< UJakhobe 2 >

1 Bazalwane bami, njengabakholwayo eNkosini yethu elenkazimulo uJesu Khristu, lingabandlululi.
Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu.
2 Kasithi umuntu ufika emhlanganweni wenu egqize indandatho yegolide, egqoke lezigqoko ezinhle, besekungena umyanga egqoke izigqoko ezinithizelayo.
Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha,
3 Nxa limnaka kakhulu lowo ogqoke izigqoko ezinhle lithi kuye, “Nansi isihlalo esingcono,” kodwa kongumyanga lithi, “Wena mana laphayana,” kumbe lithi, “Hlala phansi eduze kwezinyawo zami,”
ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,”
4 Kambe kalibandlululanga njalo laba ngabahluleli abalemicabango emibi na?
ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe?
5 Lalelani, bazalwane bami abathandekayo: Kanti uNkulunkulu kabakhethanga yini labo abangabayanga emehlweni omhlaba ukuba babengabanothileyo ekukholweni kanye lokudla ilifa lombuso awuthembisa labo abamthandayo na?
Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya?
6 Kodwa lina libathukile abayanga. Abanothileyo akusibo yini abadinga inzuzo ngani? Akusibo yini abalihudulela emithethwandaba?
Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe?
7 Akusibo yini abahlambaza ibizo lobukhosi elalowo lina elingabakhe na?
Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu?
8 Nxa liwugcina sibili umthetho wobukhosi otholakala eMbhalweni othi, “Thanda umakhelwane wakho njengalokhu uzithanda,” lenza okulungileyo.
Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.
9 Kodwa nxa libandlulula lenza isono njalo lilahlwa ngumthetho njengabephuli bomthetho.
Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu.
10 Ngoba loba ngubani ogcina umthetho wonke, kodwa akhubeke endaweni eyodwa, ulecala lokuwephula wonke.
Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara.
11 Ngoba yena owathi, “Ungafebi,” wathi futhi, “Ungabulali.” Nxa ungafebi, kodwa ubulala, usube yisaphulamthetho.
Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu.
12 Khulumani njalo lenze njengalabo abazakwahlulelwa ngumthetho onika ukukhululeka,
Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha.
13 ngoba ukwahlulela okungelasihawu kuzakuba kulowo obengelasihawu. Isihawu sinqoba ukwahlulela!
Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.
14 Kusizani bazalwane bami, nxa umuntu esithi ulokholo kodwa engelazenzo? Ukholo olunjalo lungamsindisa na?
Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya?
15 Kasithi umfowenu loba udadewenu kalazigqoko lokudla kwansukuzonke.
Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị,
16 Nxa omunye wenu esithi kuye, “Hamba, ngikufisela okuhle; hlala ufudumala njalo usutha,” kodwa angenzi lutho ngalezi zinswelo zakhe zomzimba, kusizani na?
ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara?
17 Ngokunjalo, ukukholwa nje kuphela, nxa kungelamisebenzi kufile.
Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya.
18 Kodwa omunye uzakuthi, “Wena ulokukholwa; mina ngilezenzo.” Ngitshengisa ukukholwa kwakho kungelazenzo, njalo mina ngizakutshengisa ukukholwa kwami ngalokho engikwenzayo.
Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.” Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ
19 Uyakholwa ukuthi kuloNkulunkulu oyedwa. Kulungile! Lamadimoni ayakukholwa lokhu njalo ayathuthumela.
I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja.
20 Wena ndoda eyisiwula, ufuna ubufakazi bokuthi ukukholwa okungelamisebenzi kuyize na?
Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya?
21 Kanje ukhokho wethu u-Abhrahama kabalwanga njengolungileyo ngenxa yalokhu akwenzayo lapho anikela indodana yakhe u-Isaka e-alithareni na?
Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja?
22 Liyabona ukuthi ukukholwa kwakhe lezenzo zakhe kwakusebenza ndawonye, njalo ukukholwa kwakhe kwapheleliswa yilokho akwenzayo.
Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke.
23 Njalo umbhalo wagcwaliseka othi, “U-Abhrahama wakholwa uNkulunkulu, njalo kwabalwa kuye njengokulunga,” njalo wabizwa ngokuthi ngumngane kaNkulunkulu.
Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke.
24 Liyabona ukuthi umuntu ulungiswa yilokho akwenzayo hatshi ngokukholwa kuphela.
Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe.
25 Ngokunjalo, loRahabi isifebe konje kabalwanga njengolungileyo ngalokho akwenzayo lapho anika inhloli indawo yokulala wabuya wazikhupha ngenye indlela na?
Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche?
26 Njengoba umzimba ongelamoya ufile, ngokunjalo ukukholwa okungelamisebenzi kufile.
Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.

< UJakhobe 2 >