< Waiata 75 >

1 Ki te tino kaiwhakatangi. Aratakiti. He himene, he waiata na Ahapa. Ka whakawhetai tonu matou ki a koe, e te Atua; ka whakawhetai tonu matou, kei te tata mai hoki tou ingoa: e korerotia ana e te tangata au mahi whakamiharo.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. Anyị na-eto gị, O Chineke. Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
2 Ka kitea e ahau te wa e rite ana, ka tika taku whakawa.
Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
3 Kuteretere noa iho te whenua me ona tangata katoa; naku i whakatu ona pou. (Hera)
Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. (Sela)
4 I mea ahau ki te hunga whakakake, Kati ra te whakakake; ki te hunga hara ano, Kaua e whakaarahia te haona.
Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu.
5 Kaua to koutou haona e whakaarahia ki runga: kati te whakamaro i te kaki ina korero.
Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’”
6 No te mea kahore he aranga i te rawhiti, kahore i te hauauru, kahore hoki i te tonga.
Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
7 Ko te Atua ia te kaiwhakawa; ko tenei e whakaititia iho ana e ia, ko tera e whakaarahia ake ana.
Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe; ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
8 Kei te ringa hoki o Ihowa he kapu, pahuka tonu te waina; ki tonu, whakananu rawa, hei ringihanga mana: ko nga nganga ia, ma te hunga kino katoa o te whenua e tatau, e inu.
Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
9 Ko ahau ia, ka kauwhau tonu: ka himene ki te Atua o Hakopa.
Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
10 A ka kotia e ahau nga haona katoa o te hunga kino: ka whakaarahia ake ia nga haona o te tangata tika.
bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”

< Waiata 75 >