< Amanani 15 >
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 “Tshela abako-Israyeli uthi kubo: ‘Ngemva kokungena kwenu elizweni engilinika lona ukuba libe likhaya lenu,
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu batara ala ahụ m na-enye unu dịka ụlọ unu,
3 kumele lethule iminikelo yenu eyenziwa ngomlilo kuThixo, kusukela emihlambini yenkomo leyezimvu, kube liphunga elimnandi kuThixo, kungakhathalekile ukuthi ngumnikelo wokutshiswa kumbe ngumhlatshelo, kungokwezifungo eziqakathekileyo loba iminikelo yokuzithandela loba eyemikhosi emisiweyo,
ọ bụrụ na unu echee nʼihu Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, maọbụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ nke si nʼigwe ewu na atụrụ, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ndị ọzọ, maka imezu nkwa pụrụ iche maọbụ onyinye afọ ofufu, maọbụ aja mmemme.
4 ngakho lowo oletha umnikelo wakhe uzakwethula kuThixo umnikelo wamabele oyingxenye eyodwa etshumini lehefa lefulawa ecolekileyo exutshaniswe lamafutha ayingxenye eyodwa kokune kwehini.
Onye wetara onyinye a aghaghị iweta nʼihu Onyenwe anyị aja mkpụrụ ọka nke bụ ezi ụtụ ọka ruru lita abụọ nke e ji mmanụ ruru otu lita gwakọtaa.
5 Lungisa lewundlu ngalinye elomnikelo wokutshiswa loba umhlatshelo ingxenye eyodwa kokune yehini yewayini njengomnikelo wokunathwayo.
Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ.
6 Kuthi ngenqama ulungise umnikelo wamabele ube yisilinganiso sokubili kokulitshumi kwehefa lefulawa ecolekileyo exutshaniswe lamafutha ayisilinganiso esisodwa kokuthathu kwehini,
“‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita,
7 lewayini eliyisilinganiso sehini esisodwa kokuthathu kube ngumnikelo wokunathwayo. Kunikele kube liphunga elimnandi kuThixo.
tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
8 Nxa ulungisa inkunzi eliguqa njengomnikelo wokutshiswa loba umhlatshelo, kusenzelwa isifungo esiqakathekileyo loba umnikelo wobudlelwano kuThixo,
“‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye Onyenwe anyị,
9 letha ndawonye lenkunzi umnikelo wamabele acholiweyo aba yifulawa ecolekileyo eyisilinganiso sehefa sokuthathu etshumini exutshaniswe lamafutha ayingxenye yehini.
tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.
10 Letha njalo lewayini eliyizilinganiso zengxenye yehini kube ngumnikelo wokunathwayo. Lokhu kuzakuba ngumhlatshelo wokudla, iphunga elimnandi kuThixo.
Wetakwa lita mmanya abụọ nke ga-abụ onyinye ihe ọṅụṅụ. Ọ ga-abụ onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
11 Ngakho inkunzi inye ngayinye loba inqama, iwundlu linye ngalinye loba izinyane lembuzi, akulungiswe ngale indlela.
Nke a bụ usoro a ga-agbaso nʼoge ọbụla e ji nwa oke ehi, maọbụ nwa ebule, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ nwa ewu chụọ aja.
12 Lokhu kwenze emnikelweni ngamunye loba ulungise emingaki.
Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja.
13 Wonke ozalwa lapha kumele enze lezizinto ngale indlela lapho eletha umnikelo wakhe owenziwe ngomlilo njengephunga elimnandi kuThixo.
“‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
14 Ezizukulwaneni ezilandelayo, owezizweni loba ngubani ohlezi lani nxa esethula umnikelo owenziwa ngomlilo njengoqhatshi olumnandi kuThixo, kumele enze khona lokho elikwenzayo.
Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya.
15 Imithetho le kumele uyilandele wena labantu bonke kanye labezizweni abahlala phakathi kwenu; lesi yisimiso esimi njalo lakuzizukulwane ezilandelayo. Lina kanye labezizweni lizafanana phambi kukaThixo:
Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị.
16 Lizabuswa ngemithetho lemilayo efananayo lina kanye labezizwe abahlala phakathi kwenu.’”
Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’”
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
18 “Tshela abako-Israyeli uthi: ‘Ekungeneni kwenu elizweni engilisa kulo
“Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya,
19 lingadla ukudla kwalelolizwe, yethulani ingxenye yakho ibe ngumnikelo kuThixo.
ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
20 Lethani isinkwa esenziwe ngempuphu yakuqala lisethule njengomnikelo ovela esizeni.
Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka.
