< 2 Amakhosi 25 >

1 Ngomnyaka wesificamunwemunye wokubusa kukaZedekhiya, ngosuku lwetshumi lwenyanga yetshumi, uNebhukhadineza inkosi yaseBhabhiloni waya eJerusalema lebutho lakhe lonke, wayivimbezela; wayakhela imiduli yokuvimbezela inxa zonke.
Nʼafọ nke itoolu nke ọchịchị ya, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, Nebukadneza, eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ọ mara ụlọ ikwu nʼazụ obodo ahụ, wukwaa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ.
2 Idolobho lavinjezelwa kwaze kwaba ngumnyaka wetshumi lanye kaZedekhiya inkosi.
Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
3 Ngosuku lwesificamunwemunye lwenyanga yesine indlala yayisinzima edolobheni, abantu bengaselakudla.
Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri.
4 Umduli wedolobho wafohlwa, ibutho lonke labaleka. Basuka edolobheni bephuma ngesango eliphakathi kwemiduli emibili, phansi kwesivande senkosi, lanxa nje amaBhabhiloni ayeligombolozele idolobho. Babaleka beqonde e-Arabha.
Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.
5 Kodwa ibutho lamaKhaladiya laxotshana lenkosi layamfica emagcekeni aseJerikho. Wonke amabutho akhe ehlukana laye njalo ahlakazeka,
Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,
6 yena wathunjwa. Wasiwa enkosini yaseBhabhiloni eRibhila, lapho afika wagwetshelwa khona.
e jide ya. Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe.
7 Babulala amadodana kaZedekhiya ekhangele. Basebemkhupha amehlo, bambopha ngamaketane ethusi bamusa eBhabhiloni.
Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn.
8 Ngosuku lwesikhombisa ngenyanga yesihlanu, ngomnyaka wetshumi lasificamunwemunye kaNebhukhadineza inkosi yaseBhabhiloni, uNebhuzaradani umlawuli wabalindi besikhosini, owayesebenzela inkosi yaseBhabhiloni, wafika eJerusalema.
Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem.
9 Wathungela ithempeli likaThixo ngomlilo, lesigodlo senkosi lezindlu zonke zaseJerusalema. Zonke izindlu eziqakathekileyo wazitshisa.
O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ
10 Wonke amabutho aseBhabhiloni, ekhokhelwa ngumlawuli wamabutho okulinda umndlunkulu, adiliza imiduli ehonqolozele iJerusalema.
Ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze kwaturu mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu.
11 UNebhuzaradani umlawuli wabalindi wathatha bonke abantu ababesele edolobheni wabasa ekuthunjweni, ndawonye labo bonke abantu lalabo abasebeye enkosini yaseBhabhiloni.
Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buuru ụfọdụ mmadụ ndị fọdụrụ nʼobodo, na ndị niile fọdụkwara, ha na ndị ọzọ ahụ ji aka ha gbakwuru eze bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ.
12 Kodwa umlawuli wamabutho watshiya inengi labantu ababengabayanga bokucina elizweni ukuba basebenze ezivinini lasemasimini.
Ma ọchịagha ahụ, hapụrụ ụfọdụ na ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
13 AbeBhabhiloni baphahlaza izinsika zethusi lezinti zezibane loLwandle lwethusi, okwakusethempelini likaThixo. Bathwalela ithusi lelo eBhabhiloni.
Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ndị ahụ bulaa Babilọn.
14 Bathatha njalo imbiza, lamafotsholo, lezindlawu, lezinditshi lazozonke izitsha zethusi ezazisetshenziswa enkonzweni yasethempelini.
Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile, na ihe ịkpakepụ ọkụ, na ngaji ukwu niile na ngwa bronz niile nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.
15 Umlawuli wabalindi besigodlo wathatha indengezi lemiganu yokuchela, konke okwakwenziwe ngegolide elicengekileyo loba isiliva.
Ọchịagha ndị nche eze, chịrị ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
16 Ithusi elalivela ensikeni ezimbili, loLwandle kanye lelezidindi ezisusekayo, konke okwakwenzelwe ithempeli likaThixo nguSolomoni, kwakulesisindo esasingelinganiswe.
O bukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ.
17 Ubude bensika ngayinye babuzingalo ezilitshumi lasificaminwembili. Isiduku sethusi phezu kwenye insika sasizingalo ezintathu ubude baso njalo siceciswe ngomeluko lamaphomegranathi ethusi nxazonke. Eyinye insika kanye lomeluko wayo layo yayinjalo.
Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Isi bronz nke e kpukwasịrị nʼotu ogidi dị otu mita na ọkara nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.
18 Umlawuli wabalindi wathumba uSeraya induna yabaphristi, loZefaniya umsekeli wakhe kanye labalindi bomnyango abathathu.
Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata.
19 Kulabo ababelokhu besedolobheni, wathatha isikhulu esasiphethe amadoda okulwa labacebisi besikhosini abahlanu. Wathatha lonobhala owayeyinduna eyayiphethe ukubuthwa kwabantu bengeniswa emabuthweni kanye lamadoda angamatshumi ayisithupha ayelawo atholakala phakathi komuzi.
O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom ise na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii ndị ọrụ mmanye, ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ.
20 UNebhuzaradani umlawuli wabathatha bonke wabasa enkosini yaseBhabhiloni eRibhila.
Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
21 Khonale eRibhila, elizweni laseHamathi, inkosi yathi kabaqunywe. Ngakho abakoJuda baya ekuthunjweni kude lelizwe labo.
Nʼebe ahụ, na Ribla dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
22 UNebhukhadineza inkosi yaseBhabhiloni wakhetha uGedaliya indodana ka-Ahikhami, oyindodana kaShafani, ukuba aphathe abantu ababesele koJuda.
Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa nwa Shefan, ka ọ bụrụ onye na-elekọta ndị fọdụrụ na Juda,
23 Kwathi zonke izikhulu zabalawuli bamabutho lamabutho sebezwile ukuthi inkosi yaseBhabhiloni yayisibeke uGedaliya ukuba nguSibalukhulu, beza kuGedaliya eMizipha izikhulu kungu-Ishumayeli indodana kaNethaniya, uJohanani indodana kaKhareya, uSeraya indodana kaThanihumethi umNethofa, uJazaniya indodana kaMahakhathi, labantu babo.
Mgbe ndịisi agha na ndị ikom ha nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya onye na-achị ala ahụ, ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ, Ishmel nwa Netanaya, Johanan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet, onye Netofa, na Jaazanaya nwa onye Maaka, na ndị ikom ha.
24 UGedaliya wafunga isifungo ebathembisa labantu babo wathi: “Lingesabi izikhulu zaseBhabhiloni. Hlalani elizweni lisebenzele inkosi yaseBhabhiloni, konke kuzalilungela.”
Gedaliya ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha, sị, “Unu atụla egwu nʼihi ndịisi ọrụ Babilọn. Birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.”
25 Kodwa ngenyanga yesikhombisa u-Ishumayeli indodana kaNethaniya, indodana ka-Elishama, owayezalwa esikhosini, weza lamadoda alitshumi bafika babulala uGedaliya lamadoda akoJuda kanye laweBhabhiloni ayekade elaye eMizipha.
Ma nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye ya onwe ya si nʼagbụrụ eze, duuru mmadụ iri bịa Mizpa, tigbuo Gedaliya, na ndị ikom Juda na ndị Kaldịa niile, bụ ndị ya na ha nọ.
26 Ngenxa yalokhu, abantu bonke kusukela kubantukazana kusiya kwabaphakemeyo, kanye lezikhulu zamabutho, babalekela eGibhithe ngokwesaba abeBhabhiloni.
Nke a mere ka ndị Juda niile, site nʼonye nta ruo nʼonye ukwu, ha na ndịisi agha ndị ahụ biliri gaa Ijipt, nʼihi na ha tụrụ ndị Kaldịa egwu.
27 Ngomnyaka wamatshumi amathathu lesikhombisa wokuthunjwa kukaJehoyakhini inkosi yakoJuda, ngomnyaka u-Evili-Merodakhi aba yinkosi eBhabhiloni, wakhulula uJehoyakhini entolongweni ngosuku lwamatshumi amabili lesikhombisa lwenyanga yetshumi lambili.
Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a.
28 Wakhuluma laye ngomusa, wamnika isihlalo esihloniphekayo esasingaphezu kwezamanye amakhosi ayelaye eBhabhiloni.
Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn.
29 Ngakho uJehoyakhini wakhupha izigqoko zakhe zasentolongweni, wadla lenkosi izikhathi zonke okwempilo yakhe yonke.
Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
30 Nsuku zonke inkosi yayinika uJehoyakhini isabelo esimisiweyo malanga wonke, empilweni yakhe yonke.
Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ.

< 2 Amakhosi 25 >