< 2 Hamuera 6 >

1 Na ka huihuia ano e Rawiri te hunga whiriwhiri katoa o Iharaira e toru tekau mano.
Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi,
2 A ka whakatika a Rawiri ratou ko tona nuinga katoa, haere ana i Paare o Hura, tikina ana i reira te aaka a Ihowa, e huaina nei ki te Ingoa, ara ki te ingoa o Ihowa o nga mano, e noho nei i waenganui o nga kerupima.
Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim.
3 Na ka whakanohoia e ratou te aaka a te Atua ki runga ki te kata hou, a mauria ana i te whare o Apinarapa i Kipea; a na Uha raua ko Ahio, na nga tama a Apinarapa, i arahi te kata hou.
Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ,
4 Na kawea ana i te whare o Apinarapa i Kipea, me te haere tahi ano ratou ko te aaka a te Atua; i haere ano a Ahio i mua i te aaka.
nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ.
5 Na ka takaro a Rawiri ratou ko te whare katoa o Iharaira ki te aroaro o Ihowa, me te whakatangi ano i a ratou mea katoa he kauri nei te rakau, i nga hapa, i nga hatere, i nga timipera, i nga koronete, i nga himipora.
Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu.
6 A ka tae ki te patunga witi a Nakono, ka totoro a Uha ki te aaka a te Atua, a puritia ana e ia; i paheke hoki nga kau.
Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
7 Na ka mura te riri o Ihowa ki a Uha, a patua iho ia i reira e te Atua mo tona he, a mate ake i reira i te taha o te aaka a te Atua.
Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.
8 Na ka pouri a Rawiri mo ta Ihowa tukitukinga i a Uha; na huaina ana taua wahi e ia, ko Pereteuha; koia ano tena inaianei.
Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
9 Na ka wehi a Rawiri i a Ihowa i taua ra, ka mea, Ma te aha e tae ake ai te aaka a Ihowa ki ahau.
Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?”
10 Heoi kihai a Rawiri i pai ki te tango i te aaka a Ihowa ki a ia, ki te pa o Rawiri; na kawea ketia ana e Rawiri ki te whare o Opereeroma Kiti.
O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
11 E toru nga marama i noho ai te aaka a Ihowa ki te whare o Opereeroma Kiti: a ka manaakitia e Ihowa a Opereeroma ratou ko tona whare katoa.
Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.
12 A ka korerotia te korero ki a Kingi Rawiri, Kua manaakitia e Ihowa te whare o Opereeroma me ana mea katoa, he whakaaro ki te aaka a te Atua. Na ka haere a Rawiri, a kawea ana e ia te aaka a te Atua, i te whare o Opereeroma ki runga, ki te pa o R awiri, me te koa ano ia.
Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid.
13 A ka ono nga hikoinga i hokoi ai nga kaiamo i te aaka a Ihowa, na ka patua e ia etahi kau me tetahi mea momona.
Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.
14 Na ka whakapaua katoatia tona kaha e Rawiri ki te kanikani ki te aroaro o Ihowa: i whitikiria ano he epora rinena ki a Rawiri.
Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ,
15 Heoi ka kawea te aaka a Ihowa e Rawiri ratou ko te whare katoa o Iharaira, me te hamama ano ratou, me te tangi ano te tetere.
mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
16 A, i te taenga o te aaka a Ihowa ki te pa o Rawiri, na ka titiro a Mikara, tamahine a Haora na te matapihi, a ka kite i a Kingi Rawiri e tupekepeke ana, e kanikani ana i te aroaro o Ihowa; a whakahawea ana ia ki a ia i roto i tona ngakau.
Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.
17 Na ka kawea e ratou te aaka a Ihowa, a whakaturia ana ki tona wahi, ki waenganui o te tapenakara i whakaarahia e Rawiri mona: na ka tapaea e Rawiri etahi tahunga tinana ki te aroaro o Ihowa, me etahi whakahere mo te pai.
Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Onyenwe anyị.
18 A, no ka mutu ta Rawiri tapae i nga tahunga tinana, i nga whakahere mo te pai, ka manaakitia e ia te iwi i runga i te ingoa o Ihowa o nga mano.
Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
19 I tuwhaina ano e ia ma te iwi katoa, ma te huihui katoa o Iharaira, ma te tane, ma te wahine, kotahi keke taro ma tenei, ma tenei, me tetahi wahi kikokiko, me tetahi keke karepe maroke. Na haere ana te iwi katoa ki tona whare, ki tona whare.
O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.
20 Katahi a Rawiri ka hoki ki te manaaki i tona whare. A ka puta a Mikara, tamahine a Haora ki te whakatau i a Rawiri, a ka mea, Ano te kororia o te kingi o Iharaira inaianei, i whakakite kirikau nei i a ia inakuanei ki nga kanohi o nga pononga wah ine a ana tangata, pera i tetahi o te hunga wairangi e whakakite nui ana i a ia!
Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”
21 Na ka mea a Rawiri ki a Mikara, I te aroaro ra o Ihowa, i whiriwhiri nei i ahau, i kape nei i tou papa, me tona whare katoa, i whakarite hoki a ahau hei rangatira mo te iwi a Ihowa, mo Iharaira; koia ahau ka takaro ki te aroaro o Ihowa.
Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị.
22 Na ka nui atu ano i tenei toku wairangi, a ka iti iho ahau ki taku titiro; ko nga pononga wahine ia i kiia mai na e koe, ka whakahonoretia ahau e ratou.
E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!”
23 Na kahore he tamariki a Mikara tamahine a Haora a taea noatia te ra i mate ai ia.
Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.

< 2 Hamuera 6 >