< 1 Hamuera 30 >

1 A, no ka tae a Rawiri ratou ko ana tangata ki Tikiraka i te toru o nga ra, na kua huaki nga Amareki ki te tonga, ki Tikiraka ano, patua ana a Tikiraka e ratou, tahuna ake ki te ahi;
Mgbe Devid na ndị ikom ya rutere obodo Ziklag nʼụbọchị nke atọ, ha hụrụ na ndị Amalek abịala wakporo bi nʼakụkụ ndịda Negev na Ziklag. Ha buru agha megide Ziklag, gbaa obodo ahụ ọkụ,
2 Whakaraua ana hoki e ratou nga wahine me nga mea o reira, te iti, te rahi; kihai i whakamatea tetahi, engari i kahakina atu, a haere ana i to ratou ara.
dọtakwa ndị inyom na ndị niile bi nʼime ya nʼagha, ma okenye ma ụmụntakịrị. Ha egbughị ha egbu, kama ha buuru ha laa.
3 Heoi, i te taenga o Rawiri ratou ko ana tangata ki te pa, kua oti te tahu ki te ahi, a kau whakaraua atu a ratou wahine, a ratou tama, a ratou tamahine.
Mgbe Devid na ndị ikom ya ruru Ziklag, ha hụrụ na-esuola ya ọkụ, dọkpụrụ ndị inyom ha, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼagha.
4 Katahi ka puaki te reo o Rawiri ratou ko ana tangata, tangi ana ratou, a kahore noa o ratou kaha ki te tangi.
Ya mere, Devid na ndị ikom ya kwara akwa ruo mgbe ike akwa gwụrụ ha.
5 I riro whakarau ano nga wahine tokorua a Rawiri, a Ahinoama o Ietereere, raua ko Apikaira wahine a Napara o Karamere.
Ndị inyom abụọ Devid, Ahinoam onye Jezril na Abigel, nwunye ochie Nebal onye Kamel, sokwa na ndị a dọtara nʼagha ahụ.
6 Na mamae rawa a Rawiri, no te mea i kupukupu te nuinga kia akina ia ki te kohatu; i mamae hoki te ngakau o te iwi katoa, o tera, o tera, ki a ratou tama, ki a ratou tamahine: ko Rawiri ia i whakapakari i a ia i roto i a Ihowa, i tona Atua.
Ihe a wetaara Devid oke nsogbu, nʼihi na ndị ikom ya nọ na-ekwu okwu iji nkume tugbuo ya; ha niile nọ nʼobi ilu nʼihi ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ma Devid chọtara ike nʼime Onyenwe anyị Chineke ya.
7 Na ka mea a Rawiri ki a Apiatara tohunga, tama a Ahimereke, Tena, maua mai te epora ki ahau. Na maua ana te epora e Apiatara ki a Rawiri.
Devid sịrị Abịata, bụ onye nchụaja, nwa Ahimelek, “Chịtara m efọọd ahụ.” Ya mere, Abịata chịtara ya nye ya
8 Na ka ui a Rawiri ki a Ihowa, ka mea, Ki te whai ahau i tenei taua e mau ranei ratou i ahau? Na ka mea ia, Whaia; ka mau pu hoki ratou i a koe, a ka riro katoa mai au i a koe.
Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m chụso ndị a na-apụnara ndị mmadụ ihe? Ọ bụrụ na m achụso ha, aga m ejide ha?” Onyenwe anyị zara, “E, chụso ha ọsọ, ị ga-achụkwute ha, ma nataghachikwa ihe niile ha were.”
9 Heoi haere ana a Rawiri ratou ko ana tangata e ono rau, kua tae ki te awa, ki Pehoro, ki te wahi i noho ai te hunga i mahue iho.
Mgbe ahụ, Devid na narị ndị agha isii ya bịarutere nʼọdọ mmiri Beso, ebe ha hapụrụ ụfọdụ ndị
10 Otiia whai tonu ana a Rawiri ratou ko nga tangata e wha rau: e rua hoki nga rau i noho; i ruha rawa hoki, te whiti ai i te awa, i Pehoro.
narị ndị ikom abụọ nʼime ha enwekwaghị ike ịgafe ndagwurugwu Beso nʼihi ike ọgwụgwụ, ma Devid na narị anọ ndị ọzọ chụsoro ha.
