< 1 USamuyeli 12 >

1 USamuweli wasesithi kuIsrayeli wonke: Khangelani, ngililalele ilizwi lenu kukho konke elakutsho kimi, sengibeke inkosi phezu kwenu.
Mgbe ahụ, Samuel gwara ụmụ Izrel sị, “Lee, emeelara m unu ihe unu rịọrọ, Enyela m unu eze.
2 Khathesi-ke, khangelani, inkosi iyahamba phambi kwenu; mina sengimdala, sengiyimpunga, khangelani, lamadodana ami akini; mina-ke ngihambile phambi kwenu kusukela ebutsheni bami kuze kube lamuhla.
Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa.
3 Khangelani, ngilapha; fakazani limelane lami phambi kweNkosi laphambi kogcotshiweyo wayo: Ngithethe inkabi kabani? Loba ngithethe ubabhemi kabani? Ngiqilibezele bani? Ngicindezele bani? Ngemukele kubani isivalamlomo ukuze ngiphofuze amehlo ami ngawo? Njalo ngizakubuyisela kini.
Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.”
4 Basebesithi: Kawusiqilibezelanga, kawusicindezelanga, njalo kawemukelanga lalutho esandleni samuntu.
Ha zara sị, “Mba ọ dịbeghị mgbe ị ghọgburu anyị, maọbụ kpagbuo anyị, nʼụzọ ọbụla. O nweghịkwa onye i si nʼaka ya were ihe ọbụla.”
5 Wasesithi kibo: INkosi ingumfakazi imelene lani logcotshiweyo wayo ungumfakazi lamuhla ukuthi kalitholanga lutho esandleni sami. Bathi: Ingumfazaki.
Samuel zara sị ha, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe megide unu. Otu a kwa, onye ya o tere mmanụ bụ onye akaebe taa, na unu achọtaghị ihe ọbụla nʼaka m.” Ha zara sị, “E, ọ bụ onye akaebe!”
6 USamuweli wasesithi ebantwini: KuyiNkosi eyenza uMozisi loAroni, eyenyusa oyihlo elizweni leGibhithe.
Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta.
7 Khathesi-ke, manini njalo ngahlulelane lani phambi kweNkosi ngezenzo zonke ezilungileyo zeNkosi eyazenza kini lakuboyihlo.
Ugbu a, guzonụ jụ nʼebe a nʼihu Onyenwe anyị ka m chetara unu ihe ọma niile Onyenwe anyị meere unu na nna nna unu ha.
8 Lapho uJakobe esefikile eGibhithe, oyihlo bakhala eNkosini, iNkosi yasithuma oMozisi loAroni, abakhupha oyihlo eGibhithe, babenza bahlala kulindawo.
“Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a.
9 Sebeyikhohliwe iNkosi uNkulunkulu wabo, yabathengisa esandleni sikaSisera induna yebutho leHazori, lesandleni samaFilisti, lesandleni senkosi yakoMowabi; basebesilwa bemelene labo.
“Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ.
10 Basebekhala eNkosini bathi: Sonile, ngoba siyilahlile iNkosi, sakhonza oBhali laboAshitarothi. Kodwa khathesi sophule esandleni sezitha zethu, sizakukhonza.
Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtalaOnyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’
11 INkosi yasithuma uJerubali, loBhedani, loJefitha, loSamuweli, yalikhulula esandleni sezitha zenu inhlangothi zonke, laselihlala livikelekile.
Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak, na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo.
12 Lapho libona ukuthi uNahashi inkosi yabantwana bakoAmoni yeza ukumelana lani, lathi kimi: Hatshi, kodwa inkosi izasibusa; kanti iNkosi uNkulunkulu wenu yayiyinkosi yenu.
“Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.
13 Khathesi-ke, khangelani, inkosi elayikhethayo, elayicelayo; khangelani-ke, iNkosi imisile inkosi phezu kwenu.
Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ Onyenwe anyị ka o nye unu ya; Onyenwe anyị azakwala arịrịọ unu.
14 Uba liyesaba iNkosi liyikhonza lilalela ilizwi layo, lingawuvukeli umlomo weNkosi, khona lina, lani kanye lenkosi ezabusa phezu kwenu lizalandela iNkosi uNkulunkulu wenu.
Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-atụ egwu Onyenwe anyị, fee ya, rubere ya isi, hapụ inupu isi nʼebe iwu ya dị, ọ bụrụkwa na unu na eze unu ga-esogide Onyenwe anyị Chineke unu, ihe niile ga-adị mma.
15 Kodwa uba lingalilaleli ilizwi leNkosi, kodwa livukela umlomo weNkosi, isandla seNkosi sizamelana lani, njengoba samelana laboyihlo.
Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha.
16 Lakhathesi manini, libone linto enkulu iNkosi ezayenza phambi kwamehlo enu.
“Ugbu a, na-elenụ anya ka unu hụ ọrụ ịtụnanya niile Onyenwe anyị na-aga ịrụ.
17 Angithi lamuhla kuyisivuno sengqoloyi? Ngizakhala eNkosini njalo izanika umdumo lezulu, ukuze lazi libone ukuthi ububi benu bukhulu elibenze emehlweni eNkosi ngokuzicelela inkosi.
Unu maara na ugbu a bụ oge a na-aghọ mkpụrụ ọka wiiti, ma aga m ekpe ekpere ka Onyenwe anyị zite egbe eluigwe na mmiri ozuzo taa, ka unu ghọta ụdị ihe ọjọọ unu mere nʼanya Onyenwe anyị mgbe unu rịọrọ ya sị ya nye unu eze.”
18 USamuweli wasekhala eNkosini, iNkosi yasinika umdumo lezulu mhlalokho; ngakho bonke abantu bayesaba kakhulu iNkosi loSamuweli.
Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.
19 Bonke abantu basebesithi kuSamuweli: Khulekela izinceku zakho eNkosini uNkulunkulu wakho, ukuze singafi; ngoba sengezelele ezonweni zethu zonke lobububi bokuzicelela inkosi.
Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.”
20 USamuweli wasesithi ebantwini: Lingesabi; lina lenze bonke lobububi, kodwa lingaphambuki ekuyilandeleni iNkosi, kodwa likhonze iNkosi ngenhliziyo yenu yonke.
Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla.
21 Njalo lingaphambuki ngoba lingalandela izinto eziyize ezingasizi lutho ezingakhululiyo, ngoba ziyize.
Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
22 Ngoba iNkosi kayiyikubatshiya abantu bayo ngenxa yebizo layo elikhulu, ngoba iNkosi yathokoza ukulenza libe ngabantu bayo.
Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.
23 Mina-ke kakube khatshana lami ukuthi ngone eNkosini ngokuyekela ukulikhulekela; kodwa ngizalifundisa indlela enhle lelungileyo.
Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide Onyenwe anyị site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi.
24 Kuphela yesabani iNkosi, liyikhonze ngeqiniso ngenhliziyo yenu yonke, ngoba bonani okukhulu elenzele khona.
Naanị tụọnụ egwu Onyenwe anyị, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu.
25 Kodwa uba liphikelela lisenza okubi, lina kanye lenkosi yenu lizachithwa.
Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eme ihe ọjọọ, unu na eze unu ka a ga-ekpochapụ.”

< 1 USamuyeli 12 >