< 2 Amakhosi 18 >
1 Kwasekusithi ngomnyaka wesithathu kaHosheya indodana kaEla, inkosi yakoIsrayeli, uHezekhiya indodana kaAhazi inkosi yakoJuda waba yinkosi.
Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa eze Izrel ka Hezekaya nwa Ehaz eze Juda malitere ọchịchị nke ya.
2 Wayeleminyaka engamatshumi amabili lanhlanu lapho esiba yinkosi; wabusa iminyaka engamatshumi amabili lesificamunwemunye eJerusalema. Lebizo likanina lalinguAbhi indodakazi kaZekhariya.
Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya.
3 Wasesenza okulungileyo emehlweni eNkosi njengakho konke uDavida uyise akwenzayo.
O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna nna ya Devid.
4 Yena wasusa indawo eziphakemeyo, wabhidliza insika eziyizithombe, wagamula izixuku, wachoboza inyoka yethusi uMozisi ayeyenzile, ngoba kuze kube yilezonsuku abantwana bakoIsrayeli babeyitshisela impepha; wayibiza ngokuthi nguNehushitani.
O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.)
5 Wathembela eNkosini, uNkulunkulu kaIsrayeli; okwathi emva kwakhe kakubanga khona onjengaye emakhosini wonke akoJuda, loba ayengaphambi kwakhe.
Hezekaya tụkwasịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel obi ya. Nʼezie, o nwekwaghị onye ọzọ dị ka ya nʼetiti ndị eze Juda niile, ndị bu ya ụzọ chịa, na ndị so ya.
6 Ngoba wanamathela eNkosini, kaphambukanga ekuyilandeleni, kodwa wagcina imilayo yayo iNkosi eyayilaya uMozisi.
Ọ gbasoro Onyenwe anyị nʼụzọ niile. O sitekwaghị nʼụzọ Onyenwe anyị wezuga onwe ya. O debere ihe niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
7 LeNkosi yaba laye; loba ngaphi lapho aphumela khona waphumelela. Wavukela inkosi yeAsiriya, kayisebenzelanga.
Onyenwe anyị nọnyeere ya nʼebe ọbụla ọ gara, ihe niile o mere gaara ya nke ọma. O nupuru isi jụ ịnọkwa nʼokpuru eze ndị Asịrịa, o fekwaghị ya ofufe.
8 Yena watshaya amaFilisti waze wafika eGaza lemingcele yayo, kusukela emphotshongweni wabalindi kuze kube semzini obiyelweyo.
O tigburu ndị Filistia nʼala ha niile ruo na Gaza, na obodo dị ya gburugburu. Ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, obodo ukwu niile e wusiri ike na obodo nta niile a na-ewusighị ike.
9 Kwasekusithi ngomnyaka wesine wenkosi uHezekhiya, owawungumnyaka wesikhombisa kaHosheya indodana kaEla, inkosi yakoIsrayeli, uShalimaneseri inkosi yeAsiriya wenyuka wamelana leSamariya, wayivimbezela.
Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Hezekaya, nke bụkwa afọ nke asaa nke ọchịchị Hoshea nwa Elaa, bụ eze Izrel, Shalmanesa, eze Asịrịa gbagoro imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu.
10 Basebeyithumba ekupheleni kweminyaka emithathu. Ngomnyaka wesithupha kaHezekhiya, owawungumnyaka wesificamunwemunye kaHosheya inkosi yakoIsrayeli, iSamariya yathunjwa.
Mgbe afọ atọ gasịrị, nʼafọ nke isii nke ọchịchị Hezekaya, na afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshea, bụ eze Izrel, ndị agha Asịrịa dọtara Sameria nʼagha.
11 Inkosi yeAsiriya yathumbela uIsrayeli eAsiriya, yababeka eHala leHabori umfula weGozani, lemizini yamaMede.
Ọ bụ nʼoge ahụ ka eze Asịrịa bupụrụ ndị Izrel niile bulaa ha Asịrịa nʼime obodo Hala, na Gozan nʼakụkụ iyi ukwu Hoboa, na nʼobodo ndị Midia.
12 Ngoba bengalilalelanga ilizwi leNkosi uNkulunkulu wabo, kodwa baseqa isivumelwano sayo, konke uMozisi inceku yeNkosi eyayikulayile; kabalalelanga, kabenzanga.
