< Ekoruhe 22 >

1 Ki te tahae te tangata i te kau, i te hipi ranei, a ka patua, ka hokona ranei e ia; kia rima nga kau e homai e ia hei utu mo te kau kotahi, kia wha hoki nga hipi mo te hipi kotahi.
“Ọ bụrụ na mmadụ ezuru ehi maọbụ atụrụ gbuo ya, maọbụ ree ya, ọ ga-akwụghachi ehi ise nʼọnọdụ ehi ahụ. Nʼọnọdụ otu atụrụ o zuuru, ọ ga-akwụghachi atụrụ anọ.
2 Ki te mau te tahae e poka ara ana, a ka patua, ka mate, kahore he toto e heke mona.
“Ọ bụrụ na e jide onye ohi mgbe ọ na-egbuka ụlọ onye ọzọ, ọ bụrụkwa na e tigbuo ya, mee ka ọ nwụọ, iwu ejideghị onye ahụ gburu ya.
3 Ki te mea kua whiti te ra ki a ia, ka heke he toto mona; me homai hoki e ia he utu; ki te kahore ana mea, na, me hoko ia mo tana tahae.
Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya. “Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji.
4 Ki te mau pu ki tona ringa te mea i tahaetia, he kau, he kaihe ranei, he hipi ranei, a e ora ana; kia rua nga utu e homai e ia.
Ọ bụrụ na a chọta ihe o zuru nʼaka ya, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, ọ ga-akwụghachi ọnụahịa ya okpukpu abụọ.
5 Ki te mea tetahi tangata kia kainga tetahi mara, tetahi kari waina ranei, a ka tukua atu e ia tana kararehe hei kai i te mara a tetahi; me utu e ia ki nga hua papai rawa o tana mara, ki nga hua papai rawa hoki o tana kari waina.
“Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ anụ ụlọ ya ka ọ gaa taa nri nʼubi maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ nʼubi onye ọzọ, onyenwe anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe niile anụ ụlọ ya mebiri, ma ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ aghaghị ịbụ ihe ọrụ ubi dị mma nke o si nʼubi ya maọbụ nʼubi vaịnị ya wepụta.
6 Ki te toro atu te ahi, a ka pono ki nga tataramoa, a ka pau nga whakapu witi, te witi ranei e tu ana, te mara ranei; me ata whakautu e te tangata nana i tahu te ahi.
“Ọ bụrụ na ọkụ na-agba banye nʼogwu, repịa ogbo ọka dị nʼubi mmadụ maọbụ ọka guzoro eguzo, ma ọ bụkwanụ ọhịa niile, onye ahụ tinyere ọkụ ahụ ga-akwụghachi ụgwọ ihe ahụ niile nke ọkụ repịara.
7 Ki te homai e te tangata tetahi moni, etahi mea ranei, ki tona hoa kia tiakina, a ka tahaetia i roto i te whare o taua tangata; ki te kitea te tahae, kia rua nga utu e homai e ia.
“Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ.
8 Ki te kahore i kitea te tahae, na, me kawe te rangatira o te whare ki te Atua, kia kitea me kahore i totoro tona ringaringa ki nga taonga a tona hoa.
Ọ bụrụ na a chọpụtaghị onye ohi ahụ, onye nwe ụlọ ahụ aghaghị ịbịa nʼihu Chineke, ka a chọpụta maọbụ ya nʼonwe ya setịpụrụ aka were ihe ahụ, bụ akụ nke onye ọzọ kpatara.
9 I nga whakawakanga hara katoa mo te kau, kaihe, hipi, kakahu, mo te ngaromanga o tetahi mea e kiia ana e tetahi nona, me haere te korero a te tokorua ki te Atua; ko te tangata kua whakataua te he ki a ia e te Atua, kia rua nga utu e homai e ia ki tona hoa.
Ọ bụrụ na onye ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, maọbụ atụrụ ya, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla furu efu, nke mmadụ na-asị, ‘Nke a bụ ya.’ Mmadụ abụọ ndị a ga-aga nʼihu ndị ikpe. Onye ọbụla ndị ikpe a mara ikpe ga-akwụghachi ibe ya ụgwọ okpukpu abụọ.
