< Waiata 69 >

1 Ki te tino kaiwhakatangi. Hohanimi. Na Rawiri. Whakaorangia ahau e te Atua, ka tae mai hoki nga wai ki roto ki toku wairua.
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Eji olu abụ “Okoko Lili.” Abụ Devid. O Chineke, zọpụta m, nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.
2 Ka tapoko ahau ki te oru hohonu, ki te wahi kahore nei he tunga: kua tae ahau ki nga wai hohonu, ngaro iho ahau i nga waipuke.
Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.
3 Kua ruwha ahau i taku tangi; kua maroke toku korokoro: pakoko kau oku kanohi i ahau e tatari nei ki toku Atua.
Akpịrị akpọọla m nkụ; ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka. Anya m agbaala ọchịchịrị ebe m na-ele anya Chineke.
4 Tini ke i nga makawe o toku matenga te hunga e kino noa ana ki ahau: he kaha rawa te hunga e mauahara noa ana ki ahau, e mea nei kia whakamatea ahau; utua ana e ahau i reira nga mea kihai i tangohia e ahau.
Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi.
5 E te Atua, e matau ana koe ki toku kuware; kahore hoki oku he e ngaro i a koe.
Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.
6 E te Ariki, e Ihowa o nga mano kaua te hunga e tatari ana ki a koe e whakama i ahau: e te Atua o Iharaira, kei numinumi kau i ahau te hunga e rapu ana i a koe.
Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel.
7 Mou hoki ahau i waiho ai hei tawainga: ngaro iho toku mata i te whakama.
Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu.
8 He tangata ke ahau ki oku hoa ake: hei tautangata ki nga tama a toku whaea.
Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.
9 Ka pau hoki ahau i te aroha ki tou whare: kua tau ano ki ahau nga tawai a te hunga e tawai ana ki a koe.
Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.
10 I ahau i tangi, i whakatiki hei whiu i toku wairua, ka waiho tena hei tawainga moku.
Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.
11 I kakahu hoki ahau i te kakahu taratara moku, a i waiho hei whakatauki ma ratou.
Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.
12 Kei te korero kino moku te hunga e noho ana i te kuwaha: waiatatia ana ahau e te hunga haurangi waina.
Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ, abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.
13 Ko ahau ia, ki a koe taku inoi, e Ihowa, i te wa e manakohia ai: whakahokia mai he kupu ki ahau, e te Atua, i runga i te nui o tou aroha, o te pono o tau whakaoranga.
O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
14 Whakaorangia ahau i roto i te oru, kei toremi: kia ora ahau i te hunga e kino ana ki ahau, i nga wai hohonu ano hoki.
Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi.
15 Kei ngaro ahau i te waipuke, kei horomia e te rire; kei kopia ano te waha o te poka ki runga ki ahau.
Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.
16 E Ihowa whakahokia mai he kupu ki ahau; he pai hoki tou atawhai: tahuri mai ki ahau, kia rite ki te nui o au arohatanga.
O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
17 A kaua e huna tou mata ki tau pononga; e pouri ana hoki ahau: hohoro te whakahoki kupu mai ki ahau.
Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!
18 Whakatata mai ki toku wairua, hokona: whakaorangia ahau, e mahi nei oku hoariri.
Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.
19 E matau ana koe ki toku tawainga, ki toku whakama, ki toku numinumi: kei tou aroaro oku hoariri katoa.
Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.
20 Maru noa toku ngakau i te tawai; a ki tonu ahau i te pouri: i titiro ahau ki tetahi hei aroha mai, a kore ake; ki etahi hei whakamarie, a kihai i kitea.
Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.
21 I homai he au hei kai maku: i toku matewaitanga ano i whakainumia ahau ki te winika.
Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.
22 Kia meinga ta ratou tepu i to ratou aroaro hei mahanga; hei rore hoki i to ratou wa rangimarie.
Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.
23 Kia whakapouritia o ratou kanohi, kei kite ratou: kia wiri tonu hoki o ratou hope.
Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ, mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.
24 Ringihia atu tou riri ki runga ki a ratou, kia mau hoki ratou i tou arita, i tou weriweri.
Wụkwasị ha oke iwe gị, ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
25 Kia ururuatia to ratou nohoanga: kaua tetahi e noho ki o ratou teneti.
Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.
26 Mo ratou i tukino i te tangata i whiua nei e koe; a korerotia ana e ratou te pouri o te hunga i werohia e koe.
Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ, na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.
27 Tapiritia he kino ki runga ki to ratou kino; kaua hoki ratou e tukua kia tomo ki tou tika.
Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume, ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị.
28 Kia murua atu ratou i te pukapuka o te ora, kaua ano e tuhituhia ki roto ki te hunga tika.
Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.
29 Ko ahau ia, he rawakore, he pouri; kia whakateiteitia ake ahau, e te Atua, e tau whakaoranga.
Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu, O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.
30 Ka whakamoemiti taku waiata ki te ingoa o te Atua, ka whakanui ano taku whakawhetai i a ia.
Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.
31 Pai rawa tenei ki a Ihowa i te puru i te kau, i te mea whai haona, whai maikuku.
Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.
32 Kua kite te hunga mahaki, kua hari: ka ora ano o koutou ngakau, e te hunga e rapu nei i te Atua.
Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.
33 No te mea ka rongo a Ihowa ki nga rawakore, e kore ano e whakahawea ki ana herehere.
Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.
34 Kia whakamoemiti te rangi me te whenua ki a ia, nga moana, me nga mea katoa e tere ana i roto.
Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.
35 No te mea tera e whakaorangia e te Atua a Hiona, ka hanga ano e ia nga pa o Hura; a ka noho ratou ki reira, ka riro hoki a reira i a ratou.
Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn; ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.
36 A ka nohoia a reira e nga uri o ana pononga: hei kainga tupu ano a reira mo te hunga e aroha ana ki tona ingoa.
Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya, ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.

< Waiata 69 >