Nke a mere nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke ha, jụkwa ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ha edebeghị ọgbụgba ndụ ya na iwu niile Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha. Ha jụrụ ige ntị nʼiwu ndị a, maọbụ debe ha.
13 Langomnyaka wetshumi lane wenkosi uHezekhiya, uSenakheribi inkosi yeAsiriya wenyuka wamelana layo yonke imizi yakoJuda ebiyelweyo, wayithumba.
Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, merikwaa ha.
14 UHezekhiya inkosi yakoJuda wasethumela enkosini yeAsiriya eLakishi esithi: Ngonile; buyela usuke kimi; okubeka phezu kwami ngizakuthwala. Inkosi yeAsiriya yasibeka phezu kukaHezekhiya inkosi yakoJuda amathalenta esiliva angamakhulu amathathu, lamathalenta angamatshumi amathathu egolide.
Mgbe ahụ, Hezekaya chọrọ ụzọ ọ ga-esi mee udo, zie ozi zigara eze Asịrịa nʼobodo Lakish sị ya, “Emehiela m, biko, site nʼala m pụọ. Aga m akwụ gị ihe ọbụla ị chọrọ nʼaka m.” Eze Asịrịa sitere nʼaka Hezekaya eze Juda nara narị talenti ọlaọcha atọ, na iri talenti ọlaedo atọ.
15 UHezekhiya wasemnika sonke isiliva esatholakala endlini kaJehova lenothweni yendlu yenkosi.
Hezekaya chịịrị ọlaọcha niile ọ chọtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na akụ niile dị nʼụlọeze, nye ya eze Asịrịa.
16 Ngalesosikhathi uHezekhiya waquma igolide ezivalweni zethempeli leNkosi, lemigubazini uHezekhiya inkosi yakoJuda ayekunamathisele, walinika inkosi yeAsiriya.
Nʼoge ahụ, Hezekaya bụ eze Juda, nyakapụtachara ọlaedo niile o ji techie ibo na ibo ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, chịrị ihe ndị a niile nye eze Asịrịa.
17 Inkosi yeAsiriya yasithuma uTharithani loRabi-Sarisi loRabi-Shake besuka eLakishi besiya enkosini uHezekhiya belebutho elinzima eJerusalema. Benyuka-ke bafika eJerusalema. Sebenyuke bafika bema emgelweni wechibi eliphezulu, elisemgwaqweni omkhulu wensimu yomwatshi.
Eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha onye ọkwa ya kasị ukwuu, onyeisi ndị na-eje ozi na ọchịagha ya na usuu ndị agha ka ha jekwuru Hezekaya na Jerusalem. Ndị agha a bịaruru Jerusalem kwụsị nʼakụkụ olulu warawara e gwuru ebe Ọdọ mmiri dị elu si nʼasọfe, nʼụzọ e si aga obosara ala ndị na-asụ akwa.
18 Sebebize inkosi, kwaphumela kibo uEliyakhimi indodana kaHilikhiya owayengumphathi wendlu, loShebina umbhali, loJowa indodana kaAsafi umabhalane.
Mgbe ha kpọrọ eze oku ka ọ bịa, Eliakịm nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ha.
19 URabi-Shake wasesithi kibo: Khulumani khathesi kuHezekhiya: Itsho njalo inkosi enkulu, inkosi yeAsiriya ithi: Yisibindi bani lesi, othembela kuso?
Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?
20 Uthi, kodwa yilizwi lendebe nje: Kulecebo lamandla empi. Usuthembe bani ukuthi ungivukele?
Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi mere i ji enupu isi nʼokpuru m?
21 Khangela-ke, wena uthembele odondolweni lomhlanga owephukileyo, oluyiGibhithe, uba umuntu eseyama phezu kwalo, luzangena esandleni sakhe lusihlabe. Unjalo uFaro inkosi yeGibhithe kubo bonke abathembela kuye.
Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi.
22 Kodwa uba lisithi kimi: ENkosini uNkulunkulu wethu siyathemba; angithi yiyo elezindawo zayo eziphakemeyo lamalathi ayo uHezekhiya awasusileyo, wathi kuJuda leJerusalema: Phambi kwalelilathi lizakhonza eJerusalema?
Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja dị nʼime Jerusalem?”
