< UZefaniya 3 >

1 Maye kulo idolobho labancindezeli, elihlamukayo lelingcolileyo!
Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
2 Kalilaleli muntu, kalivumi kukhuzwa. Kalithembeli kuThixo, kalisondeli kuNkulunkulu walo.
Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
3 Izikhulu zalo ziyizilwane ezibhongayo, ababusi balo bazimpisi zakusihlwa, ezingatshiyi lutho lwekuseni.
Ndịisi nọ nʼetiti ya dịka ọdụm na-agbọ ụja, ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị, nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
4 Abaphrofethi balo bayazazisa; bangabantu bamacebo amabi. Abaphristi balo bangcolisa indawo engcwele bephule lomthetho.
Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ, ha bụkwa ndị aghụghọ. Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ na-ejikwa ike emebi iwu.
5 UThixo phakathi kwalo ulungile; kenzi okubi, nsuku zonke ekuseni wenza ukulunga kwakhe njalo kaphambanisi ukusa kwamalanga wonke, ikanti abangalunganga kabalanhloni.
Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume. Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ. Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè; ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya, ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
6 “Ngizichithile izizwe; izinqaba zazo zidiliziwe. Ngitshiye imigwaqo yazo ideliwe kungekho odlula khona. Amadolobho azo adiliziwe; kakho ozasala kakho lamunye.
“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.
7 Ngathi kulo idolobho, ‘Impela uzangesaba uvume ukukhuzwa!’ Lapho-ke indlu yalo yokuhlala yayingayikudilizwa loba isijeziso sami sehlele phezu kwalo. Kodwa babelokhu betshisekela izenzo zokuxhwala kukho konke abakwenzayo.
Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.
8 Ngakho ngilindela,” kutsho uThixo, “lolusuku engizasukuma ngalo ngifakaze. Sengimise ukubuthanisa izizwe, ngiqoqe imibuso, ngehlisele ulaka lwami phezu kwabo konke ukuthukuthela kwami okukhulu. Umhlaba wonke uzaqothulwa ngomlilo womona wentukuthelo yami.”
Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.
9 “Lapho-ke ngizahlambulula izindebe zezizwe, ukuze zonke zikhuleke ebizweni likaThixo zimkhonze zimanyane.
“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.
10 Kusukela ngaphetsheya kwemifula yaseKhushi abakhonzi bami, abantu bami abahlakazekileyo, bazangilethela iminikelo.
Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche.
11 Ngalolosuku kaliyikuyangiswa ngobubi bonke elabenza kimi, ngoba ngizabasusa kulelidolobho abathokoziswa yikuzigqaja kwabo. Kaliyikuzikhukhumeza futhi entabeni yami engcwele.
Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m.
12 Kodwa ngizatshiya phakathi kwenu abathambileyo labathobekileyo, abathembele ebizweni likaThixo.
Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị.
13 Kabayikwenza okubi; kabayikuqamba amanga, loba kube lenkohliso emilonyeni yabo. Bazakudla balale phansi, kakho ozabenza besabe.”
Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”
14 Hlabela wena Ndodakazi yeZiyoni, klabalala kakhulu, wena Israyeli! Thaba uthokoze ngenhliziyo yakho yonke wena ndodakazi yaseJerusalema!
Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.
15 UThixo usesisusile isijeziso sakho, usesixotshile isitha sakho. UThixo, iNkosi ka-Israyeli, ulawe; akulangozi ozaphinda uyesabe futhi.
Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
16 Ngalolosuku bazakuthi kulo iJerusalema, “Ungesabi, wena Ziyoni; ungavumeli ukuba izandla zakho zibe buthakathaka.
Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
17 UThixo uNkulunkulu wakho ulawe, ulamandla okusindisa. Uzathokoza kakhulu ngawe, uzakududuza ngothando lwakhe, uzakuthokozela ngokuhlabelela.”
Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
18 “Insizi zemikhosi emisiweyo ngizazisusa kuwe; zingumthwalo lehlazo kuwe.
“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
19 Ngalesosikhathi ngizababona bonke abalincindezelayo; ngizahlenga abaqhulayo ngibuthe lalabo abahlakazwayo, ngizabapha udumo lenhlonipho kuwo wonke amazwe lapho abahlaziswa khona.
Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
20 Ngalesosikhathi ngizalibutha; ngalesosikhathi ngizalisa ekhaya. Ngizalipha inhlonipho lodumo phakathi kwezizwe zonke zasemhlabeni lapho sengiliphumelelisa futhi phambi kwamehlo enu uqobo,” kutsho uThixo.
Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

< UZefaniya 3 >