< 1 Timoti 3 >

1 He pono te korero, Ki te hiahia tetahi ki te mahi pihopa, e hiahia ana ia ki te mahi pai.
Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma.
2 Na, ko te tikanga tenei, kia kaua te pihopa e ekengia e te kupu, he tahu no te wahine kotahi, kia ngawari, kia whai whakaaro, kia marama ana tikanga, kia atawhai ki nga manuhiri, kia whai ngakau ki te whakaako:
Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe.
3 Kia kaua e kakai waina, kia kaua e patu; engari kia ngawari, kaua e totohe, kaua e matenui ki te moni;
Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya.
4 Kai pai tana tohutohu i tona whare; e mea ana i ana tamariki kia ngohengohe ki a ia, kia nui te mahara:
Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla.
5 Ki te kore hoki tetahi tangata e matau ki te tohutohu i tona whare ake, me pehea ka tiaki ai ia i te hahi a te Atua?
(Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?)
6 Kauaka i te tauhou, kei whakakake, a ka tau to te rewera he ki a ia.
Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu.
7 A kia pai te korero mona a te hunga o waho; kei taka ia ki te whakahawea, ki roto hoki ki te mahanga a te rewera.
Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu.
8 Waihoki ko nga rikona kia tu kaumatua, kaua e arero rua, kaua e matenui ki te waina, kaua e whai ki te taonga paruparu;
Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi.
9 Kia ma o ratou hinengaro e mau ai ki te mea ngaro o te whakapono.
Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.
10 Na, kia matua whakamatautauria enei; katahi ka tuku ai kia mahi i a te rikona mahi, ki te kore he whakahe mo ratou.
Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.
11 Ko nga wahine hoki kia ahua kaumatua, kaua e ngautuara, kia whai mahara, kia pono i nga mea katoa.
Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.
12 Ko nga rikona, kia kotahi te hoa wahine; kia pai te tohutohu i a ratou tamariki, i o ratou whare ake ano hoki.
Ndị niile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere naanị otu nwunye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinaụlọ nke aka ha nke ọma.
13 Ki te pai hoki ta ratou mahi rikona, ka whiwhi ratou ki te turanga pai mo ratou, ka nui hoki to ratou maia i runga i te whakapono ki a Karaiti Ihu.
Nʼihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkwuwa okwu ha nwere banyere okwukwe a nʼime Kraịst Jisọs.
14 He tuhituhi atu tenei naku i enei mea ki a koe, e mea ana hoki tera ahau e haere wawe atu ki a koe:
Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a.
15 Ki te roa ia ahau, kia matau ai koe ki te tikanga mo tau mahi i roto i te whare o te Atua, ko te hahi nei ia a te Atua ora, ko te pou, ko te turanga o te pono.
Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ.
16 Na, kahore rawa e tautohetia te nui o te mea ngaro e karakiatia nei: Ko ia i whakakitea mai i roto i te kikokiko, he mea whakatika na te Wairua, i kitea e nga anahera, i kauwhautia nei i roto i nga tauiwi, i whakaponohia nei i te ao, i tangohia atu ki te kororia.
Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.

< 1 Timoti 3 >