< Kaiwhakariterite 3 >

1 Na ko nga iwi enei i waiho e Ihowa ko ratou hei whakamatautau i a Iharaira, ara ko nga mea o Iharaira kihai i mohio ki nga pakanga katoa o Kanaana;
Ndị a bụ aha mba dị iche iche Onyenwe anyị hapụrụ nʼala ahụ iji nwapụta ndị Izrel ahụ niile na-esoghị mgbe e buru agha nʼime ala Kenan.
2 Mo nga whakatupuranga ano ia o nga tamariki a Iharaira kia mohio, kia ako ki te whawhai, ara mo te hunga kihai i mohio ki tera i mua;
O mere nke a naanị ka ọ kuziere ọgbọ niile ndị Izrel ibu agha, bụ ndị ahụ na-amabeghị ihe agha bụ nʼoge gara aga.
3 Na, ko nga rangatira tokorima o nga Pirihitini, ko nga Kanaani katoa, ko nga Haironi ratou ko nga Hiwi i noho i Maunga Repanona, i Maunga Paaraheremona a tae noa ki te haerenga atu ki Hamata.
Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat.
4 Ko ratou hei whakamatautau mo Iharaira, kia mohiotia ai e rongo ranei ratou ki nga whakahau a Ihowa i whakahaua e ia ki o ratou matua, he mea whakapuaki na Mohi.
A ga-esite na ndị a nwapụta okwukwe ụmụ Izrel ma ịmata ma ha ga-edebe iwu Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Mosis nye nna nna ha ochie.
5 Na ka noho nga tamariki a Iharaira ki waenganui o nga Kanaani, o nga Hiti, o nga Amori, o nga Perihi, o nga Hiwi, o nga Iepuhi:
Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus.
6 A ka tango i a ratou tamahine hei wahine ma ratou, ka hoatu hoki i a ratou tamahine ki a ratou tama, ka mahi ano hoki ki o ratou atua.
Ha lụtaara onwe ha ụmụ ha ndị inyom na nwunye, werekwa ụmụ ha ndị inyom nye ụmụ ha ndị ikom, feekwa chi ha niile ofufe.
7 Na kua mahi nga tamariki a Iharaira i te kino i te tirohanga o Ihowa, wareware ake ki a Ihowa, ki to ratou Atua, mahi ana hoki ki nga Paara, ki te Ahataroto.
Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe.
8 Na ka mura te riri o Ihowa ki a Iharaira, a hokona atu ana ratou e ia ki te ringa o Kuhanarihataimi kingi o Mehopotamia. Na e waru nga tau i mahi ai nga tama a Iharaira ki a Kuhanarihataimi.
Nʼihi ya, iwe ọkụ Onyenwe anyị kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ.
9 A, no te tangihanga a nga tamariki a Iharaira ki a Ihowa, ka whakaarahia ake e Ihowa he kaiwhakaora mo nga tamariki a Iharaira, nana ratou i whakaora; ara a Otoniere tama a Kenaha teina o Karepe.
Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.
10 Na i tau iho ki runga i a ia te wairua o Ihowa, a i whakawa ia mo Iharaira; i haere hoki ki te whawhai; a homai ana e Ihowa ki tona ringa a Kuhanarihataimi kingi o Mehopotamia: na kua kaha tona ringa ki te whawhai ki a Kuhanarihataimi.
Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya, nke mere ka ọ bụrụ onye ikpe ndị Izrel, ọ pụrụ ibu agha. Onyenwe anyị nyefere Kushan Rishataim bụ eze ndị Aram nʼaka Otniel, onye ike ya karịrị nke ya.
11 A e wha tekau nga tau i okioki ai te whenua i te whawhai. Na ka mate a Otoniere, tama a Kenaha.
Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.
12 Na ka mahi kino ano nga tama a Iharaira i te tirohanga a Ihowa, a ka whakakahangia e Ihowa a Ekerona kingi o Moapa ki te whawhai ki a Iharaira, mo ratou i mahi kino i te tirohanga a Ihowa.
Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. Ya mere, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab.
13 Na ka huihuia e ia ki a ia nga tamariki a Amona ratou ko Amareke, a haere ana, patua ana e ia a Iharaira, a tangohia ana e ia te pa nikau.
Ọ kpọtara ndị Amọn na ndị Amalek ka ha dịnyere ya. Eglọn bịara buso ndị Izrel agha, nweta obodo Nkwụ, ya abụrụzia nke ha.
14 A kotahi tekau ma waru nga tau i mahi ai nga tamariki a Iharaira ki a Ekerona, kingi o Moapa.
Afọ iri na asatọ site nʼoge ahụ ka ụmụ Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị Eglọn, eze Moab.
15 No te tangihanga ia a nga tama a Iharaira ki a Ihowa, ka whakaarahia ake e Ihowa he kaiwhakaora mo ratou, a Ehuru tama a Kera, he Pineamini, he tangata ringa maui; na ka hoatu e nga tama a Iharaira he takoha kia kawea e ia ki a Ekerona kingi o M oapa.
