< 1 Kingi 19 >

1 Na ka korerotia e Ahapa ki a Ietepere nga mea katoa i mea ai a Iraia, me nga meatanga katoa i tana whakamatenga i nga poropiti katoa ki te hoari.
Ehab kọọrọ Jezebel ihe niile Ịlaịja mere, na otu o si jiri mma agha gbuo ndị amụma Baal niile.
2 Katahi a Ietepere ka tono tangata ki a Iraia hei ki atu, Kia meatia tenei ki ahau e nga atua, me etahi atu mea, ki te kahore ahau e mea i a koe i tenei takiwa apopo kia rite te mate ki tetahi o ratou i mate ra.
Nʼihi nke a, Jezebel zigara onyeozi ka ọ ga zie Ịlaịja sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, nʼagbanyeghị otu mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na oge dịka oge a echi, egbughị gị dịka i si gbuo ndị amụma Baal.”
3 A ka kite ia, na whakatika ana, haere ana, he mea kei mate, a ka tae ki Peerehepa o Hura. Na ka whakarerea e ia tana tangata ki reira.
Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ.
4 Ko ia ia i haere ki te koraha, kotahi te ra ki te ara, a ka tae, ka noho i raro i tetahi hunipa: a ka inoi ia mona kia mate ia; a ka mea, Heoi ra, inaianei, e Ihowa, tangohia atu toku wairua; kahore hoki ahau i pai ake i oku matua.
Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.”
5 Na ka takoto ia, ka moe i raro i tetahi hunipa; na, ko tetahi anahera e papaki ana i a ia, e mea ana ki a ia, Maranga ki te kai.
O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.”
6 Na titiro rawa ake ia, ko tetahi keke, he mea tunu ki te pungarehu, me tetahi ipu wai i tona urunga. Na kai ana ia, inu ana, a takoto iho ana ano.
Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ.
7 Na ka hoki mai ano te anahera a Ihowa, a ka papaki i a ia, ka mea, Maranga ki te kai; he roa rawa hoki te ara mou, e kore e taea e koe.
Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.”
8 Na maranga ana ia, a kai ana, inu ana, a haere ana, me te mau ano te mana o taua kai, e wha tekau nga ra, e wha tekau nga po a tae noa ki Horepa, ki te maunga o te Atua.
Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.
9 Na haere ana ia ki reira ki tetahi ana, a moe ana i reira. Na ka puta mai te kupu a Ihowa ki a ia; i mea ia, E aha ana koe i konei, e Iraia?
Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
10 A ka mea tera, Nui atu toku hae mo Ihowa, mo te Atua o nga mano; kua whakarerea hoki tau kawenata e nga tama a Iharaira, a ko au aata, wahia iho e ratou, patua iho hoki e ratou au poropiti ki te hoari; a ko ahau, ko ahau rawa anake i mahue; a ke i te rapu ratou i ahau kia whakamatea.
Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
11 Na ka mea ia, Puta mai, ka tu ki te maunga ki te aroaro o Ihowa. Na ko te haerenga atu o Ihowa, he nui ano te hau, he kaha, e whakakoara ana i nga maunga, e wahi ana i nga kohatu i te aroaro o Ihowa; otiia kahore a Ihowa i roto i te hau: a muri iho i te hau ko te ru; otiia kahore a Ihowa i roto i te ru:
Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ.
12 A i muri o te ru ko te ahi; otiia kahore a Ihowa i roto i te ahi: a i muri i te ahi ko te reo ngawari, he mea iti.
Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara.
13 A, no te rongonga o Iraia ka hipokina e ia tona mata ki tona koroka, a haere ana, tu ana i te kuwaha o te ana. Na ko te putanga mai o tetahi reo ki a ia, ka mea, E aha ana koe i konei, e Iraia?
Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
14 Ano ra ko tera, Nui atu toku hae mo Ihowa, mo te Atua o nga mano; kua whakarerea hoki tau kawenata e nga tama a Iharaira, ko au aata, wahia iho e ratou, patua iho e ratou au poropiti ki te hoari; a ko ahau, ko ahau rawa anake i mahue; a kei te r apu ratou i ahau kia whakamatea.
Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
15 Na ka mea a Ihowa ki a ia, Haere, e hoki i tou ara ki te koraha o Ramahiku; a ka tae koe, whakawahia a Hataere hei kingi mo Hiria.
Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram.
16 A whakawahia a Iehu tama a Nimihi hei kingi mo Iharaira; me whakawahi ano a Eriha tama a Hapata o Aperemehora hei poropiti i muri i a koe.
Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị.
17 Na, ko te hunga e mawhiti i te hoari a Hataere ma Iehu e whakamate; ko te hunga e mawhiti i te hoari a Iehu ma Eriha e whakamate.
Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu.
18 Otiia ka whakatoea e ahau maku e whitu nga mano i roto i a Iharaira, ko nga turi katoa kihai ano i tuturi ki a Paara, me nga mangai katoa kihai i kihi i a ia.
Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.”
19 Heoi haere atu ana ia i reira, a ka tupono ki a Eriha tama a Hapata, e parau ana ia, me nga kau i nga ioka kotahi tekau ma rua i tona aroaro, ko ia i te tekau ma rua: na haere ana a Iraia i tona taha, a maka ana e ia tona koroka ki runga ki a ia.
Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya.
20 Na whakarerea ake e tera nga kau, a rere ana ki te whai i a Iraia, a ka mea, Tukua ahau kia kihi i toku papa, i toku whaea, ka haere ai ki te whai i a koe. Ano ra ko tera ki a ia, Haere, e hoki: i aha hoki ahau ki a koe?
Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.” Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?”
21 Na hoki ana tera i te whai i a ia, a ka mau ki nga kau o tetahi ioka, patua iho, kohuatia iho o raua kikokiko ki nga mea o nga kau, hoatu ana e ia te kikokiko ki nga tangata, a kainga ana e ratou. Na whakatika ana ia, haere ana ki te whai i a Ir aia, a mahi ana ki a ia.
Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya.

< 1 Kingi 19 >