< Tauanga 25 >

1 Na ka noho a Iharaira ki Hitimi, a ka anga te iwi ka moepuku ki nga tamahine a Moapa.
Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko.
2 Na ratou hoki i karanga te iwi ki nga patunga tapu ma o ratou atua: na kai ana te iwi, a koropiko ana ki o ratou atua.
Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile.
3 Na ka whakaukia a Iharaira ki a Paarapeoro, a ka mura te riri o Ihowa ki a Iharaira.
Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa. Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha.
4 Na ka mea a Ihowa ki a Mohi, Tangohia nga ariki katoa o te iwi, taronatia hoki ki te aroaro o Ihowa, i te ritenga atu o te ra, kia tahuri atu ai i a Iharaira te riri o Ihowa e mura nei.
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu Onyenwe anyị nʼetiti ehihie, ka oke iwe Onyenwe anyị dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.”
5 Na ka mea a Mohi ki nga kaiwhakawa o Iharaira, Patua e tenei, e tenei o koutou ona tangata i whakaukia ki a Paarapeoro.
Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.”
6 Na, ka puta tetahi o nga tama a Iharaira, e mau ana mai i tetahi wahine Miriani ki ona teina i te tirohanga atu a Mohi, i te tirohanga atu ano hoki a te whakaminenga katoa o nga tama a Iharaira, i a ratou e tangi ana i te whatitoka o te tapenakar a o te whakaminenga.
Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
7 A, no te kitenga o Pinehaha, tama a Ereatara, tama a Arona tohunga, ka whakatika i te whakaminenga, ka hopu i te tao ki tona ringa;
Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya,
8 Na ka haere i muri i te tangata o Iharaira ki te teneti, a weohia ana raua tokorua, te tangata o Iharaira, me te wahine hoki i tona tia. A mutu iho te whiu o nga tama a Iharaira.
soro nwoke ahụ baa nʼime ụlọ, ebe ya na nwaagbọghọ ahụ dina. Ọ mara ha ùbe ahụ, nke si nʼahụ nwoke ahụ gafee mikpuo nʼafọ nwaagbọghọ ahụ. Nke a mere ka ihe otiti ahụ na-emegide ndị Izrel kwụsị.
9 A ko te hunga i mate i te whiu e rua tekau ma wha mano.
Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ anwụọlarị.
10 Na ka korero a Ihowa ki a Mohi, ka mea,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
11 Na Pinehaha, tama a Ereatara, tama a Arona tohunga, toku riri i anga ke atu ai i nga tama a Iharaira, i tona ngakau hae penei i toku i roto i a ratou, i kore ai nga tama a Iharaira e poto i ahau, i ahau e hae ana.
“Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha.
12 Mo reira me ki atu e koe, Nana, ka hoatu e ahau ki a ia taku kawenata mo te rangimarie:
Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya.
13 A ka mau ki a ia, ki ona uri hoki i muri i a ia, hei kawenata kia mau tonu te mahi tohunga; mona i hae, he whakaaro ki tona Atua, i mea whakamarietanga ano hoki mo nga tama a Iharaira.
Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
14 A ko te ingoa o te tangata o Iharaira i patua, i patua tahitia ra me te wahine Miriani, ko Timiri tama a Haru, he rangatira no tetahi whare kaumatua i roto i nga Himioni.
Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn.
15 Ko te ingoa hoki o te wahine Miriani i patua nei ko Kohopi, he tamahine na Turu; he rangatira ia no tetahi iwi, no tetahi whare kaumatua o Miriana.
Aha nwanyị Midia ahụ e gburu bụ Kozbi, nwa nwanyị Zua, onye bụ otu nʼime ndịisi ezinaụlọ na Midia.
16 Na ka korero a Ihowa ki a Mohi, ka mea,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
17 Whakataria he pakanga ki nga Miriani, patua hoki:
“Mesoo ndị Midia mmeso dịka ndị iro. Gbukwaa ha.
18 E whakatari ano hoki ratou i a koutou ki a ratou mahi tinihanga, i tinihangatia ra koutou e ratou i te mea mo Peoro, i te mea hoki mo Kohipi, tamahine a te rangatira o Miriana, he tuahine no ratou, i patua ra i te ra o te whiunga mo Peoro.
Nʼihi na ha mesoro unu mmeso dịka ndị iro mgbe ha ji ụzọ aghụghọ ghọgbuo unu nʼokwu Peoa, na nʼokwu Kozbi nwanne ha nwanyị, bụ nwa nwanyị otu nʼime ndịisi Midia, onye e gburu mgbe ihe otiti ahụ bịara nʼihi okwu Peoa.”

< Tauanga 25 >