21 Kuzozonke izizukulwane ezilandelayo lizakwethula umnikelo kuThixo uthethwe emputshini yenu yakuqala.’”
Unu aghaghị inye Onyenwe anyị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
22 “‘Kungakho nxa wehlulekile ukugcina loba yiphi imilayo uThixo ayinika uMosi ungananzelelanga,
“‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,
23 loba yiphi imilayo kaThixo alitshele yona ngoMosi, kusukela ngosuku uThixo amupha yona kuqhubekela ezizukulwaneni ezilandelayo,
bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.
24 kanti njalo lokhu kwenzakele ngephutha abantu bengakunanzelele, kutsho ukuthi abantu bonke bakuleyondawo bazanikela ngenkunzi eliguqa kube ngumnikelo wokutshiswa olephunga elimnandi kuThixo, ndawonye lomnikelo wamabele lowokunathwayo, kanye lempongo yomnikelo wesono njengokumisiweyo.
Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.
25 Umphristi uzakwenzela isizwe sonke sako-Israyeli indlela yokubuyisana, ngakho bazathethelelwa, ngoba bekungayisingabomo njalo banikele kuThixo ngokona kwabo umhlatshelo wokudla kanye lomnikelo wesono.
Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.
26 Abantu bonke bako-Israyeli kanye labezizwe abahlala labo bazathethelelwa, ngoba bonke lababantu babengonanga ngabomo.
A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie.
27 Kodwa nxa kungumuntu oyedwa owonayo kungesikho ngabomo, kumele alethe imbuzi ensikazi elomnyaka owodwa ibe ngumnikelo wesono.
“‘Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye mehiere na-amaghị ama, ọ ga-eweta nwa nne ewu gbara otu afọ maka aja mmehie.
28 Umphristi uzamenzela lowo owone ngokwenza isono kungesikho ngabomo indlela yokubuyisana phambi kukaThixo, kuthi ngemva kokuba indlela yokubuyisana isiyenziwe, uzathethelelwa.
Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ.
29 Wonalo umthetho ngowomuntu wonke owonayo kungesikho ngabomo, kungakhathalekile ukuthi ungowako-Israyeli ozalelwe khonapha kumbe ngowezizweni.
Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu.
30 Kodwa loba ngubani owenza isono ngabomo, kungaba ngowakini loba owezizweni, athuke uThixo, lowomuntu uzaxotshwa ebantwini bakibo.
“‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu Onyenwe anyị, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel.
31 Ngenxa yokweyisa ilizwi likaThixo lokwephula imilayo yakhe, lowomuntu ngempela kaxotshwe kwabakibo; uhlala elokhu elalo icala.’”
Nʼihi na ha eledala okwu Onyenwe anyị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’”
32 Ngesikhathi abako-Israyeli besenkangala, indoda ethile yatholakala itheza inkuni ngosuku lweSabatha.
Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike.
33 Kwathi labo abamficayo etheza bamusa kuMosi lo-Aroni kanye lakubo bonke abantu,
Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel.
34 ngoba kungakazakali ukuthi kumele enziweni; wavalelwa entolongweni.
Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya.
35 UThixo wasesithi kuMosi, “Indoda leyo kumele ife. Abantu bonke kumele bamkhande ngamatshe ngaphandle kwezihonqo.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.”
36 Ngakho abantu bamusa ngaphandle kwezihonqo bamkhanda ngamatshe waze wafa, njengokulaywa kukaMosi nguThixo.
Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
38 “Tshela abako-Israyeli uthi kubo: ‘Kuzozonke izizukulwane ezizayo, kumele lithungele izixha zentshaka emiphethweni yezembatho zenu, isixha ngasinye sibe lentambo eluhlaza.
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nʼọgbọ niile na-abịa unu ga-adụnye eriri akwa nʼọnụ ala ala uwe unu. Unu ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ dụnye ya.
39 Lizakhumbula imilayo yonke kaThixo njalo liyilalele izikhathi zonke nxa likhangela intshaka lezi ukuze lingazibhixi ngokulandela izinkanuko zezinhliziyo zenu kanye lamehlo enu liduhe.
Eriri akwa ndị a dị nʼọnụ ọnụ uwe unu ga-eme ka unu cheta iwu niile Onyenwe anyị nyere unu. Ka unu rube isi na ha hapụ imerụ onwe unu site na ịgbaso ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu na anya unu.
40 Ngakho lizakhumbula ukuyilandela yonke imilayo yami ukuze lehlukaniselwe uNkulunkulu wenu.
Mgbe ahụ unu ga-echeta irube isi nʼiwu m niile, bụrụ ndị e doro nsọ nye Chineke unu.
41 Mina nginguThixo uNkulunkulu wenu, owalikhupha eGibhithe ukuze ngibe nguNkulunkulu wenu. NginguThixo uNkulunkulu wenu.’”
Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu ịbụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”