< 2 Hamuera 8 >
1 Na, muri iho ka patua nga Pirihitini e Rawiri, a hinga ana ratou i a ia: a tangohia ana e Rawiri a Metekeama i te ringa o nga Pirihitini.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia.
2 I patua ano e ia a Moapa, a ruritia ana ratou ki te aho; a meinga ana ratou kia takoto ki te whenua: na e rua nga aho i ruritia e ia mo te whakamate, kotahi tino aho mo te whakaora. Na ka riro nga Moapi hei pononga ma Rawiri, hei kaihomai hakari.
Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
3 I patua ano e Rawiri a Hareretere tama a Rehopo kingi o Topa, i tona haerenga ki te whakahoki mai i tona rohe i te awa, i Uparati.
Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.
4 Na kotahi mano ana hariata i riro mai i a Rawiri, e whitu rau hoki nga hoia eke hoiho, e rua tekau mano nga tangata haere i raro. Na whakangongea ana e Rawiri nga hoiho o nga hariata katoa; i whakatoea ia etahi mo nga hariata kotahi rau.
Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
5 A, no te haerenga mai o nga Hiriani o Ramahiku ki te whakauru ki a Hararetere kingi o Topa, patua iho e Rawiri o nga Hiriani e rua tekau ma rua mano tangata.
Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
6 I whakanohoia ano e Rawiri etahi hoia pupuri ki Hiria o Ramahiku: a ka waiho nga Hiriani hei pononga homai hakari ma Rawiri. Na whakaorangia ana a Rawiri e Ihowa i ona haerenga katoa.
O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
7 I tangohia ano e Rawiri nga pukupuku koura a nga tangata a Hararetere, a kawea ana ki Hiruharama.
Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem.
8 A nui atu te parahi i tangohia e Kingi Rawiri i Petaha, i Perotai, i nga pa o Hararetere.
Site na Teba nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu.
9 A, i te rongonga o Toi kingi o Hamata kua patua e Rawiri te ope katoa a Hararetere,
Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile,
10 Katahi ka tono a Toi i a Iorama, i tana tama ki a Kingi Rawiri ki te oha ki a ia, ki te manaaki hoki i a ia; mona i whawhai ki a Hararetere, i patu hoki i a ia: he hoariri hoki a Hararetere no Toi: i te ringa ano o Iorama etahi mea hiriwa, mea k oura, mea parahi.
o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa.
11 Whakatapua ake era e Kingi Rawiri ma Ihowa hei tapiri mo te hiriwa, mo te koura i whakatapua e ia, a nga iwi katoa i hinga nei i a ia;
Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu.
12 A Hiria, a Moapa, a nga tamariki a Amona, a nga Pirihitini, a Amareke, me nga taonga o Hararetere tama a Rehopo, kingi o Topa.
Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba.
13 Na ka whai ingoa a Rawiri i tona hokinga mai i te patu i nga Hiriani i te Raorao Tote, ara kotahi tekau ma waru mano tangata.
Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite.
14 A i whakanohoia e ia etahi hoia pupuri ki Eroma; he mea whakanoho puta noa i Eroma katoa ana hoia pupuri, a ka meinga nga Eromi katoa hei pononga ma Rawiri. A whakaorangia ana a Rawiri e Ihowa i ona haerenga katoa.
O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
15 Na ko Rawiri te kingi o Iharaira katoa; a i whakarite ano a Rawiri i te whakawa, i te tika, mo tona iwi katoa.
Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.
16 Ko Ioapa tama a Teruia hoki te rangatira ope, ko Iehohapata tama a Ahiruru te kaiwhakamahara.
Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.
17 Ko Haroko tama a Ahitupu, raua ko Ahimereke tama a Apiatara, nga tohunga; ko Heraia hoki te kaituhituhi;
Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.
18 Ko Penaia tama a Iehoiara te rangatira mo nga Kereti, mo nga Pereti; ko nga tama ia a Rawiri nga tino rangatira.
Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.