< 1 इतिहास 2 >

1 ही इस्राएलाचे पुत्र असे, रऊबेन, शिमोन, लेवी, यहूदा, इस्साखार, जबुलून,
Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn,
2 दान, योसेफ, बन्यामीन, नफताली, गाद व आशेर.
Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha.
3 एर, ओनान व शेला, ही यहूदाचे पुत्र. बथ-शूवा या कनानी स्त्रीपासून त्यास झाली. यहूदाचा प्रथम जन्मलेला पुत्र एर हा परमेश्वराच्या दृष्टीने वाइट होता त्यामुळे एरला त्याने मारुन टाकले.
Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị gburu ya.
4 यहूदाची सून तामार हिला पेरेस आणि जेरह हे पुत्र झाले. यहूदाचे हे पाच पुत्र होते.
Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke. Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise.
5 हेस्रोन आणि हामूल हे पेरेसचे पुत्र होते.
Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.
6 जेरहला पाच पुत्र होते. ते म्हणजे जिम्री, एथान, हेमान, कल्कोल व दारा.
Zera mụrụ: Zimri, na Etan, na Heman, na Kalkol, na Dara. Ha dị ndị ikom ise nʼọnụọgụgụ.
7 जिम्रीचा पुत्र कर्मी. कर्मीचा पुत्र आखार, त्याने देवाच्या समर्पित वस्तूंविषयी अपराध केला आणि इस्राएलांवर संकटे आणली.
Ekan nwa Kami, bụ onye ahụ tinyere ndị Izrel na nsogbu, site nʼihe o mere nke gbasara ihe e doro nsọ.
8 एथानाचा पुत्र अजऱ्या होता.
Etan mụrụ Azaraya.
9 यरहमेल, राम आणि कलुबाय हे हेस्रोनाचे पुत्र होते.
Hezrọn mụtara Jerameel, Ram na Kaleb.
10 १० अम्मीनादाब हा रामचा पुत्र. अम्मीनादाब हा नहशोनचा पिता. नहशोन हा यहूदाच्या लोकांचा नेता होता.
Ram mụrụ Aminadab, Aminadab amụọ Nashọn onyendu a maara ama na Juda.
11 ११ नहशोनचा पुत्र सल्मा. बवाज हा सल्माचा पुत्र.
Nashọn mụrụ Salma, Salma amụọ Boaz.
12 १२ बवाज ओबेदाचा पिता झाला आणि ओबेद इशायाचा पिता झाला.
Boaz amụta Obed, Obed amụọ Jesi.
13 १३ इशायास ज्येष्ठ पुत्र अलीयाब, दुसरा अबीनादाब आणि तिसरा शिमा,
Nwa nwoke mbụ Jesi mụrụ bụ Eliab; nke abụọ bụ Abinadab, nke atọ bụ Shimea.
14 १४ चौथा नथनेल, पाचवा रद्दाय,
Nke anọ bụ Netanel, nke ise bụ Radai,
15 १५ सहावा ओसेम, सातवा दावीद यांचा पिता झाला.
nke isii Ozem, nke asaa Devid.
16 १६ सरुवा आणि अबीगईल या त्यांच्या बहिणी अबीशय, यवाब आणि असाएल हे तिघे सरुवेचे पुत्र होते.
Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya, ndị aha ha bụ Zeruaya na Abigel. Zeruaya mụrụ Abishai, na Joab, na Asahel.
17 १७ अमासाची आई अबीगईल अमासाचे पिता येथेर हे इश्माएली होते.
Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa.
18 १८ हेस्रोनचा पुत्र कालेब, यरियोथाची कन्या अजूबा ही कालेबची पत्नी. या दोघांना पुत्र झाली येशेर, शोबाब आणि अर्दोन हे अजूबाचे पुत्र.
Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a Jesha, Shobab na Adọn.
19 १९ अजूबा मेल्यानंतर कालेबने एफ्राथ हिच्याशी लग्र केले. त्यांना पुत्र झाला. त्याचे नाव हूर.
Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
20 २० हूरचा पुत्र उरी. ऊरीचा पुत्र बसालेल.
Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.
21 २१ नंतर हेस्रोनाने, वयाच्या साठाव्या वर्षी माखीरच्या कन्येशी लग्न केले. माखीर म्हणजे गिलादाचा पिता त्याच्यापासून तिला सगूब झाला.
Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.
22 २२ सगूबचा पुत्र याईर. याईराची गिलाद प्रांतात तेवीस नगरे होती.
Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead.
23 २३ पण गशूर आणि अराम यांनी याईर व कनाथ यांची शहरे त्याचप्रमाणे आसपासची साठ शहरेही घेतली. ती सर्व, गिलादाचा पिता माखीर याच्या वंशजाची होती.
Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.
24 २४ हेस्रोन हा कालेब एफ्राथ येथे मृत्यू पावल्यानंतर त्याची पत्नी अबीया हिच्या पोटी तिला तकोवाचा पिता अश्शूर हा झाला.
Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa.
25 २५ यरहमेल हा हेस्रोनचा प्रथम जन्मलेला पुत्र. राम, बुना, ओरेन, ओसेम व अहीया ही यरहमेलचे पुत्र होती.
Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.
26 २६ यरहमेलला दुसरी पत्नी होती, तिचे नाव अटारा. ती ओनामाची आई होती.
Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam.
27 २७ यरहमेलाचा प्रथम जन्मलेला पुत्र राम याचे पुत्र मास, यामीन आणि एकर हे होत.
Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a: Maaz, na Jamin, na Eka.
28 २८ शम्मय व यादा हे ओनामाचे पुत्र. नादाब आणि अबीशूर हे शम्मयचे पुत्र.
Ụmụ Onam mụrụ bụ Shamai, na Jada. Shamai mụkwara Nadab, na Abishua.
29 २९ अबीशूराच्या पत्नीचे नाव अबीहाईल. त्यांना अहबान आणि मोलीद ही दोन पुत्र झाले.
Abishua na nwunye ya Abihail mụrụ Aban, na Molid.
30 ३० सलेद आणि अप्पईम हे नादाबचे पुत्र. यापैकी सलेद पुत्र न होताच मेला.
Ụmụ Nadab mụrụ bụ Seled, na Apaim. Seled nwụrụ na-amụtaghị nwa ọbụla.
31 ३१ अप्पईमचा पुत्र इशी. इशीचा पुत्र शेशान. शेशानचा पुत्र अहलय.
Ma Apaim mụtara Ishi. Ishi mụrụ Sheshan, Sheshan amụtakwa Alai.
32 ३२ शम्मयचा भाऊ यादा याला येथेर आणि योनाथान हे दोन पुत्र होते. येथेर पुत्र न होताच मेला.
Jada nwanne Shamai mụtara ụmụ ndị ikom abụọ, Jeta na Jonatan. Jeta amụtaghị nwa ọbụla,
33 ३३ पेलेथ आणि जाजा हे योनाथानाचे पुत्र, ही यरहमेलची वंशावळ होती.
ma Jonatan mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Pelet na Zaza. Ndị a bụ ụmụ Jerameel.
34 ३४ शेशानला पुत्र नव्हते, फक्त कन्या रत्ने होती. शेशानकडे मिसरचा एक नोकर होता. त्याचे नाव यरहा.
Sheshan mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị, ma o nweghị nwa nwoke. O nwere otu ohu bụ onye Ijipt, aha ya bụ Jaha.
35 ३५ शेशानने आपली कन्या आपला सेवक यरहाला त्याची पत्नी म्हणून करून दिली. तिच्या पोटी त्यास अत्ताय झाला.
O weere ada ya nwanyị nye odibo ya bụ Jaha, ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ mụtara ya otu nwa nwoke aha ya bụ Atai.
36 ३६ अत्ताय नाथानाचा पिता झाला आणि नाथान जाबादाचा पिता झाला.
Atai mụrụ Netan, Netan mụrụ Zabad,
37 ३७ जाबाद एफलालचा पिता झाला, एफलाल हा ओबेदचा पिता झाला.
Zabad amụọ Eflal. Nwa Eflal bụ Obed,
38 ३८ ओबेद येहूचा पिता झाला, येहू अजऱ्याचा पिता झाला.
ma Obed mụrụ Jehu. Jehu amụọ Azaraya.
39 ३९ अजऱ्या हेलसचा पिता झाला. आणि हेलस एलासाचा पिता झाला.
Azaraya bụ nna Helez, Helez mụrụ Eleasa.
