< 1 KwabaseKhorinte 3 >
1 Lami-ke, bazalwane, bengingelakukhuluma lani njengabakomoya, kodwa njengakwabakwenyama, njengakwabayizingane kuKristu.
Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dịka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nʼime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dịka ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị bụ ụmụntakịrị nʼime Kraịst.
2 Ngalinathisa uchago, kungeyisikho ukudla okuqinileyo; ngoba belingakenelisi, yebo lakhathesi kalikenelisi;
Ejighị m nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nʼihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nʼezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike.
3 ngoba lisengabenyama; ngoba lokhu kukhona phakathi kwenu umhawu lokuphikisana lokwehlukana, kalisibo abenyama, lihamba ngokwabantu yini?
Nʼihi na unu na-adị ndụ dịka ndị bi nʼụwa, ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nʼetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dịka ndị ụwa, dịka ndị mmadụ efu nọ nʼụwa.
4 Ngoba nxa omunye esithi: Mina ngingokaPawuli, lomunye athi: Mina okaApolosi, kalisibo yini abenyama?
Nʼihi na mgbe otu onye na-asị, “Abụ m nke Pọl,” onye ọzọ na-asịkwa, “Abụ m nke Apọlọs,” o gosighị na unu na-akpa agwa dịka ndị bi nʼụwa?
5 Kanti uPawuli uyini, loApolosi uyini, kodwa izisebenzi elakholwa ngazo, lanjengoba iNkosi yanika kulowo lalowo?
Onye bụ Apọlọs? Onye bụ Pọl? Ọ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu oziọma unu kweere nʼime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dịka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ.
6 Mina ngahlanyela, uApolosi wathelela, kodwa uNkulunkulu wakhulisa.
Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ ahụ, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, maọbụ Chineke mere ka o too.
7 Ngakho ohlanyelayo kasilutho, loba othelelayo, kodwa uNkulunkulu okhulisayo.
Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa.
8 Ohlanyelayo kanye lothelelayo banye; kodwa ngulowo lalowo uzakwemukela owakhe umvuzo njengowakhe umsebenzi.
O nweghị ihe dị iche nʼetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bu nʼobi. Onye ọbụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
9 Ngoba siyizisebenzi zikaNkulunkulu kanye laye; liyinsimu kaNkulunkulu, liyisakhiwo sikaNkulunkulu.
Anyị so Chineke na-arụ ọrụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu.
10 Ngokomusa kaNkulunkulu engiwuphiweyo, njengomakhi omkhulu ohlakaniphileyo ngabeka isisekelo, lomunye wakha phezu kwaso. Kodwa kakube ngulowo lalowo abone ukuthi wakha njani phezu kwaso.
Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu.
11 Ngoba akulamuntu ongabeka esinye isisekelo ngaphandle kwaleso esibekiweyo, esinguJesu Kristu.
O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọala karịrị ntọala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọala ahụ.
12 Kodwa uba umuntu esakhela phezu kwalesisisekelo igolide, isiliva, amatshe aligugu, izigodo, utshani, inhlanga,
Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ,
13 umsebenzi walowo lalowo uzavela obala; ngoba usuku luzawudalula, ngoba luzavezwa emlilweni; umlilo uzahlola umsebenzi walowo lalowo ukuthi unjani.
ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ.
14 Uba umsebenzi womuntu awakhe phezulu usima, uzakwemukela umvuzo.
Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ.
15 Uba umsebenzi womuntu uzatshiswa, uzalahlekelwa; kodwa yena uqobo ezasindiswa, kodwa ngokunjalo njengangomlilo.
Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.
16 Kalazi yini ukuthi lilithempeli likaNkulunkulu, lokuthi uMoya kaNkulunkulu uhlala kini?
Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?
17 Uba umuntu echitha ithempeli likaNkulunkulu, uNkulunkulu uzamchitha yena; ngoba ithempeli likaNkulunkulu lingcwele, eliyilo lina.
Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.
18 Kakungabi khona ozikhohlisayo; uba umuntu phakathi kwenu ecabanga ukuthi uhlakaniphile kulumhlaba, kumele abe yisithutha, ukuze ahlakaniphe. (aiōn )
Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe. (aiōn )
19 Ngoba inhlakanipho yalumhlaba iyibuthutha kuNkulunkulu. Ngoba kulotshiwe ukuthi: Ubamba abahlakaniphileyo ebuqilini babo;
Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”
20 njalo lokuthi: INkosi iyayazi imicabango yabahlakaniphileyo, ukuthi iyize.
Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”
21 Ngakho kakungabi khona ozincoma ngabantu; ngoba zonke izinto ngezenu,
Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị.
22 loba uPawuli, loba uApolosi, loba uKefasi, loba umhlaba, loba impilo, loba ukufa, loba izinto ezikhona, loba izinto ezizayo; konke ngokwenu,
Ma ọ bụ Pọl, maọbụ Apọlọs, maọbụ Sefas, maọbụ ụwa a, maọbụ ndụ, maọbụ ọnwụ, maọbụ ihe dị taa na ihe niile ga-adị nʼoge dị nʼihu, ha bụ nke unu.
23 lina-ke lingabakaKristu, loKristu ungokaNkulunkulu.
Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke.