< Rewitikuha 24 >

1 I korero ano a Ihowa ki a Mohi, i mea,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 Whakahaua nga tama a Iharaira kia kawea e ratou ki a koe, he hinu oriwa, hei te mea parakore, hei te mea tuki, mo te whakamarama, kia ka tonu ai nga rama.
“Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
3 Me whakapai tonu tena e Arona ki waho o te arai o te whakaaturanga, i roto i te tapenakara o te whakaminenga, ki te aroaro o Ihowa, i te ahiahi a tae noa ki te ata: he tikanga pumau, ma o koutou whakatupuranga.
Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu.
4 Me whakapai tonu e ia nga rama i runga i te turanga parakore o nga rama ki te aroaro o Ihowa.
Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu Onyenwe anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile.
5 Me tiki ano e koe he paraoa pai, ka tunu ai kia tekau ma rua nga keke: kia rua nga whakatekau o te epa ki te keke kotahi.
“Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla.
6 Ka whakatakoto ai e koe, kia rua nga rarangi, kia ono ki te rarangi kotahi, ki runga ki te tepu parakore i te aroaro o Ihowa.
Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị.
7 Me maka ano hoki e koe he parakihe parakore ki runga i tetahi rarangi, i tetahi rarangi, kia ai taua mea i runga i te taro hei whakamahara, hei whakahere ahi ki a Ihowa.
Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
8 Me whakararangi tonu e ia, i tenei hapati, i tenei hapati, ki te aroaro o Ihowa, he mea mo nga tama a Iharaira; hei kawenata pumau.
A ga-edo achịcha ndị a nʼihu Onyenwe anyị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ Izrel, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
9 A ma Arona ratou ko ana tama tena; me kai e ratou ki te wahi tapu; he tino tapu hoki tena mana i roto i nga whakahere ahi a Ihowa; hei tikanga pumau.
Ọ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị ga-eri ya nʼime nʼebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ, site nʼoke ha mgbe niile, nke sitere nʼonyinye nsure ọkụ e chere nye Onyenwe anyị.”
10 A i haere atu i roto i nga tama a Iharaira tetahi tama a tetahi wahine o Iharaira, ko tona papa no Ihipa: na ka whawhai tenei tama a te wahine o Iharaira ki tetahi tangata o Iharaira i roto i te puni;
Otu nwokorobịa, nke nna ya bụ onye Ijipt ma nne ya bụ onye Izrel, sitere nʼetiti ụmụ Izrel pụta. O ruo na nwoke a nne ya bụ onye Izrel na otu nʼime ndị ikom Izrel malitere ịlụ ọgụ.
11 Na ka kohukohu te tama a te wahine o Iharaira i te ingoa o Ihowa, ka kanga hoki: a kawea ana ia e ratou ki a Mohi. A ko te ingoa o tona whaea ko Heromiti, he tamahine na Tipiri, no te iwi o Rana.
Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel kwuluru Aha ahụ kọchaa ya. Nʼihi ya, a kpọrọ ya ikpe nʼihu Mosis. (Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibri, onye ebo Dan.)
12 Na ka hoatu ia e ratou kia tiakina, ma te kupu hoki a Ihowa te tikanga ki a ratou.
Ha tinyere nwoke ahụ nʼụlọ mkpọrọ na-eche ka ha nụ okwu Onyenwe anyị, ịmata ihe ha ga-eme ya.
13 Na ka korero a Ihowa ki a Mohi, ka mea,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
14 Kawea te tangata i kanga ra ki waho o te puni; a, ko nga tangata katoa i rongo i a ia, me popoki o ratou ringa ki tona matenga, ka aki ai te whakaminenga katoa i a ia ki te kohatu.
“Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya.
15 Me korero ano e koe ki nga tama a Iharaira, me ki atu, Ki te kanga tetahi tangata i tona Atua, ka waha e ia tona hara.
Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya.
16 A, ko te tangata e kohukohu i te ingoa o Ihowa, me tino whakamate ia; me tino aki ia e te whakaminenga ki te kohatu: ko te manene raua tahi ko te tangata whenua ka whakamatea, ina kohukohua e ia te ingoa o Ihowa.
Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu.
17 Ki te whakamate hoki tetahi i tetahi tangata me tino whakamate ano ia;
“‘Onye ọbụla gburu mmadụ ka a ga-egbu.
18 Ki te whakamate hoki tetahi i te kararehe, me utu e ia; he kararehe mo te kararehe.
Onye gburu anụ ụlọ na-abụghị nke ya, ga-akwụghachi ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ.
19 Ki te mate hoki i te tangata tetahi wahi o tona hoa; me mea ki a ia tana i mea ai:
Onye ọbụla merụrụ mmadụ ibe ya ahụ, a ga-emerụkwa onye ahụ ahụ nʼebe o merụrụ ibe ya ahụ.
20 He whati mo te whati, he kanohi mo te kanohi, he niho mo te niho: ko te mate i meatia e ia ki te tangata, me mea ano ki a ia.
Onye tijiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-etiji ọkpụkpụ nke ya. Anya ga-alara anya, eze ga-alakwara eze. Otu e si merụọ mmadụ ahụ, ka a ga-esi merụọkwa onye merụrụ ya ahụ.
21 Ki te whakamate hoki tetahi i te kararehe, me utu e ia: ki te whakamate hoki tetahi i te tangata, me whakamate ano ia.
Onye ọbụla gburu anụ ụlọ onye ọzọ, ga-akwụ ụgwọ ya. Ma a ga-egbu onye ọbụla gburu mmadụ.
22 Kia kotahi ano ta koutou whakawa mo te manene, mo te tangata whenua: ko Ihowa hoki ahau, ko to koutou Atua.
Unu ga-enwe otu iwu nke ga-adị nye ndị amụrụ nʼala, dịkwara ndị ọbịa niile. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
23 Na ka korero a Mohi ki nga tama a Iharaira, a kawea ana e ratou ki waho o te puni te tangata nana te kanga, a akina ana hoki ki te kamaka. A meatia ana e nga tama a Iharaira ta Ihowa i whakahau ai ki a Mohi.
Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel okwu, nʼihi ya ha dọkpụụrụ onye nkwulu ahụ pụọ nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya nʼebe ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

< Rewitikuha 24 >