< 2 Imilando 26 >
1 Bonke abantu bakoJuda basebethatha uUziya owayeleminyaka elitshumi lesithupha, bambeka waba yinkosi esikhundleni sikayise uAmaziya.
Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii.
2 Yena wakha iElothi, wayibuyisela koJuda emva kokulala kwenkosi laboyise.
Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ.
3 U-Uziya wayeleminyaka elitshumi lesithupha lapho esiba yinkosi; wabusa iminyaka engamatshumi amahlanu lambili eJerusalema. Lebizo likanina lalinguJekoliya weJerusalema.
Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem.
4 Wasesenza okuqondileyo emehlweni eNkosi njengakho konke uAmaziya uyise ayekwenzile.
O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
5 Njalo wayemdinga uNkulunkulu ensukwini zikaZekhariya owayelokuqedisisa emibonweni kaNkulunkulu; langezinsuku zokudinga kwakhe iNkosi, uNkulunkulu wamphumelelisa.
Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu.
6 Wasephuma walwa lamaFilisti, wadilizela phansi umduli weGathi lomduli weJabine lomduli weAshidodi, wakha imizi eAshidodi laphakathi kwamaFilisti.
O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia.
7 UNkulunkulu wasemsiza ukumelana lamaFilisti, lokumelana lamaArabhiya ayehlala eGuri-Bhali, lamaMewuni.
Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim.
8 AmaAmoni asesipha umthelo kuUziya, lebizo lakhe lahamba laze lafika engenelweni leGibhithe, ngoba waziqinisa waze waba sengqongeni.
Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu.
9 Futhi uUziya wakha imiphotshongo eJerusalema esangweni lengonsi lesangweni lesigodi lengonsini, wayiqinisa.
O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike.
10 Wakha lemiphotshongo enkangala, wagebha imithombo eminengi, ngoba wayelenkomo ezinengi esihotsheni kanye lemagcekeni, abalimi lezisebenzi zezivini ezintabeni leKharmeli, ngoba wayengothanda umhlabathi.
O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.
11 Futhi uUziya wayelebutho elilwayo eliphuma impi ngamaviyo ngokwenani lokubalwa kwabo ngesandla sikaJeyiyeli umabhalane loMahaseya umbusi phansi kwesandla sikaHananiya, omunye wezinduna zenkosi.
Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha.
12 Inani lonke lezinhloko zaboyise lamaqhawe alamandla lalizinkulungwane ezimbili lamakhulu ayisithupha.
Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600.
13 Laphansi kwesandla sazo kwakulamandla ebutho elizinkulungwane ezingamakhulu amathathu lesikhombisa lamakhulu amahlanu elalisilwa ngamandla obuqhawe ukusiza inkosi limelene lesitha.
Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya.
14 U-Uziya wasebalungisela, ibutho lonke, izihlangu lemikhonto lamakhowa lamabhatshi ensimbi lamadandili lamatshe ezavutha.
Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ.
15 EJerusalema wasesenza imitshina, eyaqanjwa ngohlakaniphileyo, ukuthi ibe phezu kwemiphotshongo laphezu kwezingonsi ukuphosa ngemitshoko langamatshe amakhulu. Lebizo lakhe laphuma laze laba khatshana, ngoba wasizwa ngokumangalisayo waze waqina.
O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike.
16 Kodwa eseqinile, inhliziyo yakhe yaziphakamisela encithakalweni. Ngoba waphambuka eNkosini uNkulunkulu wakhe, wasengena ethempelini leNkosi ukuze atshise impepha phezu kwelathi lempepha.
Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja.
17 UAzariya umpristi wasengena emva kwakhe elabapristi beNkosi abangamatshumi ayisificaminwembili, amadoda alamandla.
Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja Onyenwe anyị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ.
18 Basebemelana loUziya inkosi, bathi kuye: Kakusikho okwakho, Uziya, ukutshisela iNkosi impepha, kodwa ngokwabapristi, amadodana kaAroni abehlukaniselwe ukutshisa impepha. Phuma endaweni engcwele, ngoba uphambukile; njalo kakusikho kodumo lwakho oluvela eNkosini uNkulunkulu.
Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.”
19 Wasethukuthela uUziya, njalo kwakulodengezi esandleni sakhe ukuze atshise impepha; esebathukuthelele abapristi, kwabonakala ubulephero ebunzini lakhe phambi kwabapristi endlini yeNkosi, ngaphezu kwelathi lempepha.
Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu.
20 UAzariya umpristi oyinhloko labo bonke abapristi basebemkhangela, khangela-ke, wayelobulephero ebunzini lakhe; basebemkhupha lapho masinyane, yebo laye uqobo waphangisa ukuphuma, ngoba iNkosi yayimtshayile.
Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.
21 U-Uziya inkosi waba ngumlephero kwaze kwaba lusuku lokufa kwakhe; wahlala endlini eyehlukanisiweyo engumlephero, ngoba waqunywa wasuka endlini kaJehova. Njalo uJothamu indodana yakhe wayephezu kwendlu yenkosi, esahlulela abantu belizwe.
Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.
22 Ezinye-ke zezindaba zikaUziya, ezokuqala lezokucina, uIsaya umprofethi, indodana kaAmozi, wazibhala.
Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ.
23 U-Uziya waselala laboyise; basebemngcwaba kuboyise ensimini yokungcwaba eyayingeyamakhosi, ngoba bathi: Ungumlephero. UJothamu indodana yakhe wasesiba yinkosi esikhundleni sakhe.
Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.