< Amahubo 98 >
1 Ihubo Hlabelelani uThixo ingoma entsha, ngoba wenzile izinto ezimangalisayo; isandla sakhe sokunene lengalo yakhe engcwele sekumenzele insindiso.
Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta.
2 UThixo useyenze yaziwa insindiso yakhe waveza ukulunga kwakhe ezizweni.
Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.
3 Uselukhumbule uthando lwakhe lokuthembeka Kwakhe endlini ka-Israyeli; yonke imikhawulo yomhlaba iyibonile insindiso kaNkulunkulu wethu.
O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
4 Hlokomani ngentokozo kuThixo, mhlaba wonke, hlabelani ingoma ngokujabula okukhulu, litshaya amachacho;
Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
5 yenzani umsindo kuThixo ngomhubhe, ngomhubhe langomsindo wokuhlabela,
werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,
6 ngamacilongo langomsindo wophondo lwenqama hlokomani ngentokozo phambi kukaThixo, iNkosi.
jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
7 Akuthi ulwandle luhlokome, lakho konke okuphakathi kwalo, umhlaba labo bonke abahlala kuwo.
Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
8 Akuthi imifula iqakeze izandla zayo, akuthi izintaba zihlabele kanyekanye ngentokozo;
Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
9 kazihlabele phambi kukaThixo, ngoba Uyeza ukuzakwahlulela umhlaba. Uzakwahlulela umhlaba ngokulunga labantu bonke ngokufaneleyo.
ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.