< UHezekheli 3 >
1 Wasesithi kimi, “Ndodana yomuntu, dlana okuphambi kwakho, dlana umqulu lo; ube ususiyakhuluma kuyo indlu ka-Israyeli.”
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.”
2 Ngakho ngavula umlomo wami, wasengipha umqulu ukuba ngiwudle.
Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie.
3 Wasesithi kimi, “Ndodana yomuntu, dlana umqulu lo engikunika wona ugcwalise isisu sakho ngawo.” Ngakho ngawudla, njalo emlonyeni wami wawuzwakala umnandi njengoluju.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.
4 Wasesithi kimi, “Ndodana yomuntu, hamba khathesi nje endlini ka-Israyeli ukhulume amazwi ami kubo.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile.
5 Kawuthunywa ebantwini abalolimi olungaziwayo lolunzima, kodwa endlini ka-Israyeli,
Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel.
6 hatshi ebantwini abanengi abolimi olungaziwayo lolunzima, ongeke uzwe abakutshoyo. Ngeqiniso aluba kade ngikuthume kubo kade bezakulalela.
Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị.
7 Kodwa indlu ka-Israyeli kayifuni ukukulalela ngoba kabafuni kungilalela, ngoba yonke indlu ka-Israyeli ilukhuni njalo ilenkani.
Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike.
8 Kodwa lawe ngizakwenza ube lenkani lobulukhuni njengabo.
Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.
9 Ngizakwenza ubuso bakho bube njengelitshe elilukhuni kulawo wonke, elilukhuni kulelitshe lomlilo. Ungabesabi kumbe bakuthuthumelise, lanxa beyindlu ehlamukayo.”
Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”
10 Njalo wathi kimi, “Ndodana yomuntu, lalela kakuhle njalo uwabeke enhliziyweni wonke amazwi engiwatsho kuwe.
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị.
11 Hamba khathesi nje ebantwini belizwe lakini abasekuthunjweni ukhulume labo. Uthi kubo, ‘Nanku okutshiwo nguThixo Wobukhosi,’ loba bezalalela kumbe bangalaleli.”
Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.”
12 Lapho-ke uMoya wangiphakamisa, kwathi ngemva kwami ngezwa umdumo ondindizelayo sengathi yinkazimulo kaThixo eyaphakama endaweni eyayime kuyo!
Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke Onyenwe anyị sị nʼọnọdụ ya bilie.
13 Umdumo wezimpiko zezidalwa eziphilayo zigudlana lomdumo wamavili eceleni kwazo, umdumo wokundindizela okukhulu.
Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha.
14 UMoya wasungiphakamisela phezulu ungisusa, njalo ngahamba ngomoya otshisekayo lokuthukuthela komoya wami lesandla esilamandla sikaThixo siphezu kwami.
Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.
15 Ngafika kwababethunjiwe ababehlala eTheli Abhibhi phansi koMfula uKhebhari. Khonapho-ke, lapho ababehlala khona, ngahlala labo insuku eziyisikhombisa ngiphelelwe ngamandla.
A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.
16 Ekupheleni kwensuku eziyisikhombisa ilizwi likaThixo lafika kimi lisithi,
Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
17 “Ndodana yomuntu, sengikwenze umlindi wendlu ka-Israyeli; ngakho zwana ilizwi engilikhulumayo ubanike isixwayiso esivela kimi.
“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
18 Nxa ngisithi emuntwini omubi, ‘Wena uzakufa impela,’ wena ungamxwayisi kumbe ukhulume ukuba umyekelise izindlela zakhe ezimbi ukuze asindise ukuphila kwakhe, lowomuntu omubi uzafela izono zakhe, kuthi wena ngikubeke icala legazi lakhe.
Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
19 Kodwa nxa umuntu omubi umxwayisa yena angaphenduki ebubini bakhe kumbe ezindleleni zakhe ezimbi, uzafela izono zakhe, kodwa wena uyabe uziphephisile.
Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara.
20 Njalo nxa umuntu olungileyo eguquka ekulungeni kwakhe enze okubi, mina ngibeke isikhubekiso phambi kwakhe, uzakufa. Njengoba nxa wena ungamxwayisanga, uzafela izono zakhe. Izinto ezilungileyo azenzayo kaziyikukhunjulwa, njalo wena ngizakubeka icala legazi lakhe.
“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya, ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha.
21 Kodwa nxa uxwayisa umuntu olungileyo ukuba angoni lakanye uyabe uziphephisile.”
Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.”
22 Isandla sikaThixo sasiphezu kwami lapho, njalo wathi kimi, “Sukuma uye egcekeni ngizakhuluma lawe khona.”
Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”
23 Ngakho ngasukuma ngaya egcekeni. Inkazimulo kaThixo yayimi lapho, injengenkazimulo engangiyibone phansi koMfula uKhebhari, ngathi mbo phansi ngobuso.
Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.
24 Lapho-ke uMoya wangena kimi wangimisa ngezinyawo zami. Wakhuluma wathi kimi, “Hamba uyezivalela endlini yakho.
Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ.
25 Njalo, wena ndodana yomuntu, bazakubopha ngemichilo; uzabotshwa ukuze ungayi phandle ebantwini.
Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ.
26 Ngizakwenza ulimi lwakho lunamathele elwangeni lomlomo wakho ukuze uthule unganelisi ukubakhuza lanxa beyindlu ehlamukayo.
Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.
27 Kodwa nxa sengikhuluma lawe ngizavula umlomo wakho, njalo uzakuthi kubo, ‘Nanku okutshiwo nguThixo Wobukhosi.’ Loba ngubani ozalalela myekele alalele, njalo loba ngubani ozakwala myekele ale; ngoba bayindlu ehlamukayo.”
Ma mgbe ọbụla m ziri gị ozi, aga m atọghepụ ire gị. Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.’ Ka onye nwere ntị nụrụ, ka onye nke na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.