< 1 Tantara 27 >

1 Ary ny amin’ ny Zanak’ Isiraely araka ny isany, dia ny lohan’ ny fianakaviany sy ny mpifehy arivo sy ny mpifehy zato ary ny mpifehy azy, izay nanompo ny mpanjaka tamin’ izay raharahany rehetra isan-tokony, Izay nifandimby isam-bolana mandritra ny herintaona, dia efatra arivo amby roa alina avy no isan’ ny isan-tokony.
Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ.
2 Ny nifehy ny antokony voalohany, ho amin’ ny volana voalohany, dia Jasobeama, zanak’ i Zabdiela, ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina;
Ndị a bụ aha ọchịagha na-achị ndị agha nʼọnwa ọbụla. Onyeisi nkewa nke mbụ, maka ọnwa nke mbụ bụ Jashobeam nwa Zabdiel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
3 isan’ ny taranak’ i Fareza izy sady lohan’ ny mpifehy rehetra tamin’ ny miaramila amin’ ny volana voalohany.
O si nʼikwu Perez nke dị nʼebo Juda, ọ bụ onyeisi ndịisi agha nke ọnwa mbụ.
4 Ary ny nifehy ny antokony ho amin’ ny volana faharoa dia Dodo Ahohita; Miklota andriandahy no isan’ ny antokony; ary ny antokon’ ny Ahohita dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke abụọ, maka ọnwa nke abụọ bụ Dodayi, nwa Ahohi bụ onyeisi agha nkewa nke abụọ. Miklot bụ onyendu otu a, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa a bụ iri puku abụọ na anọ.
5 Ny komandin’ ny antokony fahatelo tamin’ ny miaramila, ho amin’ ny volana fahatelo, dia Benaia lohany, zanak’ i Joiada mpisorona; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
6 Io no ilay Benaia, izay nahery sady ambony tamin’ izy telo-polo lahy; Amizabada zanany no isan’ ny antokony.
Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a.
7 Ny fahefatra, ho amin’ ny volana fahefatra, dia Asahela, rahalahin’ i Joaba, ary Zebadia zanany no nanarakaraka azy; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ. Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ.
8 Ny fahadimy, ho amin’ ny volana fahadimy, dia Samihota Jizarita; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
9 Ny fahenina, ho amin’ ny volana fahenina, dia Ira, zanak’ Ikesy Tekoïta; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
10 Ny fahafito, ho amin’ ny volana fahafito, dia Heleza Pelonita, isan’ ny taranak’ i Efraima; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke asaa, maka ọnwa nke asaa bụ Helez onye Pelon. Onye sitere nʼikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
11 Ny fahavalo, ho amin’ ny volana fahavalo, dia Sibekay Hosatita, isan’ ny Zerita; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke asatọ, maka ọnwa nke asatọ bụ Sibekai onye Husha. Onye sitere nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
12 Ny fahasivy, ho amin’ ny volana fahasivy, dia Abiezera Anatotita, Isan’ ny Benjamita; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
13 Ny fahafolo, ho amin’ ny volana fahafolo, dia Maharay Netofatita, isan’ ny Zerita; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke iri, maka ọnwa nke iri bụ Maharai onye Netofa, site nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
14 Ny fahiraika ambin’ ny folo, ho amin’ ny volana fahiraika ambin’ ny folo, dia Benaia Piratonita, isan’ ny taranak’ i Efraima; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
15 Ny faharoa ambin’ ny folo, ho amin’ ny volana faharoa ambin’ ny folo, dia Helday Netofatita, isan’ ny taranak’ i Otniela; ary ny antokony dia efatra arivo amby roa alina.
