< 2 Hamuera 22 >

1 I korerotia e Rawiri ki a Ihowa nga kupu o tenei waiata i te ra i whakaorangia ai ia e Ihowa i te ringa o ona hoariri katoa, i te ringa ano o Haora:
Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
2 I mea ia, Ko Ihowa toku teko, toku pourewa, ko toku kaiwhakaora hoki ia, ae ra ko toku;
Ọ sịrị: “Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
3 Ko te Atua toku kamaka, ka whakawhirinaki ahau ki a ia; ko toku whakangungu rakau, ko te haona o toku whakaoranga, ko toku pa tiketike, ko toku rerenga atu; e toku kaiwhakaora, whakaorangia ana ahau e koe i te tutu.
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.
4 Ka karanga ahau ki a Ihowa e tika nei kia whakamoemititia: a ka whakaorangia ahau i oku hoariri.
“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
5 I karapotia ahau e nga ngaru o te mate, i whakawehia ahau e nga waipuke o te kino.
Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
6 I roritia ahau e nga taura a te reinga: potaea ana ahau e nga mahanga a te mate. (Sheol h7585)
Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
7 I karanga ahau ki a Ihowa i toku paweratanga, ae ra, i karanga ahau ki toku Atua: a i whakarongo ia ki toku reo i roto i tona temepara, i tae hoki taku hamama ki ona taringa.
“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, akpọkuru m Chineke m. Akwa m ruru ya ntị. O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
8 Na ka ngaueue te whenua, ka ru; wiri ana nga putake o nga rangi, ngaueue ana, no te mea e riri ana ia.
Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
9 I kake he paowa i ona pongaponga, a ka kai te kapura o roto o tona mangai: ngiha ana nga waro.
Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
10 I whakapingoretia e ia nga rangi, a ka heke iho: a i raro te pouri kerekere i ona waewae.
O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
11 Na ka eke ia ki te kerupa, a rere ana: ina, i kitea ia i runga i nga parirau o te hau.
Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
12 I meinga ano e ia te pouri hei teneti a tawhio noa, nga wai pouri, nga kapua matotoru o te rangi.
O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
13 Ngiha ana nga waro i te wherikotanga o tona aroaro.
Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.
14 Papa ana te whatitiri a Ihowa i nga rangi; puaki ana te reo o te Runga Rawa.
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
15 Kokiritia mai ana e ia nga pere, a marara ana ratou; he uira, a ka whati ratou.
Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
16 Na ka kitea nga takere o te moana, ka takoto kau nga putake o te ao i te whakatupehupehunga a Ihowa, i te whenunga o te manawa o ona pongaponga.
E kpughere ala ala nke oke osimiri. Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba nke Onyenwe anyị, na nkuume si nʼimi ya pụta.
17 I tono karere mai ia i runga, ka mau ki ahau; kumea ake ahau e ia i roto i nga wai maha.
“O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
18 Nana ahau i whakaora i toku hoariri kaha, i te hunga e kino ana ki ahau: he kaha rawa hoki ratou i ahau.
Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
19 Huakina tatatia ana ahau e ratou i te ra o toku matenga: ko Ihowa ia toku whakawhirinakitanga.
Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
20 A whakaputaina ana ahau e ia ki te wahi whanui: i whakaorangia ahau e ia, no te mea i whakaahuareka ia ki ahau.
Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
21 Rite tonu ki taku mahi tika ta Ihowa utu ki ahau; rite tonu ki te ma o oku ringa tana i whakahoki mai ai ki ahau.
“Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
22 I pupuri hoki ahau i nga ara a Ihowa; a kihai i he, i whakarere i toku Atua.
Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị; ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
23 Kei mua tonu hoki i ahau ana whakaritenga katoa; a, ko ana tikanga, kihai era i matara atu i ahau.
Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
24 I tu tika ano ahau ki tona aroaro: i tiaki ano i ahau kei kino.
Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
25 No reira i homai ai e Ihowa he utu ki ahau, rite tonu ki toku tika; rite tonu ki toku ma ki tana titiro.
Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya.
