< 2 Imilando 20 >

1 Kwasekusithi emva kwalokho abantwana bakoMowabi labantwana bakoAmoni belabanye ngaphandle kwamaAmoni beza bamelana loJehoshafathi empini.
Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha.
2 Kwasekusiza abanye babikela uJehoshafathi besithi: Kuyeza ixuku elikhulu ukumelana lawe elivela phetsheya kolwandle, eSiriya; khangela-ke, liseHazazoni-Tamari, eyiEngedi.
Ụfọdụ ndị mmadụ bịara gwa Jehoshafat sị, “Lee, igwe usuu ndị agha na-abịa imegide gị site nʼEdọm, nakwa nʼofe osimiri Nnu (osimiri nwụrụ anwụ). Ha erutela Hazezọn Tama, ebe a na-akpọkwa En-Gedi.”
3 UJehoshafathi wasesesaba, wamisa ubuso bakhe ukudinga iNkosi, wamemezela ukuzila ukudla kuye wonke uJuda.
Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
4 UJuda wasezibuthanisa ukudinga eNkosini; lasemizini yonke yakoJuda baphuma beza ukudinga iNkosi.
Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka Onyenwe anyị; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu Onyenwe anyị.
5 UJehoshafathi wasesima ebandleni lakoJuda leJerusalema endlini yeNkosi phambi kweguma elitsha.
Mgbe ahụ, Jehoshafat guzoro nʼetiti nzukọ ndị Juda na Jerusalem nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ogige ọhụrụ ahụ,
6 Wasesithi: Nkosi, Nkulunkulu wabobaba, wena kawusuye yini uNkulunkulu emazulwini? Yebo, kawubusi yini kuyo yonke imibuso yezizwe? Lesandleni sakho kukhona amandla lengalo, ukuze kungabi khona ongamelana lawe.
sị; “O Onyenwe anyị, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị.
7 KawusiNkulunkulu wethu yini? Uxotshile abahlali balelilizwe elifeni phambi kwabantu bakho uIsrayeli, walinika inzalo kaAbrahama umngane wakho kuze kube phakade.
O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke?
8 Basebehlala kilo, bakwakhela indawo engcwele kulo eyebizo lakho, besithi:
Ha ebiela nʼime ya wukwaa ebe nsọ nʼime nye nʼAha gị na-asị,
9 Uba kusehlela phezu kwethu ububi, inkemba, isahlulelo, loba umatshayabhuqe wesifo, loba indlala, sizakuma phambi kwalindlu laphambi kwakho (ngoba ibizo lakho likulindlu), sikhale kuwe ekubandezelekeni kwethu, uzakuzwa-ke usindise.
‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’
10 Ngakho-ke, khangela, abantwana bakoAmoni labakoMowabi labentabeni iSeyiri ongavumanga ukuthi uIsrayeli adlule phakathi kwabo lapho besuka elizweni leGibhithe, kodwa babafulathela kabababhubhisanga;
“Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.
11 khangela-ke, basivuza beza ukuzasixotsha elifeni lakho owenze ukuthi silidle.
Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.
12 Nkulunkulu wethu, kawuyikubahlulela yini? Ngoba amandla kawakho kithi okumelana lalelixuku elikhulu elize ukumelana lathi; njalo thina kasikwazi esingakwenza, kodwa amehlo ethu akuwe.
O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.”
13 UJuda wonke wasesima phambi kweNkosi, lensane zabo, omkabo labantwana babo.
Ndị ikom Juda niile, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụmụntakịrị ha guzoro nʼihu Onyenwe anyị.
14 Khona uJahaziyeli indodana kaZekhariya indodana kaBhenaya indodana kaJeyiyeli indodana kaMathaniya, umLevi emadodaneni kaAsafi, uMoya weNkosi wafika phezu kwakhe phakathi kwebandla.
Mgbe ahụ, mmụọ Nsọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jahaziel nwa Zekaraya, nwa Benaya, nwa Jeiel, nwa Matanaya, bụ onye Livayị, onye si nʼikwu Asaf, dịka o guzo nʼetiti mkpọkọta ahụ.
15 Wasesithi: Lalelani lonke bakoJuda labahlali beJerusalema, lawe nkosi Jehoshafathi; itsho njalo iNkosi kini: Lina lingesabi lingatshaywa luvalo ngenxa yalelixuku elikhulu, ngoba impi kayisiyo yenu, kodwa ngekaNkulunkulu.
Ọ sịrị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda niile na ndị bi na Jerusalem, na gị eze Jehoshafat. Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-asị unu. ‘Unu atụla ụjọ, maọbụ daa mba, nʼihi usuu ndị agha a niile dị unu nʼihu. Ọ bụghị unu ka agha a dịịrị, kama ọ bụ Chineke nwe ya.
16 Kusasa yehlani limelane labo; khangela, bayenyuka ngomqanso weZizi; lizabathola ekucineni kwesihotsha phambi kwenkangala yeJeruweli.
Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel.
17 Kakusikwenu ukulwa kule impi; zimiseni lime, libone usindiso lweNkosi lani, Juda leJerusalema. Lingesabi lingatshaywa luvalo; kusasa phumani limelene labo, ngoba iNkosi izakuba lani.
Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, Onyenwe anyị ga-anọnyekwara unu.’”
18 UJehoshafathi wasekhothamisa ikhanda emhlabathini, laye wonke uJuda labahlali beJerusalema bawa phambi kweNkosi, beyikhonza iNkosi.
Mgbe ahụ, Jehoshafat, na ndị Juda na ndị Jerusalem niile dara nʼala kelee Onyenwe anyị, kpọọ isiala nye ya.
