< 2 Tantara 17 >

1 Ary Josafata, zanak’ i Asa, no nanjaka nandimby azy, ary nitombo hery hiaro tena tamin’ ny Isiraely izy.
Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya, o mere onwe ya ka ọ dị ike imegide Izrel.
2 Ary namponina miaramila tamin’ ny tanàna mimanda rehetra eran’ i Joda izy sady nametraka miaramila tany amin’ ny tany Joda sy tany amin’ izay tanànan’ ny Efraima efa azon’ i Asa rainy.
O tinyere ụfọdụ ndị agha ya nʼobodo niile dị na Juda e wusiri ike, tinyekwa ụfọdụ nʼobodo ndị ọzọ dị nʼIfrem, na ebe ndị ọzọ niile nke nna ya, Asa meriri nʼagha.
3 Ary Jehovah nomba an’ i Josafata, satria nandeha tamin’ ny nalehan’ i Davida rainy izy, dia ilay tamin’ ny voalohany, fa tsy mba nitady ireo Bala;
Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal,
4 fa Jehovah, Andriamanitry ny rainy, kosa no notadiaviny, ary araka ny didiny no nalehany, fa tsy mba araka ny fanaon’ ny Isiraely.
kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.
5 Koa dia nampitoerin’ i Jehovah teo an-tànany ny fanjakana; ary ny Joda rehetra nitondra fanomezana ho an’ i Josafata, ka dia nanana harena sy voninahitra be izy.
Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.
6 Ary ny fony nihanatoky tamin’ ny lalan’ i Jehovah, dia noravany tsy ho eo amin’ ny Joda ny fitoerana avo sy ny Aseraha.
O ji obi ya niile gbasoo ụzọ Onyenwe anyị. Ọzọkwa, o sitere na Juda wezuga ebe niile dị elu nakwa ogidi Ashera niile.
7 Ary tamin’ ny taona fahatelo nanjakany dia naniraka ny mpanapaka izy, dia Benaila sy Obadia sy Zakaria sy Netanela ary Mikaia, hampianatra tany amin’ ny tanànan’ ny Joda,
Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o zipụrụ ndịisi ọchịchị alaeze ya ndị a, Ben-Hail, Ọbadaya, Zekaraya, Netanel na Mikaya ka ha gaa zie ndị mmadụ ihe nʼobodo niile nke Juda.
8 Ary nisy Levita koa niaraka tamin’ ireo, dia Semaia sy Netania sy Zebadia sy Asahela sy Semiramota sy Jonatana sy Adonia sy Tobia ary Tob-adonia, Levita, mbamin’ i Elisama sy Jorama, mpisorona.
Ụfọdụ ndị Livayị ndị a sokwa gaa: Shemaya, Netanaya, Zebadaya, Asahel, Shemiramot, Jehonatan, Adonaịja, Tobaija, Tob-Adonaịja na ndị nchụaja ụfọdụ, ndị dị ka Elishama na Jehoram.
9 Ary nampianatra tany Joda izy ireo, ka nentiny ny bokin’ ny lalàn’ i Jehovah, dia nitety ny tanànan’ ny Joda rehetra izy ka nampianatra teny amin’ ny olona.
Ha ji akwụkwọ iwu Onyenwe anyị, zie ihe na Juda. Ha jere gburugburu obodo niile nke Juda na-ezi ndị mmadụ ihe.
10 Ary ny tahotra an’ i Jehovah nahazo ny fanjakana rehetra tamin’ ny tany manodidina an’ i Joda, ka dia tsy nisy niady tamin’ i Josafata ireo.
Egwu Onyenwe anyị dakwasịrị alaeze niile dị gburugburu Juda, nʼihi ya, ha ebukwaghị agha megide Jehoshafat.
11 Ary ny Filistina sasany nitondra fanomezana sy vola hetra ho an’ i Josafata; ary ny Arabo koa nitondra ondry aman’ osy, dia ondrilahy fiton-jato amby fito arivo sy osilahy fiton-jato amby fito arivo.
Ụfọdụ nʼime ndị Filistia wetaara ya onyinye na ọlaọcha kwa afọ nʼụzọ ịkwanyere ya ugwu, ma ndị Arab, wetaara ya igwe anụ ụlọ dị puku ebule asaa na narị asaa, na puku mkpi asaa na narị asaa.
12 Ary Josafata nihanahery indrindra ka nanao trano fiarovana sy tanàna fitehirizana tany Joda.
Ya mere, Jehoshafat ghọrọ eze dị ike. O wusiri obodo ndị dị na Juda ike, wukwaa obodo ịchịkọba ihe.
13 Ary nanana fananana betsaka tao amin’ ny tanànan’ ny Joda koa sy miaramila, lehilahy mahery, tany Jerosalema izy.
O nwekwara ihe ndị ọ chịkọbara nʼọtụtụ obodo Juda. O debekwara ndị agha ibu agha doro anya nʼime Jerusalem.
14 Ary izao no nandaminana azy araka ny fianakaviany avy: Ny mpifehy arivo tamin’ ny Joda dia Adna komandy, ary ny fehiny dia lehilahy mahery telo hetsy;
Ngụkọta ha dịka e si dekọọ ya nʼezinaụlọ si dị: Ndị si Juda, ndịisi agha na-achị puku ndị agha, Adna, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha atọ,
15 ary nanarakaraka azy dia Johanana komandy, ary ny fehiny dia valo alina amby roa hetsy;
onye na-eso ya bụ Jehohanan, onyeisi agha, na-achị narị puku ndị agha abụọ na iri puku asatọ,
16 ary nanarakaraka azy indray dia Amasia, zanak’ i Zikry, ilay nanolotena ho an’ i Jehovah, ary ny fehiny dia lehilahy mahery roa hetsy.
ọzọ, Amasiya nwa Zikri, onye ji afọ ofufu nye onwe ya maka ọrụ Onyenwe anyị, na-achị narị puku ndị agha abụọ.
17 Ary tamin’ ny Benjamina dia Eliada, lehilahy mahery, ary ny fehiny dia lehilahy roa hetsy mitondra tsipìka sy ampinga;
Ndị si Benjamin, Eliada, dimkpa nʼagha, na-achị narị puku ndị agha abụọ, ndị ji akụ na ụta, na ọta ebu agha.
18 ary nanarakaraka azy dia Jozabada, ary ny fehiny dia valo alina amby iray hetsy efa voaomana hiady.
Onye ọzọ bụ Jehozabad, onye na-achị narị puku ndị agha na iri puku asatọ, ndị jikeere ibu agha.
19 Ireo no mpitoetra tamin’ ny mpanjaka, afa-tsy izay nampitoerin’ ny mpanjaka tany amin’ ny tanàna mimanda eran’ i Joda rehetra.
Ndị a bụ ndị ikom na-ejere eze ozi, nʼagụnyeghị ndị ahụ o tinyere ka ha nọdụ nʼobodo niile e wusiri ike dị nʼime Juda.

< 2 Tantara 17 >