< Amahubo 97 >
1 UThixo uyabusa, umhlaba kawuthokoze; akuthi amakhumbi akude ajabule.
Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.
2 Amayezi lomnyama omkhulu kumsibekele; ukulunga lokwahlulela kuhle kuyisisekelo sesihlalo Sakhe sobukhosi.
Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.
3 Umlilo uhamba phambi Kwakhe uzihangule izitha zakhe inxa zonke.
Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.
4 Umbane wakhe ukhanyisa umhlaba; umhlaba ukubone lokho uthuthumele.
Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile; ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.
5 Izintaba zincibilika njengengcino phambi kukaThixo, phambi kweNkosi yomhlaba wonke.
Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile.
6 Amazulu amemezela ukulunga kwayo, labantu bonke bayayibona inkazimulo yayo.
Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.
7 Bonke abakhonza izifanekiso bathelwa ihlazo, labo abazikhukhumeza ngezithombe mkhonzeni, lonke lina bonkulunkulu!
A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe, ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee feenụ ya ofufe, unu chi niile!
8 IZiyoni iyezwa ithokoze lemizi yakoJuda iyajabula ngenxa yokwahlulela Kwakho, Oh Thixo.
Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ, obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.
9 Ngoba wena, Oh Thixo ungoPhezukonke kuwo wonke umhlaba; uphakeme ngaphezulu kakhulu kwabonkulunkulu bonke.
Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.
10 Akuthi bonke abamthandayo, uThixo, bazonde okubi, ngoba uyazilinda impilo zabathembekileyo bakhe abakhulule esandleni sababi.
Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị, nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.
11 Ukukhanya kuyehliselwa kwabalungileyo lentokozo kwabaqotho enhliziyweni.
Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.
12 Thokozani kuThixo lina elilungileyo, lidumise ibizo lakhe elingcwele.
Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, tookwanụ aha nsọ ya.