< Tiuteronomi 23 >

1 Ko te tangata kua unakatia, kua romiromia, kua tapahia atu ranei tona mea ngaro, e kore e uru ki roto ki te whakaminenga a Ihowa.
Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
2 E kore e uru te poriro ki roto ki te whakaminenga a Ihowa; ahakoa tae ki te tekau o ona whakatupuranga, e kore e uru ki roto ki te whakaminenga a Ihowa.
Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị.
3 E kore e uru te Amoni, te Moapi ranei, ki roto ki te whakaminenga a Ihowa; ahakoa tae ki te tekau o o ratou whakatupuranga, e kore e uru ki roto ki te whakaminenga a Ihowa ake ake:
Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta Onyenwe anyị, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke iri ha.
4 Mo ratou kihai i whakatau i a koutou, me te mau taro mai, me te mau wai mai mo koutou ki te ara, i to koutou putanga mai i Ihipa; mo ratou hoki i utu i a Paraama, i te tama a Peoro i Petoro i Mehopotamia, hei kanga mou.
Nʼihi na ha e jighị achịcha na mmiri bịa zute unu nʼụzọ mgbe unu si Ijipt pụta, ha goro Belam, nwa Beoa, onye si Petọ nke dị na Aram Naharaim, ka ọ bụọ unu ọnụ.
5 Otiia kihai a Ihowa, tou Atua, i pai ki te whakarongo ki ta Paraama; engari whakaputaina ketia ake e Ihowa, e tou Atua te kanga hei manaaki mou; no te mea e aroha ana a Ihowa, tou Atua, ki a koe.
Ma Onyenwe anyị Chineke gị egeghị Belam ntị, kama Onyenwe anyị Chineke gị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọrọ gị ngọzị, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị hụrụ gị nʼanya.
6 Kei whai koe kia mau te rongo ki a ratou, kia kake ranei ratou i nga ra katoa e ora ai koe.
Achọla udo ndị Amọn na Moab, na ọdịmma ha ụbọchị ndụ gị niile ruo mgbe ebighị ebi.
7 Kaua e whakarihariha ki te Eromi; ko tou tuakana hoki ia; kaua e whakarihariha ki te Ihipiana; he manene hoki koe i tona whenua i mua.
Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha.
8 Kei te toru o nga whakatupuranga ka uru a ratou tamariki e whanau ai ki roto ki te whakaminenga a Ihowa.
Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke Onyenwe anyị.
9 Ki te haere a ope atu koe ki ou hoariri, kia tupato i nga mea kino katoa.
Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha.
10 Ki te mea kei roto i a koe tetahi tangata kahore i ma i te paheketanga o te po, na me haere atu ia ki waho o te puni; kaua ia e haere ki roto ki te puni:
Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
11 Otiia ka whakaahiahi, na me koroi ia e ia ki te wai; a ka toene te ra, ka haere ia ki roto ki te puni.
Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị.
12 A me waiho e koe tetahi wahi i waho o te puni, hei putanga atu mou ki waho:
Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.
13 Kia whai kaheru hoki koe i roto i au mea; a ka noho koe ki waho, na me keri e koe ki taua mea, a ka tahuri ki te tanu i te mea i puta i roto i a koe:
Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ.
14 Kei te haereere hoki a Ihowa, tou Atua, i waenganui o tou puni, hei whakaora i a koe, hei tuku hoki i ou hoariri ki tou aroaro; mo reira kia tapu tou puni: kei kite ia i tetahi mea whakarihariha i roto i a koe, a ka tahuri ke i a koe.
Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. Onyenwe anyị achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị.
15 Kaua e tukua atu ki tona rangatira te pononga i tahuti mai i tona rangatira ki a koe:
Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,
16 Me noho ia ki a koe, ki waenga ou, ki te wahi e whiriwhiri ai ia, ki tetahi o ou kuwaha, ki tana e pai ai: kaua ia e tukinotia.
hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya.
17 Kaua tetahi o nga tamahine a Iharaira e waiho hei kairau, kaua ano hoki tetahi o nga tama a Iharaira e whakatangata o Horoma.
Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị.
18 Kei kawea e koe te utu o te wahine kairau, te utu ranei o te kuri ki roto ki te whare o Ihowa, o tou Atua, hei mea ki taurangi: he mea whakarihariha hoki ena e rua ki a Ihowa, ki tou Atua.
Ị gaghị ewebata nʼụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
19 Kei whakatarewa koe i tetahi mea ki tou teina hei mea whakatupu; hei moni whakatupu, hei kai whakatupu, i tetahi ranei o nga mea e whakatarewaina ana hei whakatupu:
A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa.
20 He tangata ke, whakatarewaina atu te moni whakatupu; ki tou teina ia kaua e whakatarewaina: kia manaakitia ai koe e Ihowa, e tou Atua, i nga mea katoa e totoro atu ai tou ringa i runga i te whenua e haere atu nei koe ki reira tango ai.
Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta.
21 Ki te puaki tau ki taurangi ki a Ihowa, ki tou Atua, kei whakaroa ki te whakamana; no te mea ka whaia mai e Ihowa, e tou Atua, ki a koe; a ka waiho hei hara mou.
Mgbe i kwere Onyenwe anyị bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya.
22 Ki te kahore ia e puaki tau ki taurangi, e kore e waiho hei hara mou.
Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla!
23 Ko te mea i puta atu i ou ngutu kai mana i a koe, mahia; kia rite hoki ki tau ki taurangi ki a Ihowa, ki tou Atua, hei whakahere tuku noa, hei pera me ta tou mangai i korero ai.
Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye Onyenwe anyị Chineke gị.
24 E haere koe ki te mara waina a tou hoa, kainga nga karepe e pai ai koe, a makona noa koe; kaua ia e kohia etahi ki tau oko.
Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị.
25 E haere koe ki te witi kahore ano kia kotia a tou hoa, na ma tou ringa e kato etahi hua; kaua ia he toronaihi e akina atu ki te witi a tou hoa, kahore ano kia kotia e ia.
Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.

< Tiuteronomi 23 >