11 Na ka tupono atu ratou ki tetahi tangata o Ihipa i te parae, a kawea ana ia ki a Rawiri. Na ka hoatu he taro mana, a kai ana ia; i whakainu ano ratou i a ia ki te wai.
Ha hụrụ otu nwokorobịa onye Ijipt nʼọhịa, duuru ya bịakwute Devid. Ha nyere ya mmiri ka ọ ṅụọ, nyekwa ya nri ka o rie.
12 I hoatu ano e ratou tetahi wahi o te keke piki me etahi tautau karepe e rua, na ka kai ia, a ka hoki tona wairua ki a ia; e toru hoki nga ra, e toru nga po ona kihai nei ia i kai i te kai, kihai i inu i te wai.
Ihe ha nyere ya bụ achịcha fiig, na ụyọkọ mkpụrụ vaịnị abụọ nke a mịkpọrọ amịkpọ. Mgbe o richara ha, o nweghachiri onwe ya, nʼihi na o ribeghị nri ọbụla, maọbụ ṅụọ mmiri ọbụla ụbọchị atọ, ehihie na nʼabalị.
13 Na ka mea a Rawiri ki a ia, Na wai koe? no hea hoki koe? Ano ra ko ia, He tamaiti ahau no Ihipa, he pononga na tetahi Amareki; i whakarerea hoki ahau e toku ariki, he panga noku e te mate ka toru enei ra.
Mgbe ahụ, Devid jụrụ ya sị, “Ị bụ onye? Ebeekwa ka i si bịa?” Ọ zara Devid sị, “Abụ m onye Ijipt, bụrụkwa ohu onye Amalek. Onyenwe m hapụrụ m nʼebe a abalị atọ gara aga nʼihi na ahụ adịghị m ike.
14 I huakina e matou te tonga o nga Kereti, me te wahi i a Hura, me te tonga o Karepe; i tahuna ano e matou a Tikiraka ki te ahi.
Anyị si obodo ebe anyị gara lụọ agha na-alọghachi mgbe ha hapụrụ m nʼebe a. Anyị gara lụgbuo obodo ndị Keret, nke dị nʼime Negeb, na obodo dị na ndịda ala Juda na ala Kaleb. Anyị gbakwara obodo Ziklag ọkụ.”
15 Na ka mea a Rawiri ki a ia, E taea ranei ahau te kawe e koe ki raro, ki te ope ra? Ano ra ko ia, Oati mai ki ahau ki te Atua hoki, e kore ahau e whakamatea e koe, e kore e tukua ki nga ringa o toku rangatira, a ka kawea koe e ahau ki raro ki tau a ope.
Devid jụrụ ya sị, “I nwere ike duru m gaa ebe ha nọ.” Nwokorobịa ahụ zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke na ị gaghị egbu m maọbụ were m nyeghachi onyenwe m, aga m eduru gị gaa ebe ha nọ.”
16 A, no tana kawenga i a ia ki raro, kua wawa noa atu ratou ki te mata o te whenua katoa, e kai ana, e inu ana, e kanikani ana, mo nga taonga nui katoa, taonga parakete, i riro i a ratou i te whenua o nga Pirihitini, i te whenua hoki o Hura.
O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda.
17 Na patua iho ratou e Rawiri i te puaotanga a taea noatia te ahiahi o te aonga ake: kihai hoki tetahi o ratou i mawhiti, heoi ano ko etahi taitamariki e wha rau i eke ki nga kamera, a rere ana.
Devid na ndị agha ya bịakwasịrị ha na mberede gbuo ha site nʼabalị ahụ ruo anyasị echi ya. Ọ dịkwaghị otu nwoke nʼime ha fọdụrụ ndụ ma ọ bụghị narị ndị ikom anọ makwasịrị nʼelu ịnyịnya kamel ha gbalaga.
18 I riro ano hoki i a Rawiri nga mea katoa i tangohia e nga Amareki: i riro ano i a Rawiri ana wahine tokorua.
Devid nwetaghachiri ihe niile ndị Amalek kwatara nʼagha, tinyere ndị inyom ya abụọ.
