< Waiata 108 >

1 He waiata, he himene na Rawiri. Pumau tonu toku ngakau, e te Atua; ka waiata ahau, ae ra, ka himene ahau, me toku kororia ano.
Abụ, Abụ Ọma Devid. Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.
2 E ara, e te hatere, e te hapa: ka ara wawe ano ahau.
Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
3 Ka whakamoemiti ahau ki a koe, e Ihowa, i waenganui i nga iwi: ka himene ki a koe i waenganui i nga tauiwi.
Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4 He nui atu hoki tau mahi tohu i nga rangi, a ko tou pono tutuki noa atu ki nga kapua.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
5 Kia whakanuia koe, e te Atua, ki runga atu i nga rangi: hei runga atu i te whenua katoa tou kororia.
Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
6 Kia puta tau i aroha ai, ma tou ringa matau matou e whakaora, a whakahokia mai he kupu ki a matou.
Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
7 Kua korero te Atua i runga i tona tapu: Ka hari ahau, ka kotikoti i Hekeme, ka roherohe i te raorao o Hukota.
Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.
8 Noku Kireara; noku a Manahi; ko Eparaima ano hoki te kaha o toku matenga; ko Hura taku hepeta.
Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
9 Ko Moapa taku oko horoi; ka maka e ahau toku hu ki runga ki Eroma: ka whakamanamana ahau ki Pirihitia.
Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
10 Ma wai ahau e kawe ki te pa tuwatawata? Ko wai nana ahau i arahi ki Eroma?
Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
11 He teka ianei kua panga matou e koe, e te Atua? kahore hoki koe, e te Atua, e haere tahi me o matou taua.
Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
12 Homai ki a matou he awhina ki te hoariri: he teka kau noa hoki te awhina a te tangata.
Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
13 Ma te Atua tatou ka toa ai: mana hoki e takahi ki raro o tatou hoa whawhai.
Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

< Waiata 108 >