26 He tangata atawhai, ka atawhai ano koe; he tangata tika, ka tika ano koe.
“Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
27 He tangata ma, ka ma ano koe; he tangata whakakeke, he whakakeke hoki tau mahi.
Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
28 E whakaorangia hoki e koe te iwi e tukinotia ana: kei runga ia ou kanohi i te hunga whakakake, kia whakahokia iho ratou e koe ki raro.
Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.
29 Ko koe hoki toku rama, e Ihowa: ma Ihowa e whakamarama toku pouri.
Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m, Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
30 Nau hoki ahau i rere ai ki runga ki te ropu: na toku Atua ka peke ahau i te taiepa.
Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
31 Tena ko te Atua, tika tonu tona ara; he parakore te kupu a Ihowa; he whakangungu rakau ia ki te hunga katoa e whakawhirinaki ana ki a ia.
“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
32 Ko wai oti te Atua, ki te kahore a Ihowa? Ko wai hoki te kamaka, ki te kahore to tatou Atua?
Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?
33 Ko te Atua toku pa kaha: ko ia hei arahi i te hunga tika i tona ara.
Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
34 Ko ia nei hei mea i oku waewae kia rite ki o te hata: mana hoki ahau e whakatu ki runga ki oku wahi tiketike.
Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
35 Ko ia hei whakaako i oku ringa ki te whawhai; hei mea i oku ringa kia whakapiko i te kopere parahi.
Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
36 Kua homai hoki e koe ki ahau te whakangungu rakau o tau whakaoranga; whakanuia ana ahau e tou whakaaro mahaki.
Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
37 I whakanuia e koe oku takahanga i raro i ahau, te paheke oku waewae.
Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
38 Kua arumia e ahau oku hoariri, a huna iho ratou e ahau: kihai ano ahau i tahuri, a moti noa ratou.
“Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha. Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
39 Moti iho ratou i ahau, mongamonga noa, te ahei te whakatika: ina, hinga ana ratou ki raro i oku waewae.
Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ.
40 Nau hoki ahau i whitiki ki te kaha mo te whawhai: piko ana i a koe ki raro i ahau te hunga i whakatika mai ki ahau.
Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha. I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
41 Kua meinga hoki e koe kia hurihia mai e oku hoariri o ratou tuara ki ahau, kia huna e ahau te hunga e kino ana ki ahau.
I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile.
42 I tirotiro ratou, heoi kahore he kaiwhakaora: ki a Ihowa rawa, heoi kihai ia i whakahoki kupu ki a ratou.
Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
43 Na tukia ana ratou e ahau, a rite noa ki te puehu o te whenua: mohungahunga noa ratou i ahau, me te mea he paru no nga huarahi; a titaritaria ana ratou e ahau.
Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
44 Nau hoki ahau i ora ai i nga ngangautanga a toku iwi; nau ahau i tiaki hei upoko mo nga tauiwi: hei apa moku te iwi kahore nei i matauria e ahau.
“Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ. Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba. Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
45 Ka tuku mai nga tangata iwi ke ki raro i ahau: kia rongo kau te taringa, kakama tonu mai ratou ki ahau.
Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
46 Ka memeha haere nga tangata iwi ke: ka puta wehi mai hoki i roto i o ratou kuhunga.
Obi na-ada ha mba. Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
47 E ora ana a Ihowa, kia whakapaingia toku kamaka: kia whakanuia te Atua o te kamaka o toku whakaoranga:
“Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.
48 Ara te Atua e rapu nei i te utu moku, e pehi nei i te iwi ki raro i ahau,
Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.
49 E whakaputa nei i ahau i roto i oku hoariri: ae ra, e mea ana koe i ahau kia teitei ake i te hunga e whakatika mai ana ki ahau: whakaorangia ana ahau e koe i te tangata tutu.
Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
50 Mo konei ka whakawhetai ahau ki a koe, e Ihowa, i roto i nga tauiwi, ka himene ki tou ingoa.
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto.
51 He pourewa whakaora ia ki tana kingi; e whakaputa aroha ana ki tana tangata i whakawahi ai, ki a Rawiri ratou ko ona uri ake ake.
“Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu. Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere. Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”

< 2 Hamuera 22 >