< Roma 4 >

1 He aha ra, ki ta tatou, te mea i riro i a Aperahama, i to tatou tupuna i runga i te kikokiko?
Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ?
2 Mehemea hoki na nga mahi i tika ai a Aperahama, he mea tana e whakamanamana ai ia; otira kahore ki te Atua.
A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke.
3 E pehea ana oti ta te karaipiture? I whakapono a Aperahama ki te Atua, a whakairia ana hei tika mona.
Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.”
4 Na he tangata e mahi ana, e kore e kiia te utu mona he mea aroha noa, engari he mea mo tana.
Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ.
5 Otira ko te tangata kahore e mahi, engari e whakapono ana ki te kaiwhakatika i te tangata karakiakore, ka whakairia tona whakapono hei tika mona.
Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume.
6 Pera hoki me ta Rawiri korero i te manaaki ki te tangata, ka whakairia nei e te Atua he tika ki a ia, motu ke i nga mahi,
Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya.
7 I ki ai ia, Ka hari te hunga kua oti a ratou mahi tutu te muru, o ratou hara te hipoki:
“Ngọzị na-adịrị ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile, ndị ekpuchikwara mmehie ha niile.
8 Ka hari te tangata e kore nei e whakairia e te Ariki he hara ki a ia.
Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”
9 E korerotia ana ranei tenei haringa mo te kotinga, mo te kotingakore ano ranei? e mea ana hoki tatou, I whakairia tona whakapono hei tika mo Aperahama.
Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya.
10 He pehea ra te whakairinga? i a ia i te kotinga, i te kotingakore ranei? He teka i a ia i te kotinga, engari i te kotingakore:
Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu.
11 A riro ana i a ia te kotinga hei tohu, hei hiri mo te tika o tona whakapono, i a ia i te kotingakore: kia waiho ai ia hei matua ki te hunga katoa e whakapono ana, ahakoa kahore ratou i kotia, kia whakairia ai te tika ki a ratou;
Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.
12 Hei matua ano mo te kotinga ki te hunga ehara i te mea no te kotinga anake, engari e takahi ana hoki i runga i nga tapuae o taua whakapono o to tatou matua, o Aperahama, i a ia kahore ano i kotia.
Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu.
13 Ehara i te mea i na runga mai i te ture te kupu ki a Aperahama ratou ko ona uri mo te ao ka riro i a ia; engari i na runga mai i te tika o te whakapono.
Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe.
14 Mehemea hoki ka riro i te hunga ture, kua tikangakore te whakapono, kua taka te kupu whakaari:
Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla.
15 Ko ta te ture hoki e mahi ai, he riri; engari ki te kahore he ture, kahore hoki he hara.
Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa.
16 Koia i na rototia ai i te whakapono, kia waiho ai ma te aroha noa; kia u ai te kupu whakaari ki te whanau katoa; ehara i te mea ki to te ture anake, engari ki to te whakapono ano o Aperahama, ko ia nei hoki te matua o tatou katoa,
Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile.
17 Ko te mea hoki ia i tuhituhia, Kua waiho koe e ahau hei matua ki nga iwi maha, he matua i te aroaro o tana i whakapono ai, ara o te Atua, e whakaora nei i nga tupapaku, e karanga nei i nga mea kua kahore me te mea kei konei nei ano.
Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị.
18 Ahakoa kahore he rawa, u tonu tona manakonako ki a ia, kia meinga ai ia hei matua mo nga iwi maha, pera me te mea i korerotia, Ka penei tau whanau.
Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.”
19 Kihai ano i ngoikore tona whakapono, i mahara iho ia ki tona tinana, he penei me te mea kua tupapakutia, wahi iti hoki kua kotahi rau ona tau, ki te tupapakutanga hoki o te kopu o Hera:
Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ.
20 Ae, i titiro ia ki te kupu whakaari a te Atua, kihai ia i ruarua i runga i te whakaponokore, engari ka kaha tonu tona whakapono, me te whakakororia ki te Atua,
Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto.
21 U tonu hoki tona whakaaro e taea e ia te mea tana i korero ai.
O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa.
22 Koia hoki i whakairia ai ki a ia hei tika.
Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume.
23 Otira ehara i te mea he whakaaro ki a ia anake i tuhituhia ai taua whakairinga ki a ia;
Okwu ndị a, “A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume,” edeghị ya naanị maka ya.
24 Engari he whakaaro ki a tatou ano hoki; ka whakairia ki a tatou e whakapono nei ki te kaiwhakaara i a Ihu, i to tatou Ariki, i te hunga mate:
Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie.
25 I tukua nei mo o tatou he, i whakaarahia mo tatou kia whakatikaia.
Onye a rara nye ka ọ nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.

< Roma 4 >