< Mahi 16 >
1 Na ka tae atu hoki ia ki Rerepe, ki Raihitara: a, i reira tetahi akonga, ko Timoti te ingoa, he tama na tetahi wahine whakapono, he Hurai, ko tona papa ia he Kariki.
Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik.
2 He pai te korero mona a nga teina i Raihitara, i Ikoniuma.
Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya.
3 I mea a Paora kia haere ia hei hoa mona; a tangohia ana ia, kotia ana, he mea hoki mo nga Hurai e noho ana i aua wahi: i matau hoki ratou katoa he kariki tona papa.
Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik.
4 A, i a ratou e haereere ana i nga pa, ka tukua e ratou hei pupuri ma ratou nga tikanga i whakaritea e nga apotoro, e nga kaumatua, i Hiruharama.
Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha.
5 Na ka whakaukia nga hahi ki te whakapono, ka nui haere hoki i tenei ra, i tenei ra.
Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị.
6 Na haere ana ratou na waenganui o te whenua o Pirikia, o Karatia, kua araia hoki e te Wairua Tapu kei korero i te kupu ki Ahia;
Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ.
7 A, i te taenga atu ki Maihia, ka whakamatau ratou ki te haere ki Pitinia; heoi kihai i tukua e te Wairua o Ihu;
Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa.
8 Na kapea ana Maihia, ka haere ki Toroa.
Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas.
9 A ka kitea e Paora he kitenga i te po: He tangata no Makeronia e tu ana, e tohe ana ki a ia, e mea ana, Whiti mai ki Makeronia, awhinatia matou.
Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.”
10 A, no ka kitea te kitenga, ka mea tonu matou kia haere ki Makeronia, i whakaaro hoki, na te Atua matou i karanga ki te kauwhau i te rongopai ki a ratou.
Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.
11 Heoi, ko te rerenga atu i Toroa, ka tika tonu matou ki Hamotarakia, a ao ake te ra ki Neapori;
Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis.
12 I reira atu ki Piripai, ko te pa nui ia o taua wahi o Makeronia, he koroni no Roma: a noho ana matou i taua pa a taka noa etahi ra.
Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị.
13 Na i te ra hapati ka haere matou ki waho o te pa, ki te taha o tetahi awa, he whakaaro ko te wahi tera hei karakiatanga; a ka noho, ka korero ki nga wahine i haere tahi ake.
Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu.
14 Na ka whakarongo tetahi wahine, ko Riria te ingoa, he kaihoko papura, no te pa o Taiataira, he wahine karakia ki te Atua: he mea whakapuare tona ngakau e te Ariki, i rongo ai ia ki nga mea i korerotia e Paora.
Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu.
15 A, no ka oti ia te iriiri, ratou ko tona whare, ka tohe ia, ka mea, Ki te mea kua whakaaro koutou he pono taku mahi ki te Ariki, tomo mai koutou, e noho ki toku whare. Na ka tohea matou e ia.
Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.
16 Na, i a matou e haere ana ki te wahi inoi, ka tutaki ki a matou tetahi kotiro, he wairua matakite nei tona, he nui te utu i riro i a ia ma ona rangatira, i a ia e poropiti ana:
Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa.
17 Ka whai ia i a matou ko Paora, ka karanga, ka mea, he pononga enei tangata na te Atua, na te Runga Rawa, e whakapuakina ana e ratou te ara o te ora ki a koutou.
Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.”
18 Na he maha nga ra i mea ai ia i tenei. Otiia ka hoha a Paora, ka tahuri, ka mea ki te wairua, Ko taku kupu tenei ki a koe i runga i te ingoa o Ihu Karaiti, puta mai i roto i a ia, A puta mai ana i taua haora ano.
O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta.
19 Otira, no te kitenga o ona rangatira kua kore he mahinga moni ma ratou, ka mau ki a Paora raua ko Hira, ka toia ki te kainga hoki ki nga rangatira;
Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa.
