< Amahubo 38 >
1 Ihubo likaDavida. Isikhalazo. Awu Thixo, ungangikhuzi ngolaka loba ungijezise uthukuthele.
Abụ Ọma Devid. Arịrịọ. Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.
2 Ngoba imitshoko yakho ingicibile, njalo wangibhansula kakhulu ngesandla sakho.
Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.
3 Ngenxa yokuthukuthela kwakho kangiselakuphila emzimbeni wami; amathambo ami kawasaqinanga ngenxa yesono sami.
Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.
4 Ukona kwami sekungisinda njengomthwalo onzima ongathwalekiyo.
Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.
5 Izilonda zami sezilobovu sezisenyanyeka ngenxa yobuthutha bami besono.
Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m.
6 Ngiyangiswe ngehliswa kakhulu; sengitshona ngilila ilanga lonke.
Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.
7 Ngiphethwe liqolo ngobuhlungu obuqumayo; umzimba wami kawuselampilo.
Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m.
8 Sengibuthakathaka, sengicikizekile; ngiyabubula ngobuhlungu benhliziyo.
Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.
9 Zonke iziloyiso zami zisobala kuwe, Oh Thixo, ukububula kwami kakufihlekanga kuwe.
O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.
10 Inhliziyo yami iyagubhazela, amandla ami ayaphela; lokukhanya sekufiphele emehlweni ami.
Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.
11 Abangane bami labakhula bami sebengibalekela ngenxa yamanxeba ami; omakhelwane bami sebehlalela khatshana
Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.
12 Labo abafuna impilo yami sebethiyile, labo abafuna ukungilimaza bakhuluma ngokungidiliza; ilanga lonke batshonela ukwakha amacebo enkohliso.
Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.
13 Sengifana lesacuthe esingezwayo, njengesimungulu esehluleka ukuvula umlomo waso;
Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.
14 senginjengomuntu ongezwayo, olomlomo ongaphenduliyo.
Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.
15 Ngikulindele, Oh Thixo, uzaphendula, Oh Nkosi Nkulunkulu wami.
O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
16 Ngoba ngathi, “Ungabayekeli baklolode kumbe bazikhukhumeze phezu kwami nxa unyawo lwami lutshelela.”
Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”
17 Ngoba sengiseduze lokuwa, lobuhlungu bungiphethe njalonjalo.
Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.
18 Ngiyabuvuma ububi bami; ngiyakhathazeka ngesono sami.
Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.
19 Banengi labo abayizitha zami ezitshisekayo, labo abangizonda bengelasizatho banengi.
Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.
20 Labo abangiphindisela okuhle ngokubi bayangigcona lapho ngisenza okulungileyo.
Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, na-ebo ebubo megide m nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.
21 Oh Thixo, ungangideli; ungabi khatshana lami, Oh Nkulunkulu wami.
O Onyenwe anyị, ahapụkwala m; O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.
22 Woza masinyane uzongisiza, Nkosi yami loMsindisi wami.
Bịa ọsịịsọ inyere m aka Onyenwe m na Onye nzọpụta m.