< Etera 1 >

1 Na, i te tau tuatahi o Hairuha kingi o Pahia, he mea kia whakamana ai te kupu a Ihowa, i whakapuakina e Heremaia, ka whakaohokia e Ihowa te wairua o Hairuha kingi o Pahia, a tukua ana e tera tana karanga puta noa i tona kingitanga, i tuhituhi hok i e ia, i mea ia,
Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,
2 Ko te kupu tenei a Hairuha kingi o Pahia, kua oti nga kingitanga katoa o te whenua te homai ki ahau e Ihowa, e te Atua o nga rangi; kua whakahaua mai hoki ahau e ia kia hanga he whare mona ki Hiruharama, ki tera i Hura.
“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda.
3 Ahakoa ko wai o koutou o tana iwi katoa, hei a ia tona Atua, a me haere ake ia ki Hiruharama, ki tera i Hura, ki te hanga i te whare o Ihowa, o te Atua o Iharaira, ko ia nei te Atua, kei Hiruharama ano ia.
Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.
4 Na, ko te tangata ka mahue ki te wahi e noho ai ia, ma nga tangata o tona wahi ia e awhina ki te hiriwa, ki te koura, ki te taonga, ki te kararehe, hei tapiri mo nga mea hoatu noa mo te whare o te Atua i Hiruharama.
Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’”
5 Katahi ka whakatika nga upoko o nga whare o nga matua o Hura, o Pineamine, me nga tohunga, me nga Riwaiti, me te hunga katoa i whakaohokia nei o ratou wairua e te Atua, ka mea ki te haere ki te hanga i te whare o Ihowa i Hiruharama.
Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge.
6 Na, ko nga tangata katoa i o ratou taha, kei te whakakaha i o ratou ringa ki te oko hiriwa, ki te koura, ki te taonga, ki te kararehe, ki te mea utu nui, he mea tapiri ki nga mea homai noa katoa.
Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha.
7 A i whakaputaina e Kingi Hairuha nga oko o te whare o Ihowa i kawea atu nei e ia ki roto ki te whare o ona atua;
Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ Onyenwe anyị nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya.
8 I whakaputaina enei e Hairuha kingi o Pahia, ara e Mitirerata kaitiaki taonga, taua atu ana e ia ki a Hehepatara rangatira o Hura.
Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda.
9 Ko te maha tenei o aua mea: e toru tekau peihana koura, kotahi mano peihana hiriwa, e rua tekau ma iwa maripi;
Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ: efere ọlaedo iri atọ, efere ọlaọcha otu puku, efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu,
10 E toru tekau nga haka koura, ko nga haka hiriwa, he ahua ke, e wha rau kotahi tekau; ko etahi oko ke, kotahi mano.
efere nta ọlaedo iri atọ, efere ọlaọcha nta narị anọ na iri, ngwongwo ndị ọzọ otu puku.
11 Ko nga oko katoa, ke nga mea koura, ko nga mea hiriwa, e rima mano e wha rau. Ko enei katoa i kawea atu e Hehepatara i te kawenga o nga whakarau i Papurona ki Hiruharama.
Nʼime ihe ndị a niile, ọnụọgụgụ ihe e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ dị puku ise na narị anọ. Sheshbaza bulatara ihe ndị a mgbe ya na ndị ahụ a dọọrọ nʼagha hapụrụ Babilọn na-alọta Jerusalem.

< Etera 1 >