< 2 Kingi 20 >

1 I aua ra ka mate a Hetekai, whano marere, Na ka tae mai a Ihaia poropiti tama a Amoho ki a ia, ka mea ki a ia, Ko te kupu tenei a Ihowa, Whakahaua iho tou whare; no te mea ka mate koe, kahore e ora.
Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma nwa Emọz bịakwutere ya sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
2 Katahi ka tahuri tona mata ki te pakitara, ka inoi ki a Ihowa, ka mea,
Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ, kpee ekpere nye Onyenwe anyị, sị,
3 Tena ra, e Ihowa, kia mahara ki oku haereerenga i tou aroaro i runga i te pono, i te ngakau tapatahi, ki taku meatanga i te pai ki tau titiro. Na tangi ana a Hetekia, nui atu te tangi.
“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
4 Na kahore ano a Ihaia kia puta noa ki waenganui o te pa, kua puta mai te kupu a Ihowa ki a ia, kua mea,
Tupu Aịzaya esite nʼetiti ogige ụlọeze pụọ, okwu nke Onyenwe anyị rutere ya ntị, sị ya:
5 Hoki atu, mea atu ki te rangatira o taku iwi, ki a Hetekia, Ko te kupu tenei a Ihowa, a te Atua o Rawiri, o tou tupuna, Kua whakarangona tau inoi e ahau, a kua kite ahau i ou roimata: nana, me whakaora koe e ahau: hei te toru o nga ra ka haere ko e ki runga, ki te whare o Ihowa.
“Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
6 Ka tapiritia ano e ahau ou ra ki nga tau kotahi tekau ma rima: a ka whakaorangia koe me tenei pa e ahau i te ringa o te kingi o Ahiria; a ka tiakina e ahau tenei pa, he whakaaro ki ahau ano, ki taku tangata hoki, ki a Rawiri.
Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’”
7 I ki ano hoki a Ihaia, Tikina he papa piki. Na tikina ana e ratou, whakapakia ana ki te whewhe, na kua ora ia.
Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma.
8 Na ka mea a Hetekia ki a Ihaia, He aha te tohu moku ka whakaorangia ahau e Ihowa? moku ka haere i te toru o nga ra ki te whare o Ihowa?
Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na Onyenwe anyị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?”
9 Ano ra ko Ihaia, Ko te tohu tenei a Ihowa ki a koe, ka oti i a Ihowa tana kupu i korero ai ia: kia tekau ranei nga nekehanga e neke atu ai te atarangi; kia tekau ranei nga whakahokinga e hoki ai?
Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?”
10 Ano ra ko Hetekia, He mea noa iho kia tekau nga nekehanga e neke atu ai te atarangi; erangi kia tekau nga nekehanga e hoki ai te atarangi ki muri.
Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.”
11 Katahi a Ihaia poropiti ka karanga ki a Ihowa, a whakahokia ana e ia te atarangi, tekau nga nekehanga, o nga nekehanga i heke iho ai i te whakaatu haora a Ahata.
Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ Onyenwe anyị ka o meere Hezekaya nke a. Onyenwe anyị mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.
12 I taua wa ka tukua e Peroraka Pararana, tama a Pararana kingi o Papurona he pukapuka me tetahi hakari ki a Hetekia: no te mea i rongo ia i te mate a Hetekia.
Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa.
13 A i whakarongo a Hetekia ki a ratou, whakakitea ana e ia ki a ratou te whare katoa o ana mea papai, te hiriwa, te koura, nga kinaki kakara, te hinu utu nui, me te whare o ana mea mo te whawhai me nga mea katoa i rokohanga ki roto ki ona taonga: kahore tetahi mea o tona whare, o tona kingitanga katoa, i kore te whakakitea e Hetekia ki a ratou.
Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ gosi ha ihe niile dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ na ezigbo mmanụ oliv, ụlọ ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.
14 Katahi ka haere mai a Ihaia poropiti ki a Kingi Hetekia, ka mea ki mai hoki ratou ki a koe i hea? Ano ra ko Hetekia, i haere mai ratou i te whenua hoi, i Papurona.
Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si, ha si Babilọn.”
15 Ano ra ko tera, He aha nga mea i kitea e ratou ki tou whare? Ka whakahokia e Hetekia, Kua kitea e ratou nga mea katoa i toku whare: kahore tetahi mea o oku taonga i kore te whakakitea e ahau ki a ratou.
Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?” Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.”
16 Na ka mea a Ihaia ki a Hetekia, Whakarongo ki te kupu a Ihowa.
Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị.
17 Nana, kei te haere mai nga ra e kawea ai nga mea katoa o tou whare, me nga mea kua rongoatia nei e ou matua taea noatia tenei ra, ki Papurona: e kore tetahi mea e mahue, e ai ta Ihowa.
Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
18 A ka tangohia e ratou etahi o au tama e puta mai i roto i a koe, e whanau mau; a hei unaka ratou i roto i te whare o te kingi o Papurona.
A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.”
19 Ano ra ko Hetekia ki a Ihaia, He pai te kupu a Ihowa i korerotia mai na e koe. I mea ano hoki ia, Ehara oti i te pai ki te mau te rongo me te pono i oku ra?
Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụ na udo na nchekwa agaghị adị nʼoge ndụ m?”
20 Na, ko era atu meatanga a Hetekia me ana mahi toa katoa, me tana hanganga i te puna, i te awakeri, a whakaputaina ana e ia he wai ki te pa, kihai ianei ena i tuhituhia ki te pukapuka o nga meatanga o nga ra o nga kingi o Hura?
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, ọrụ niile ọ rụrụ, tinyere ọdọ mmiri o gwuru, na olulu ọwa mmiri na-aga o gwuru, nke o ji webata mmiri nʼime obodo, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
21 Na ka moe a Hetekia ki ona matua, a ko tana tama, ko Manahi, te kingi i muri i a ia.
Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

< 2 Kingi 20 >