10 Ki te homai e tetahi he kaihe ki tona hoa, he kau ranei, he hipi ranei, tetahi ranei o nga tini kararehe, kia tiakina; a ka mate, ka whara ranei, ka pahuatia ranei, kihai ano hoki i kitea:
“Ọ bụrụ na anụ ụlọ mmadụ nyere onye agbataobi ya nʼaka idebe anwụọ, maọbụ merụọ ahụ, maọbụ gbafuo, ma anụ ụlọ ahụ ọ bụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ anụ ụlọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ dịghị onye hụrụ mgbe ihe ndị a dakwasịrị anụ ụlọ ahụ,
11 Ka waiho i waenganui i a raua te oati a Ihowa, mo tona ringa kihai i totoro atu ki te taonga o tona hoa: a me whakaae mai e te rangatira o taua mea, e kore ano hoki e utua.
mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu Onyenwe anyị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla.
12 Otiia ki te mea kua tahaetia atu i a ia, me hoatu he utu ki tona rangatira.
Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya.
13 Ki te mea kua haehaea, me kawe mai e ia hei whakaatu, a e kore e utua e ia te mea i haea.
Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya. Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
14 Ki te tikina ano hoki e te tangata tetahi mea a tona hoa, a ka whara, ka mate ranei, me te ngaro ano te rangatira o taua mea, me ata whakautu ano e ia.
“Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.
15 Kei reira te rangatira, e kore e utua: ki te mea e utua ana tona tukunga, i haere mai hoki mo tona utu.
Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.
16 Ki te whakawai te tangata i te kotiro kihai i taumautia, a ka moe raua, me whakarite he tapakuha, a me marena e ia hei wahine mana.
“Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya.
17 Ki te tino whakakahore rawa tona papa, a e kore e tukua ki a ia, me homai e ia nga moni e rite ana ki te kaireperepe mo nga kotiro.
Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ.
18 Kei tukua e koe te wahine makutu kia ora.
“E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ.
19 Ko te tangata i takotoria e ia he kararehe, me whakamate rawa.
“Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ.
20 Me whakangaro rawa te tangata e patu whakahere ana ma tetahi atua ke; engari ma Ihowa anake.
“Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị, a ga-eme ka ọ nwụọ.
21 Kaua hoki e whakatoia te manene, kaua ano hoki ia e tukinotia: he manene hoki koutou i mua, i te whenua o Ihipa.
“Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt.
22 Kaua e whakatupuria kinotia te pouaru, te pani ranei.
“Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna.
23 Ki te anga koe ki te whakatupukino i a raua, a ka tangi raua ki ahau, ina, ka whakarongo ahau ki ta raua karanga;
Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka.
24 A ka mura toku riri, ka patua ano hoki koutou ki te hoari; a ka pouarutia a koutou wahine, ka pania ano hoki a koutou tamariki.
Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna.
25 Ki te whakatarewa koe i te moni ki tetahi o taku iwi, ki tetahi o ou rawakore, kei rite tau ki a ia ki ta te kaiwhakatuputupu moni, kei tangohia i a ia te moni whakatuputupu.
“Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa.
26 Ki te tangohia e koe te kakahu o tou hoa hei taunaha, kaua e tukua kia rere te ra ka whakahoki ai ki a ia:
Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara.
27 Ko tena anake na hoki hei uhi mona, hei kakahu mona, mo tona kiri: a ko te aha hei moenga iho mona? ki te karanga mai hoki ia ki ahau, na ka whakarongo atu ahau; no te mea he mahi tohu tangata taku.
Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere.
28 Kaua e kohukohu ki te Atua, kaua ano hoki e kanga ki te ariki o tou iwi.
“Ekwulula aha Chineke, abụkwala onye na-achị ndị gị ọnụ.
29 Kei whakaroa koe ki te homai i nga matamua o ou hua, o ou wai: me homai e koe te matamua o au tamariki ki ahau.
“Atụfukwala oge ọbụla nʼịkwụghachi onyinye unu kwesiri inye. Maọbụ nke mkpụrụ ala ubi gị, na nke mmanya vaịnị gị, na ụgwọ i kwesiri ịkwụ. “Ị ghaghị inye m nwa gị nwoke e buru ụzọ mụọ.
30 Kia pera ano tau e mea ai ki au kau, ki au hipi: e whitu nga ra e noho ai ia ki tona whaea; i te waru o nga ra me homai ki ahau.
Otu a ka ị ga-emekwa banyere mkpụrụ mbụ nke ehi gị na atụrụ gị. Ị ga-ewebata ya nye m nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ha, mgbe ị hapụsịrị ha nne ha ụbọchị asaa.
31 Hei tangata tapu hoki koutou maku: kaua ano e kai i te kikokiko i haea ki te parae; me maka ma te kuri.
“Unu ga na-abụrụ m ndị dị nsọ. Nʼihi nke a, wezuganụ onwe unu nʼebe anụ a dọgburu adọgbu dị. Unu erikwala anụ dị otu a, kama tụpụrụnụ ya nkịta.

< Ekoruhe 22 >