< 1 USamuyeli 13 >

1 USawuli wayelomnyaka embusweni wakhe. Esebuse uIsrayeli okweminyaka emibili,
Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala Izrel iri afọ anọ na abụọ.
2 uSawuli wasezikhethela abayizinkulungwane ezintathu kwamaIsrayeli; njalo abayizinkulungwane ezimbili babeloSawuli eMikimashi lentabeni yeBhetheli, lenkulungwane yaba loJonathani eGibeya yakoBhenjamini; labaseleyo babantu wabayekela bahamba, ngulowo lalowo ethenteni lakhe.
Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.
3 UJonathani wasetshaya ibutho lenqaba yamaFilisti eyayiseGeba, lamaFilisti akuzwa. USawuli wasevuthela uphondo elizweni lonke esithi: AmaHebheru kawezwe.
Ma Jonatan busoro ndị agha Filistia nọ na Geba agha. Ndị Filistia nụkwara ihe banyere ya. Mgbe ahụ, Sọl nyere iwu ka e gbuo opi ike nʼala Izrel niile, kwuo sị, “Unu ndị Hibru niile, geenụ ntị.”
4 UIsrayeli wonke wezwa kuthiwa uSawuli utshayile ibutho lenqaba yamaFilisti lokuthi uIsrayeli laye waba levumba kumaFilisti. Abantu basebebizelwa ndawonye ukulandela uSawuli baye eGiligali.
Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal.
5 AmaFilisti asebuthana ukuthi alwe loIsrayeli, inqola eziyizinkulungwane ezingamatshumi amathathu, labagadi bamabhiza abayizinkulungwane eziyisithupha, labantu abalingana letshebetshebe elisekhunjini lolwandle ngobunengi; enyuka amisa inkamba eMikimashi, empumalanga kweBeti-Aveni.
Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven.
6 Kwathi amadoda akoIsrayeli ebona ukuthi asekuminyezelweni, ngoba abantu bacindezelwa, abantu bacatsha embalwini lezixukwini zameva, lemadwaleni, lezinqabeni, lemigodini.
Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.
7 LamaHebheru achapha iJordani, aya elizweni leGadi leGileyadi. Kodwa uSawuli wayelokhu eseGiligali, labantu bonke bathuthumela bemlandela.
Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.
8 Waselinda insuku eziyisikhombisa, njengesikhathi esamiswa nguSamuweli; kodwa uSamuweli kafikanga eGiligali, labantu bahlakazeka besuka kuye.
Samuel gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru Samuel abịaghị Gilgal. Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị.
9 USawuli wasesithi: Sondezani kimi umnikelo wokutshiswa leminikelo yokuthula. Wasenikela umnikelo wokutshiswa.
Ya mere, Sọl kwuru sị, “Wetaranụ m ihe aja nsure ọkụ na nke aja udo.” Sọl chụkwara aja nsure ọkụ ahụ.
10 Kwasekusithi eseqede ukunikela umnikelo wokutshiswa, khangela, uSamuweli wafika; uSawuli wasephuma ukumhlangabeza ukuze ambingelele.
Ngwangwa ọ na-achụcha aja ndị ahụ, Samuel rutere, Sọl pụrụ izute ya, na ikele ya.
11 USamuweli wasesithi: Wenzeni? USawuli wasesithi: Ngoba ngibone ukuthi abantu babehlakazeka besuka kimi, lawe ungafikanga ngesikhathi esimisiweyo sezinsuku, lokuthi amaFilisti asebuthene eMikimashi.
Samuel sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Sọl zara, “Mgbe m hụrụ na ndị a na-agba aghara aghara, na-esite nʼebe m nọ na-agbapụ, mgbe m lere anya lee, ma ahụghị m ka ị na-abịa dịka i kwuru, mgbe m hụkwara ndị Filistia ka ha nọ na Mikmash, na-akwado ibuso anyị agha,
12 Ngakho ngathi: Khathesi amaFilisti azangehlela eGiligali, ngingancenganga ubuso beNkosi. Ngasengizibamba ngamandla, nganikela umnikelo wokutshiswa.
echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma Onyenwe anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.”
13 USamuweli wasesithi kuSawuli: Wenze ngobuwula; kawuwugcinanga umlayo weNkosi uNkulunkulu wakho eyakulaya wona; ngoba khathesi iNkosi ibizawumisa umbuso wakho koIsrayeli kuze kube nininini.
Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile.
14 Kodwa khathesi umbuso wakho kawuyikuma. INkosi isizidingele umuntu ngokwenhliziyo yayo, njalo iNkosi isimlayile ukuthi abe ngumbusi phezu kwabantu bayo, ngoba kawugcinanga lokho iNkosi ekulaye khona.
Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.”
15 USamuweli wasesukuma wenyuka esuka eGiligali waya eGibeya yakoBhenjamini. USawuli wasebala abantu abaficwa belaye, phose abangamakhulu ayisithupha.
Samuel biliri hapụ Gilgal gaa Gibea nʼala Benjamin. Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii.
16 Njalo uSawuli loJonathani indodana yakhe labantu abaficwa belabo bahlala eGibeya yakoBhenjamini, kodwa amaFilisti amisa inkamba eMikimashi.
Sọl na nwa ya nwoke Jonatan, na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na Geba nʼala Benjamin, ebe ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Mikmash.
17 Abachithi basebephuma enkambeni yamaFilisti ngezigaba ezintathu; esinye isigaba saphendukela endleleni yeOfira, saya elizweni leShuwali;
Ụfọdụ nʼime ndị agha Filistia kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị Filistia pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ Ofra nʼakụkụ Shual,
18 lesinye isigaba saphendukela endleleni yeBhethi-Horoni; lesinye isigaba saphendukela endleleni yomngcele okhangele esihotsheni seZeboyimi ngasenkangala.
nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso.
19 Njalo kwakungatholakali mkhandi elizweni lonke lakoIsrayeli, ngoba amaFilisti athi: Hlezi amaHebheru enze izinkemba loba imikhonto.
Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.”
20 UIsrayeli wonke-ke wehlela kumaFilisti ukulola, ngulowo lalowo isikali sakhe sekhuba, lemataka yakhe, lehloka lakhe, lesikela yakhe.
Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi.
21 Imbadalo yezikali zekhuba lamamataka lamafologwe alencijo ezintathu lamahloka lokulungisa izincijo yayiyipimi.
Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ.
22 Ngakho kwathi ngosuku lwempi kakutholakalanga inkemba loba umkhonto esandleni saloba ngubani wabantu ababeloSawuli lababeloJonathani; kodwa kwatholakala kuSawuli loJonathani indodana yakhe.
Nke mere na ahụtaghị mma agha maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan.
23 Lebutho lenqaba yamaFilisti laphuma laya emkhandlweni weMikimashi.
Ugbu a ndị Filistia e kewapụtara iche a pụọla gaa nʼụzọ warawara dị na Mikmash.

< 1 USamuyeli 13 >