23 Ngakho-ke, akunike isibambiso enkosini yami, inkosi yeAsiriya, njalo ngizakunika amabhiza azinkulungwane ezimbili, uba wena ulakho ukunika abagadi bawo.
“‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.
24 Pho, uzabuyisela emuva njani ubuso benduna eyodwa yabancinyane nje benceku zenkosi yami; wena-ke uthembele eGibhithe ngezinqola labagadi bamabhiza?
Ị ga-esi aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya?
25 Kambe ngenyukile yini ukumelana lalindawo ngingelaJehova ukuyichitha? UJehova uthe kimi: Yenyuka umelane lalelilizwe, ulichithe.
Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma enweghị okwu sitere na Chineke bịa? Ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’”
26 UEliyakhimi indodana kaHilikhiya loShebina loJowa basebesithi kuRabi-Shake: Akukhulume lenceku zakho ngesiSiriya, ngoba siyasizwa; ungakhulumi lathi ngesiJuda endlebeni zabantu abasemdulini.
Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.”
27 Kodwa uRabi-Shake wathi kubo: Inkosi yami ingithumile yini enkosini yakho lakuwe ukukhuluma lamazwi? Kakusebantwini yini abahlezi phezu komduli ukuze badle ubulongwe babo, banathe umchamo wabo kanye lani?
Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”
28 URabi-Shake wasesima wamemeza ngelizwi elikhulu ngesiJuda, wakhuluma esithi: Zwanini ilizwi lenkosi enkulu, inkosi yeAsiriya.
Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.
29 Itsho njalo inkosi: UHezekhiya kangalikhohlisi, ngoba kayikuba lakho ukulikhulula esandleni sayo.
Nke a bụ ihe eze sịrị, unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu site nʼaka m.
30 Njalo uHezekhiya angalenzi lithembele eNkosini esithi: INkosi izasikhulula lokusikhulula, lalumuzi kawuyikunikelwa esandleni senkosi yeAsiriya.
Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi. Mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị, a gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
31 Lingamlaleli uHezekhiya, ngoba itsho njalo inkosi yeAsiriya: Yenzani isivumelwano sokuthula lami, liphume lize kimi; dlanini-ke, ngulowo lalowo okwevini lakhe langulowo lalowo okomkhiwa wakhe, linathe, ngulowo lalowo amanzi omthombo wakhe;
“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:
32 ngize ngifike ngilithathe ngilise elizweni elifanana lelizwe lakini, ilizwe lamabele lewayini elitsha, ilizwe lesinkwa lezivini, ilizwe lamafutha emihlwathi loluju, ukuze liphile lingafi. Lingamlaleli uHezekhiya ngoba eliyenga esithi: INkosi izasikhulula.
ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị, ala mmanụ aṅụ na osisi oliv jupụtara nʼime ya. Họrọnụ ndụ ka unu ghara ịnwụ. “Unu egela Hezekaya ntị, nʼihi na ọ bụ nrafu ka ọ na-arafu unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’
33 Onkulunkulu bezizwe sebake bawakhulula yini ngulowo lalowo ilizwe lakhe esandleni senkosi yeAsiriya?
O nwere chi mba ọbụla nke napụtara ha site nʼaka eze Asịrịa?
34 Bangaphi onkulunkulu beHamathi leArpadi? Bangaphi onkulunkulu beSefavayimi, beHena, leIva? Kambe bayikhulule yini iSamariya esandleni sami?
Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim, Hena na Iva nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?
35 Ngobani kubo bonke onkulunkulu balawomazwe abakhulule ilizwe labo esandleni sami, ukuthi iNkosi ikhulule iJerusalema esandleni sami?
Olee chi nʼime chi mba ndị a niile bụ nke zọpụtarala ala ya site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”
36 Kodwa abantu bathula, kabaze bamphendula lalizwi, ngoba umlayo wenkosi wawuyikuthi: Lingamphenduli.
Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”
37 UEliyakhimi indodana kaHilikhiya owayengumphathi wendlu, loShebina umbhali, loJowa indodana kaAsafi umabhalane, basebesiza kuHezekhiya izigqoko zidatshuliwe, bamtshela amazwi kaRabi-Shake.
Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, onye na-elekọta ụlọeze, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf ode akwụkwọ, ha yi uwe ha dọwara adọwa, bịakwute Hezekaya gwa ya ihe niile onyeisi agha ahụ kwuru.