40 ४० एलास सिस्मायाचा पिता झाला, सिस्माय शल्लूमचा पिता झाला.
Eleasa mụrụ Sismai, Sismai amụọ Shalum.
41 ४१ शल्लूम यकम्याचा पिता झाला, यकम्या अलीशामाचा पिता झाला.
Shalum bụ nna Jekamaya, ebe Jekamaya mụrụ Elishama.
42 ४२ यरहमेलाचा भाऊ कालेब याचे पुत्र. त्यापैकी मेशा हा प्रथम जन्मलेला. मेशाचा पुत्र जीफ. मारेशाचा पुत्र हेब्रोन.
Ụmụ ndị ikom Kaleb nwanne Jerameel bụ Mesha onye bụ ọkpara ya, nna Zif, onye mụrụ Maresha nna Hebrọn.
43 ४३ कोरह, तप्पूर, रेकेम आणि शमा हे हेब्रोनचे पुत्र.
Hebrọn mụrụ ndị a: Kora, Tapụọa, Rekem na Shema.
44 ४४ शमाने रहम याला जन्म दिला, रहमाचा पुत्र यकर्म. रेकेमचा पुत्र शम्मय.
Shema mụrụ Raham, onye bụ nna Jokean. Rekem mụrụ Shamai.
45 ४५ शम्मयचा पुत्र मावोन. मावोन हा बेथ-सूरचा पिता.
Ọkpara Shamai bụ Maon, onye mụrụ Bet Zoa.
46 ४६ कालेबला एफा नावाची उपपत्नी होती. तिला हारान, मोसा, गाजेज हे पुत्र झाले. हारान हा गाजेजचा पिता.
Efaa, iko nwanyị Kaleb, mụtaara ya Haran, Moza na Gazez. Haran mụtakwara nwa ọ kpọrọ aha ya Gazez.
47 ४७ रेगेम, योथाम, गेशान, पेलेट, एफा व शाफ हे यहदायचे पुत्र.
Jadia mụtara ndị ikom ndị a: Regem, Jotam, Gesham, Pelet, Efaa na Shaaf.
48 ४८ माका ही कालेबची उपपत्नी हिला शेबेर आणि तिऱ्हना हे पुत्र झाली.
Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a: Sheba na Tiahana,
49 ४९ तिला मद्यानाचा पिता शाफ आणि मखबेना व गिबा यांचा पिता शवा हे ही तिला झाले. अखसा ही कालेबची कन्या.
ọ mụtakwara Shaaf, onye bụ nna Madmanna, Sheva nna Makbena, tinyere Gibea. Aha nwa nwanyị Kaleb mụtara bụ Aksa.
50 ५० ही कालेबची वंशावळ होती. एफ्राथेचा प्रथम जन्मलेला पुत्र हूर याचे पुत्र. किर्याथ-यारीमाचा पिता शोबाल,
Ndị a bụ ụmụ Kaleb. Ụmụ Hua, ọkpara Efrata mụrụ bụ, Shobal, nna Kiriat Jearim,
51 ५१ बेथलेहेमचा पिता सल्मा आणि बेथ-गेदेरचा पिता हारेफ.
Salma nna Betlehem, na Haref, nna Bet-Gadea.
52 ५२ किर्याथ-यारीमचा पिता शोबाल याचे वंशज हारोवे, मनुहोथमधील अर्धे लोक,
Ụmụ Shobal nna Kiriat Jearim mụrụ bụ Haroe, onye mụrụ ọkara ndị ikwu Menuhot.
53 ५३ आणि किर्याथ-यारीममधील घराणेने इथ्री, पूथी, शुमाथी आणि मिश्राई हे ती होत. त्यापैकी मिश्राईपासून सराथी आणि एष्टाबुली हे झाले.
Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta.
54 ५४ सल्माचे वंशज बेथलेहेम व नटोफाथी, अटरोथ-बेथयवाब, अर्धे मानहथकर आणि सारी लोक.
Salma mụtara ikwu ndị a: Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa.
55 ५५ शिवाय तिराथी, शिमाथी, सुकाथी ही याबेसमध्ये राहणारी लेखकांची घराणी. हे नकलनवीस म्हणजे रेखाब घराण्याचा मूळपुरुष हम्मथ याच्या वंशातली केनी लोक होते.
Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.

< 1 इतिहास 2 >