Ma mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị banyere ọnọdụ ọjọọ ha, o zitere ha onye nzọpụta. Aha nwoke ahụ bụ Ehud, nwa Gera, onye sitere nʼagbụrụ Benjamin. Ọ bụ onye na-eme aka ekpe. Ya onwe ya bụkwa onye na-ebugara Eglọn, eze Moab, ego ụtụ niile ụmụ Izrel na-atụ kwa afọ.
16 Otiia kua oti i a Ehuru tetahi hoari te hanga mana; e rua ona mata, kotahi whatianga te roa; na ka whitikiria e ia i roto i ona kakahu ki tona huha matau.
Tupu ọ malite ije ya, o buru ụzọ kwadebere onwe ya mma agha nwere ihu abụọ na nzuzo. Ogologo mma ahụ ga-eru ihe dịka site nʼọnụ mkpịsịaka ruo nʼisi mbụ aka. Ehud kekwasịrị mma ahụ nʼapata ụkwụ aka nri ya, yikwasị ya uwe mwụda ya.
17 Na ko tana tukunga i te takoha ki a Ekerona kingi o Moapa; na he tangata tetere rawa a Ekerona.
O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu.
18 A ka mutu ta tera tuku i te takoha ka tonoa atu e ia te hunga i mauria mai ai te takoha.
Mgbe Ehud nyesịrị eze Eglọn ego ụtụ ahụ o ji bịa, o zilagara ndị butere ego ahụ.
19 Ko ia tonu ia i hoki whakamuri atu i nga whakapakoko i Kirikara, ka mea, He kupu huna taku ki a koe, e te kingi. Na ka mea tera, Whakarongoa! Na mawehe atu ana i a ia te hunga katoa e tu ana i tona taha.
Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.” Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.
20 Na ka haere atu a Ehuru ki a ia; a e noho ana ia ko ia anake i tona ruma raumati. Na ka mea a Ehuru, He kupu na te Atua taku ki a koe. Na ka whakatika ia i tona nohoanga.
Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ,
21 Na ka torona e Ehuru tona ringa maui, ka mau ki te hoari i tona huha matau, werohia ana ki tona kopu.
Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ.
22 A ngoto tahi atu ana te kakau me te mata, a tutakina iho te mata e te ngako, kihai i unuhia mai te hoari i roto i tona kopu, a puta atu ana ki muri.
Ọ bụladị isi mma ahụ sooro ihu mma ahụ mibanye nʼime afọ ukwu eze Eglọn. Ọnụ mma ahụ pụtakwara nʼazụ eze ahụ. Ehud amịpụtaghị mma ahụ, kama abụba dị nʼafọ eze ahụ kpuchiri ya.
23 Na ka haere atu a Ehuru na te whakamahau, a tutakina atu ana e ia nga tatau o te ruma ki a ia, kiia iho hoki.
Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha.
24 A, i tona haerenga atu, ka haere mai nga pononga a tera, na, i to ratou kitenga kua kiia nga tatau o te ruma, ka mea ratou, He pono kei te uhi ia i ona waewae i te ruma raumati.
Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.”
25 Tatari noa ratou a ka whakama: na, kihai ia i whakapuare i nga tatau o te ruma; katahi ratou ka mau ki te ki, a whakapuaretia ana. Na, ko to ratou ariki kua hinga ki te whenua, kua mate.
Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ.
26 Ko Ehuru ia i mawhiti i a ratou e tatari roa ana, a kua tae ki tua i nga whakapakoko, kua mawhiti ki Heirata.
Mgbe ahụ ha nọ na-eche, Ehud gbapụrụ. O sitere nʼebe ahụ arụsị ndị ahụ a pịrị apị dị gbafee, gbaga Seira.
27 A, no tona taenga, ka whakatangihia e ia te tetere ki te whenua maunga o Eparaima, a heke ana nga tamariki a Iharaira i runga i te maunga hei hoa mona, ko ia hoki i mua i a ratou.
Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha.
28 Na ka mea ia ki a ratou, Haere mai i muri i ahau, kua homai hoki e Ihowa nga Moapi, o koutou hoariri ki o koutou ringa. Na heke ana ratou i muri i a ia, a ka riro mai i a ratou nga whitinga atu o Horano i nga Moapi; kihai hoki i tukua tetahi tan gata kia whiti atu.
Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee.
29 Na patua iho e ratou nga Moapi i taua wa, me te mea tekau mano nga tangata, te hunga pakari anake, nga marohirohi katoa; kihai hoki tetahi i mawhiti.
Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.
30 Na ka hinga a Moapa i taua ra i te ringa o Iharaira. A e waru tekau nga tau i okioki ai te whenua i te pakanga.
Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ.
31 A i muri i a ia ko Hamakara tama a Anata, a patua iho e ia nga Pirihitini, e ono rau tangata, ki te wero kau: na ka ora ano a Iharaira i a ia.
Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel.

< Kaiwhakariterite 3 >