Amakhosi 19 >