< 1 Imilando 23 >

1 UDavida esemdala esanele ngensuku wamisa uSolomoni indodana yakhe ukuthi abe yinkosi phezu kukaIsrayeli.
Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel.
2 Wasebuthanisa zonke induna zakoIsrayeli labapristi lamaLevi.
Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị.
3 AmaLevi asebalwa kusukela koleminyaka engamatshumi amathathu kusiya phezulu; lenani lawo, ngamakhanda awo, ngamadoda, laba zinkulungwane ezingamatshumi amathathu lesificaminwembili.
A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ.
4 Kula kwakulezinkulungwane ezingamatshumi amabili lane okuqondisa umsebenzi wendlu yeNkosi; lezinduna labahluleli abayizinkulungwane eziyisithupha;
Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe,
5 labagcini bamasango abayizinkulungwane ezine; labadumisi beNkosi abayizinkulungwane ezine ngezinto engizenzele ukudumisa, watsho uDavida.
puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”
6 UDavida wasewehlukanisa ngezigaba, ngokwamadodana kaLevi, oGerishoni, uKohathi, loMerari.
Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari.
7 KumaGerishoni kwakungoLadani loShimeyi.
E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị, Ladan na Shimei.
8 Amadodana kaLadani: OJehiyeli inhloko, loZethamu, loJoweli, emathathu.
Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ: Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel.
9 Amadodana kaShimeyi: OShelomithi loHaziyeli loHarani, emathathu. La ayezinhloko zaboyise koLadani.
Ụmụ Shimei bụ, Shelomot, Haziel na Haran, ha dị ndị ikom atọ. Ndị a niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼikwu Ladan.
10 Lamadodana kaShimeyi: OJahathi, uZiza, loJewushi, loBeriya. La ayengamadodana kaShimeyi, emane.
Ụmụ Shimei bụ, Jahat, Ziza, Jeush na Beriya. Ha dị ndị ikom anọ.
11 LoJahathi wayeyinhloko, loZiza engowesibili; kodwa uJewushi loBeriya babengelabantwana abanengi, ngakho babesendlini yaboyise ngokubalwa kanye.
Jahat bụ onye mbụ, Ziza onye nke abụọ. Ma Jeush na Beriya amụtaghị ọtụtụ ụmụ ndị ikom. Nʼihi ya, a gụnyekọtara ha dịka otu ezinaụlọ, kenye ha otu ọrụ.
12 Amadodana kaKohathi: OAmramu, uIzihari, uHebroni, loUziyeli, emane.
Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ.
13 Amadodana kaAmramu: OAroni loMozisi. UAroni wehlukaniselwa-ke ukungcwelisa izinto ezingcwelengcwele, yena lamadodana akhe, kuze kube nininini, ukutshisa impepha phambi kweNkosi, ukuyikhonza, lokubusisa ngebizo layo kuze kube nininini.
Ụmụ ndị ikom Amram bụ, Erọn na Mosis. Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu Onyenwe anyị, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi.
14 NgoMozisi umuntu kaNkulunkulu, amadodana akhe abizwa ngaphansi kwesizwe sakoLevi.
Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.
15 Amadodana kaMozisi: OGereshoma loEliyezeri.
Ụmụ ndị ikom Mosis bụ, Geshọm na Elieza.
16 Amadodana kaGereshoma: UShebuweli inhloko.
Ụmụ ndị ikom Geshọm bụ Shubuel, onye mbụ.
17 Lamadodana kaEliyezeri ayenguRehabhiya inhloko; uEliyezeri wayengelawo-ke amanye amadodana, kodwa amadodana kaRehabhiya ayemanengi okwedlulisayo.
Ụmụ ụmụ Elieza bụ Rehabaya onye mbụ. Elieza amụtaghị ụmụ ndị ikom ọzọ, ma ụmụ ndị ikom Rohabaya dị ọtụtụ.
18 Amadodana kaIzihari: UShelomithi inhloko.
Ụmụ ndị ikom Izha bụ Shelomit onye mbụ.
19 Amadodana kaHebroni: OJeriya inhloko, uAmariya owesibili, uJahaziyeli owesithathu, uJekameyamu owesine.
Ụmụ ndị ikom Hebrọn bụ Jereaya onye mbụ, na Amaraya, onye nke abụọ, Jahaziel onye nke atọ, na Jekameam, onye nke anọ.
20 Amadodana kaUziyeli: OMika inhloko, loIshiya owesibili.
Ụmụ ndị ikom Uziel bụ Maịka, onye mbụ, na Ishaya, onye nke abụọ.
21 Amadodana kaMerari: OMahli loMushi. Amadodana kaMahli: OEleyazare loKishi.
Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi Ụmụ ndị ikom Mali bụ Elieza na Kish
22 UEleyazare wasesifa, wayengelamadodana kodwa amadodakazi; amadodana kaKishi, abafowabo, asewathatha.
Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
23 Amadodana kaMushi: OMahli loEderi loJeremothi, emathathu.
Ụmụ ndị ikom Mushi bụ Mahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ.
24 La ngamadodana kaLevi ngendlu yaboyise, inhloko zaboyise, ngokubalwa kwawo, ngenani lamabizo, ngamakhanda awo, esenza umsebenzi wenkonzo yendlu yeNkosi, kusukela koleminyaka engamatshumi amabili kusiya phezulu.
Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo.
25 Ngoba uDavida wathi: INkosi, uNkulunkulu kaIsrayeli, ibanikile abantu bayo ukuphumula, bazahlala eJerusalema kuze kube sephakadeni.
Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi.
26 Ngokunjalo-ke kumaLevi; kakulamuntu ozathwala ithabhanekele laloba yiziphi izitsha zalo zenkonzo yalo.
Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.”
27 Ngoba ngamazwi kaDavida okucina amadodana kaLevi abhalwa kusukela kwaleminyaka engamatshumi amabili kusiya phezulu.
Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ.
28 Ngoba indawo yawo yayingasesandleni samadodana kaAroni enkonzweni yendlu yeNkosi, phezu kwamaguma, laphezu kwamakamelo, laphezu kokuhlambulula zonke izinto ezingcwele, lomsebenzi wenkonzo yendlu kaNkulunkulu,
Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.
29 lowezinkwa zokubukiswa, lowempuphu ecolekileyo yomnikelo wokudla, lowezinkwana eziyizipatalala ezingelamvubelo, lowokubhakwe ngepani, lowokukhanzingiweyo, lowesilinganiso sonke lobukhulu;
Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
30 lokuma ukusa ngokusa ukubonga lokudumisa iNkosi, kanjalo lantambama,
Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
31 lokunikela konke kweminikelo yokutshiswa eNkosini ngamasabatha, ngokuthwasa kwenyanga, langemikhosi emisiweyo, ngenani, ngokwesimiso kukho, njalonjalo phambi kweNkosi.
Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.
32 Njalo azagcina umlindo wethente lenhlangano, lomlindo wendlu engcwele, lomlindo wamadodana kaAroni, abafowabo, enkonzweni yendlu yeNkosi.
Ya mere, e tinyere ọrụ ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, na ụlọnsọ ukwu ahụ nʼaka ha. Ha ka ọ dịkwara inyere ndị ikwu ha, bụ ndị nchụaja ahụ, ụmụ Erọn, aka nʼọrụ ha niile nʼụlọnsọ ukwu ahụ.

< 1 Imilando 23 >