19 Kihai hoki i ngaro tetahi o a ratou mea; te iti, te rahi, nga tama, nga tamahine, nga taonga parakete, nga mea katoa i tangohia e ratou; i hoki katoa mai a Rawiri.
O nweghị ihe furu efu, ma nke ukwu ma nke nta, ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ihe a kwatara nʼagha, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ndị Amalek dọtara nʼagha. Devid nwetaghachiri ihe niile.
20 I mau ano i a Rawiri nga hipi katoa me nga kahui; a ka arahina e ratou i mua i era atu karerehe, i mea, Ko te taonga parakete tenei a Rawiri.
Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.”
21 A ka tae a Rawiri ki nga tangata e rua rau i ruha nei, kihai nei i aru i a Rawiri, i meinga ra kia noho ki te awa, ki Pehoro: ka puta ratou ki te whakatau i a Rawiri, ki te whakatau hoki i te iwi i a ia: a ka tata a Rawiri ki aua tangata, ka oha ia ki a ratou.
Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere.
22 Katahi ka oho ake te hunga kino katoa, nga tangata o Periara i roto i te hunga i haere tahi ratou ko Rawiri, ka mea, Kihai ratou i haere tahi tatou, na, e kore e hoatu ki a ratou etahi o nga taonga i rio mai i a tatou, heoi ano ko te wahine me n ga tamariki a tenei, a tenei, na ma ratou e arahi atu, e haere.
Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.”
23 Katahi a Rawiri ka mea, Kaua e pena, e oku teina, ki ta Ihowa i homai ai ki a tatou; nana nei hoki tatou i tiaki, a homai ana e ia ki a tatou ringa taua ope i haere ake ra ki a tatou.
Ma Devid sịrị, “Mba, ụmụnna m, unu ekwesighị isi otu a kee ihe ndị ahụ Onyenwe anyị nyere anyị. O chebere anyị, nyefee nʼaka anyị ndị agha ahụ niile bịara imegide anyị.
24 Ko wai hoki hei whakarongo ki tenei mea a koutou? Ko te wahi hoki a te tangata i haere ki te whawhai kia rite ki te wahi a te tangata i noho ki nga mea: kia rite tonu te wahi ma ratou.
Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.”
25 Na waiho tonu iho e ia tena hei tikanga, hei ritenga mo Iharaira no taua rangi a tuku iho ki tenei ra.
Site nʼụbọchị ahụ, Devid mere ka nke a bụrụ iwu nye ndị Izrel niile ruo taa.
26 A, i te taenga o Rawiri ki Tikiraka, ka tonoa e ia etahi o nga taonga ki nga kaumatua o Hura, ki ona hoa, a ka mea, Tena tetahi manaaki mo koutou no nga taonga a nga hoariri o Ihowa;
Mgbe ha rutere Ziklag, Devid weere ụfọdụ ihe ha kwatara nʼagha zigara ndị okenye Juda, ndị bụ ndị enyi ya, na-asị, “Lee onyinye ewetaara unu site nʼụfọdụ nʼime ihe anyị kwatara site nʼaka ndị iro Onyenwe anyị.”
27 Ki nga tangata hoki o Peteere, ki o Ramoto ki te tonga, ki era hoki i Iatiri;
O zigara ha nye ndị bi na Betel, Ramọt Negev na Jatịa,
28 Ki a Aroere, ki o Hipimoto, ki o Ehetemoa.
nyekwa ndị nọ Aroea, Sifmot, Eshtemoa
29 Ki o Rakara, ki o nga pa o nga Ierameeri, ki o nga pa o nga Keni;
na Rakal, nyekwa ndị bi nʼobodo ndị Jerameel na nke ndị Ken,
30 Ki o Horema, ki o Korahana, ki o Ataka;
nyekwa ndị bi na Homa, Bo Ashan, Atak
31 Ki o Heperona, ki o nga wahi katoa i haereere ai a Rawiri ratou ko ana tangata.
na Hebrọn na ndị nọ nʼebe niile ndị ahụ ebe Devid na ndị ya wagharịrị.

< 1 Hamuera 30 >