19 AmaLevi kubantwana bakoKohathi lakubantwana bakoKora asesukuma ukudumisa iNkosi, uNkulunkulu kaIsrayeli, ngelizwi elikhulu eliphezulu.
Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too Onyenwe anyị Chineke Izrel nʼabụ.
20 Basebevuka ekuseni kakhulu, baphuma baya enkangala yeThekhowa; lekuphumeni kwabo uJehoshafathi wema wathi: Ngilalelani Juda labahlali beJerusalema. Kholwani eNkosini uNkulunkulu wenu, lizaqiniswa; likholwe kubaprofethi bayo, lizaphumelela.
Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.”
21 Esecebisene labantu wamisela iNkosi abahlabeleli, abazadumisa ubuhle bobungcwele, ekuphumeni phambi kwabahlomileyo, besithi: Dumisani iNkosi, ngoba umusa wayo umi kuze kube nininini.
Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ Onyenwe anyị ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”
22 Kwathi lapho beqalisa ukuhlabelela lokudumisa, iNkosi yabeka abacathameli ukumelana labantwana bakoAmoni, uMowabi, lentaba iSeyiri, ababezemelana loJuda; basebetshaywa.
Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.
23 Ngoba abantwana bakoAmoni labakoMowabi basukuma bamelana labahlali bentaba yeSeyiri ukutshabalalisa lokuchitha; njalo sebebaqedile abahlali beSeyiri, bancedisa ngulowo umakhelwane wakhe encithakalweni.
Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn.
24 UJuda esefikile enqabeni yokulinda enkangala bakhangela ngasexukwini, khangela-ke, kwakulezidumbu eziwele emhlabathini; njalo kungekho ophephileyo.
Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ.
25 UJehoshafathi labantu bakhe sebefikile ukuphanga impango bathola phakathi kwabo ngobunengi, impahla lazo, lezidumbu, lezinto eziligugu, baziphangela baze behluleka ukuzithwala. Njalo baba lensuku ezintathu bephanga impango ngoba yayinengi.
Ya mere Jehoshafat na ndị agha ya banyere nʼọgbọ agha ahụ kwakọrọ ihe nkwata nʼagha. Ha butere ọtụtụ ngwa agha, na uwe na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa ma ha enweghị ike ibutecha ihe niile. Ihe nkwata nʼagha hiri nne ruo na o were ha ụbọchị atọ ibutecha ha.
26 Njalo ngosuku lwesine babuthana esihotsheni seBeraka, ngoba lapho bayibusisa iNkosi; ngenxa yalokho babiza ibizo laleyondawo ngokuthi yisihotsha seBeraka kuze kube lamuhla.
Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.
27 Basebebuyela, wonke umuntu wakoJuda leJerusalema, loJehoshafathi enhlokweni yabo, ukuthi babuyele eJerusalema belentokozo, ngoba iNkosi yabathokozisa phezu kwezitha zabo.
Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.
28 Basebengena eJerusalema belezigubhu zezintambo lamachacho lezimpondo, baya endlini yeNkosi.
Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
29 Uvalo ngoNkulunkulu lwaselusiba phezu kwayo yonke imibuso yamazwe lapho besizwa ukuthi iNkosi yalwa lezitha zikaIsrayeli.
Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu Onyenwe anyị si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile.
30 Ngakho umbuso kaJehoshafathi waba lokuthula, ngoba uNkulunkulu wakhe wamphumuza inhlangothi zonke.
Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo.
31 UJehoshafathi wabusa-ke phezu kukaJuda; wayeleminyaka engamatshumi amathathu lanhlanu lapho esiba yinkosi, wabusa iminyaka engamatshumi amabili lanhlanu eJerusalema. Lebizo likanina lalinguAzuba indodakazi kaShilehi.
Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.
32 Wasehamba ngendlela kayise uAsa, kaphambukanga kuyo, esenza okulungileyo emehlweni eNkosi.
O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
33 Lanxa kunjalo indawo eziphakemeyo kazisuswanga; ngoba abantu babelokhu bengalungisanga inhliziyo yabo kuNkulunkulu waboyise.
Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ ka nọ na-ejighị obi ha niile tụkwasị na Chineke nke nna nna ha.
34 Ezinye-ke zezindaba zikaJehoshafathi, ezokuqala lezokucina, khangela, zibhaliwe ezindabeni zikaJehu indodana kaHanani ezagoqelwa egwalweni lwamakhosi akoIsrayeli.
Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.
35 Lemva kwalokho uJehoshafathi inkosi yakoJuda wazihlanganisa loAhaziya inkosi yakoIsrayeli owenza ngenkohlakalo ekwenzeni.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jehoshafat, bụ eze Juda jikọrọ onwe ha na Ahazaya, eze Izrel, onye ahụ omume ya jọrọ njọ.
36 Wasezihlanganisa laye ukwenza imikhumbi yokuya eTarshishi; basebeyenza imikhumbi eEziyoni-Geberi.
Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba.
37 UEliyezeri indodana kaDodavahu weMaresha waseprofetha emelene loJehoshafathi esithi: Ngoba uzihlanganise loAhaziya, iNkosi yephulile imisebenzi yakho. Ngakho imikhumbi yephuka, ayaze yenelisa ukuya eTarshishi.
Elieza nwa Dodavahu, onye Maresha buru amụma megide Jehoshafat, na-asị, “Nʼihi na i kwenyere ka gị na Ahazaya na-azụkọ ahịa, Onyenwe anyị ga-emebi ihe ndị a ị rụrụ.” Ụgbọ mmiri ahụ niile kpuru, ha enwekwaghị ike ijeru Tashish zụọ ahịa.

< 2 Imilando 20 >