20 A, ka oti raua te mau ki nga kaiwhakawa, ka mea, Ko enei tangata, he Hurai nei, e tino whakararuraru ana i to tatou pa,
Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,
21 E whakapuakina ana hoki e raua he ritenga e kore nei e tika kia whakaaetia, kia mahia e tatou, e nga tangata o Roma.
site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.”
22 Na ko te whakatikanga o te mano ki a raua; ka huhua o raua kakahu e nga kaiwhakawa, ka mea kia whiua ki te rakau.
Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe.
23 A, ka maha o raua whiunga e ratou, ka maka raua ki te whare herehere, ka tohutohutia te kaitiaki herehere, kia mau tana pupuri i a raua.
Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma.
24 No te rironga i a ia o taua kupu, ka maka raua e ia ki te whare herehere i roto rawa, ka whakauria o raua waewae ki te rakau.
Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.
25 Na i waenganui po ka inoi a Paora raua ko Hira, ka waiata atu ki te Atua, me te whakarongo ano nga herehere ki a raua;
Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị.
26 Na ka pa whakarere he ru nui, i ngarue ai nga turanga o te whare herehere: a puare tonu atu nga tatau katoa, whakakorokoroa ana nga herenga o nga tangata katoa.
Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.
27 A, ka oho te kaitiaki herehere i te moe, ka kite i nga tatau o te whare herehere e puare ana, na ka unu i tana hoari, ka mea ki te patu i a ia ano, hua noa kua oma nga herehere.
Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.
28 Na kanui te reo o Paora ki te karanga, ka mea, Kauaka tetahi mea kino e meatia ki a koe: ina tonu hoki matou katoa.
Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!”
29 A karangatia ana e ia he rama, ka rere ki roto, ka haere wiri, ka takoto ki te aroaro o Paora raua ko Hira,
Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji.
30 Ka arahina hoki raua ki waho, ka mea, E hoa ma, me aha ka ora ai ahau?
Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
31 Ka mea raua, Me whakapono ki te Ariki, ki a Ihu Karaiti, ka ora ai koe, koutou tahi ko tou whare.
Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.”
32 Na ka korerotia te kupu a te Ariki ki a ia, ki nga tangata katoa hoki i roto i tona whare.
Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị.
33 A ka mauria raua e ia i taua haora o te po, ka horoia o raua whiunga; na iriiria tonutia iho, a ia me ana tangata katoa.
Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim.
34 A ka arahina raua e ia ki tona whare, ka whakaturia he tepu kai ki mua i a raua, a nui atu tona hari, me tona whare katoa, i te mea kua whakapono nei ki te Atua.
Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
35 I te aonga ake ia o te ra, ka tonoa nga katipa e nga kaiwhakawa, i mea, Tukua aua tangata kia haere.
Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.”
36 Na ka korerotia e te kaitiaki herehere enei kupu ki a Paora, ka mea, Kua tono tangata mai nga kaiwhakawa, kia tukua korua: tena ra puta mai, haere i runga i te rangimarie.
Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”
37 Na ko te kinga atu a Paora, Kua whiua nuitia nei maua e ratou, ahakoa kahore i whakawakia, he tangata hoki no Roma, a kua maka maua ki te whare herehere; a kei te maka pukutia atu maua aianei e ratou? Kahore rapea: engari ma ratou tonu e haere m ai, e whakaputa i a maua ki waho.
Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.”
38 na ka korerotia enei kupu e nga katipa ki nga kaiwhakawa: a ka wehi, i to ratou rongonga no Roma raua;
Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.
39 Na ka haere mai ratou, ka tohe ki a raua; a, ka oti raua te arahi ki waho, ka mea ratou kia haere atu raua i te pa.
Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ.
40 A ka puta atu raua i te whare herehere, ka tomo ki te whare o Riria: a, no ka kite raua i nga teina, ka whakamarie i a ratou, ka haere.
Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.