< Ekoruhe 19 >

1 No te toru o nga marama o te haerenga mai o nga tama a Iharaira i te whenua o Ihipa, no taua rangi ano, ka tae ratou ki te koraha o Hinai.
Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị.
2 A, i to ratou haerenga atu i Repirimi, ka tae ki te koraha o Hinai, ka noho iho ratou i te koraha; a noho ana a Iharaira ki reira, ki te ritenga atu o te maunga.
Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị.
3 Na ka piki a Mohi ki te Atua, a ka karanga a Ihowa ki a ia i te maunga, ka mea, Kia penei tau korero ki te whare o Hakopa, tau kauwhau hoki ki nga tama a Iharaira;
Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel:
4 Kua kite koutou i nga mea i mea ai ahau ki nga Ihipiana, i taku whakawahanga hoki i a koutou i runga i nga parirau ekara, me te kawenga mai i a koutou ki ahau.
‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m.
5 Heoi ki te ata whakarongo koutou ki toku reo, ki te pupuri hoki i taku kawenata, ka waiho koutou hei taonga moku, motu ke i nga iwi katoa: i ahau hoki te whenua katoa:
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m,
6 A ka waiho koutou e ahau hei kingi, hei tohunga, hei iwi tapu hoki. Ko nga kupu enei e korero ai koe ki nga tama a Iharaira.
ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”
7 Na ka haere iho a Mohi, ka karanga ia ki nga kaumatua o te iwi, a hoatu ana e ia ki to ratou aroaro enei kupu katoa i akona nei e Ihowa ki a ia.
Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
8 Na ka pa katoa te iwi ki te whakahoki, ka mea, Ka mahia e matou nga mea katoa i korerotia mai na e Ihowa. A kawea ana e Mohi nga kupu a te iwi ki a Ihowa.
Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara Onyenwe anyị ihe niile ndị Izrel kwuru.
9 Na ka mea a Ihowa ki a Mohi, Nana, ka haere atu ahau ki a koe i roto i tetahi kapua matotoru, kia rongo ai te iwi, ua korero ahau ki a koe, kia whakapono ai hoki ratou ki a koe a mua tonu atu. A korerotia ana e Mohi nga kupu a te iwi ki a Ihowa.
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke Onyenwe anyị gwara ya.
10 Na ka mea a Ihowa ki a Mohi, Haere ki te iwi, ka whakatapu hoki i a ratou akuanei, apopo hoki, kia horoi hoki ratou i o ratou kakahu,
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri,
11 Kia takatu hoki mo te ra tuatoru; ta te mea hei te ra tuatoru a Ihowa haere iho ai ki te aroaro o te iwi katoa, ki runga ki Maunga Hinai.
jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile.
12 A whakatakotoria e koe he rohe mo te iwi, tawhio noa, tawhio noa, ka mea atu, Kia mohio koutou kei piki ki te maunga, kei pa ranei ki tona taha: ko nga tangata katoa e pa ana ki te maunga, ina, me whakamate.
Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’
13 Kaua te ringa e pa ki a ia, engari me aki ki te kohatu, me wero ranei ki te tao; ahakoa kararehe, ahakoa tangata, e kore e ora: ka kukume roa te tangi o te tetere, ka haere mai ai ratou ki te maunga.
Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.”
14 Na ka haere iho a Mohi i te maunga ki te iwi, ka whakatapu ia i te iwi, a horoia ana e ratou o ratou kakahu.
Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha.
15 A i mea ia ki te iwi, Kia takatu koutou i te toru o nga ra: kaua e whakatata atu ki te wahine.
Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”
16 A ka taka ki te toru o nga ra, i te ata, na, ka puta mai nga whatitiri, me nga uira, me te kapua matotoru i runga i te maunga, me te tangi o te tetere, tona nui na! a wiri katoa ana te hunga i te puni.
Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji.
17 Na ka arahina atu te iwi e Mohi i te puni ki te whakatau i te Atua; a tu ana ratou ki raro i te maunga.
Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute Chineke. Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ.
18 A he paowa kau Maunga Hinai, no te mea kua heke iho a Ihowa ki runga, i roto i te ahi; a kake ana tona paowa, ano he paowa oumu, a wiri pu te maunga katoa.
Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! Onyenwe anyị rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ.
19 A i te mea ka nui haere rawa te tangi o te tetere, ka korero atu a Mohi, a ka korero a reo tangata mai te Atua ki a ia.
Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe.
20 Na ka heke iho a Ihowa ki Maunga Hinai, ki te tihi o te maunga: a karangatia iho ana a Mohi e Ihowa ki te tihi o te maunga; a piki atu ana a Mohi.
Onyenwe anyị rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke.
21 Na ka mea a Ihowa ki a Mohi, Heke atu, kauwhautia te iwi ra, kei wahi ake ratou ki a Ihowa ki te matakitaki, a he tokomaha o ratou e hinga.
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ Onyenwe anyị anya ka ha ghara ịla nʼiyi.
22 Ko nga tohunga hoki e whakatata ana ki a Ihowa, kia tapu ratou, kei auta atu a Ihowa ki a ratou.
Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.”
23 A ka mea a Mohi ki a Ihowa, E kore e ahei i te iwi te piki ake ki Maunga Hinai; nau hoki i kauwhau iho ki a matou, i mea, Taiepatia te maunga, whakatapua hoki.
Mosis zaghachiri Onyenwe anyị sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’”
24 Na ka mea a Ihowa ki a ia, Haere, heke atu; ka piki mai ano koe, korua ko Arona: ko nga tohunga ia, me te iwi, kei wahi mai ratou, kei piki ki a Ihowa; kei auta atu ia ki a ratou.
Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị Izrel ghara irigota nʼebe a ịbịakwute Onyenwe anyị, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.”
25 A heke atu ana a Mohi ki te iwi, korero ana ki a ratou.
Ya mere, Mosis rịdakwuru ndị Izrel ga gwa ha.

< Ekoruhe 19 >