Onyeisi nkewa nke iri na abụọ, maka ọnwa nke iri na abụọ bụ Heldai onye Netofa. Onye sitere nʼezinaụlọ Otniel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
16 Ary izao no lohan ny firenen’ Isiraely: Tamin’ ny Robenita dia Eliezera, zanakalahin’ i Zikry; tamin’ ny Simeonita dia Sefatia, zanakalahin’ i Maka;
Ndị a bụ ndị ndu ebo Izrel niile: Elieza nwa Zikri bụ onyendu ndị Ruben; Shefataya nwa Maaka bụ onyendu ndị Simiọn;
17 tamin’ ny Levita dia Hasabia, zanakalahin’ i Kemoela; tamin’ ny Aronita dia Zadoka;
Hashabaya nwa Kemuel bụ onyendu ndị Livayị; Zadọk bụ onyendu ụmụ Erọn;
18 tamin’ ny Joda dia Eliho, izay isan’ ny rahalahin’ i Davida; tamin’ ny Isakara dia Omry, zanakalahin’ i Mikaela;
Elihu nwanne Devid bụ onyendu ndị Juda; Omri nwa Maikel bụ onyendu ndị Isaka;
19 tamin’ ny Zebolona dia Jismala, zanakalahin’ i Obadia; tamin’ ny Naftaly dia Jerimota, zanakalahin’ i Azriela;
Ishmaya nwa Ọbadaya bụ onyendu ndị Zebụlọn; Jerimot nwa Azriel bụ onyendu ndị Naftalị;
20 tamin’ ny taranak’ i Efraima dia Hosea, zanakalahin’ i Azazia; tamin’ ny antsasaky ny firenen’ i Manase dia Joela, zanakalahin’ i Pedaia;
Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem; Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase;
21 tamin’ ny antsasaky ny firenen’ i Manase tao Gileada dia Ido, zanakalahin’ i Zakaria; tamin’ ny Benjamina dia Jasiela, zanakalahin’ i Abnera;
Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead; Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin;
22 tamin’ ny Dana dia Azarela, zanakalahin’ i Jerohama. Ireo no lohan’ ny firenen’ Isiraely.
Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile.
23 Nefa tsy nanisa ny hatramin’ ny roa-polo taona no ho midìna Davida; fa Jehovah efa nilaza fa hampitombo ny Isiraely ho tahaka ny kintana eny amin’ ny lanitra Izy.
Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe.
24 Joaba, zanak’ i Zeroia, nanomboka nanisa, fa tsy nahefa, satria nisy fahatezerana nihatra tamin’ ny Isiraely tamin’ izany, ka dia tsy voasoratra ao amin’ ny bokin’ ny tantaran’ i Davida mpanjaka ny isany.
Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.
25 Ary ny tonian’ ny rakitry ny mpanjaka dia Azmaveta, zanak’ i Adiela; ary ny tonian ny trano firaiketana tany ambany vohitra, na tamin’ ny tanàna, na tamin’ ny vohitra, na tamin’ ny tilikambo, dia Jonatana, zanak’ i Ozia;
Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze. Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile.
26 ary ny mpifehy ny mpiasa tany an-tsaha hiasa ny tany dia Ezry, zanak’ i Keloba;
Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya.
27 ary ny tonian’ ny tanim-boaloboka dia Simey Ramatita; ary ny tonian’ ny divay tehirizina any amin’ ny tanim-boaloboka dia Zebdy Sifmita;
Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha.
28 ary ny tonian’ ny hazo oliva sy ny aviavy eny amin’ ny tany lemaka amoron-tsiraka dia Bala-hanana Gaderita; ary ny tonian’ ny diloilo tehirizina dia Joasy;
Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv.
29 ary ny tonian’ ny omby nandrasana tany Sarôna dia Sitray Sarônita; ary ny tonian’ ny omby tany an-dohasaha dia Safata, zanak’ i Adlay;
Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu.
30 ary ny tonian’ ny rameva dia Obila Ismaelita; ary ny tonian’ ny borikivavy dia Jedda Meronotita;
Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.
31 ary ny tonian’ ny ondry aman’ osy dia Jaziza Hagarita. Ireo rehetra ireo no tonian’ ny fananan’ i Davida mpanjaka.
Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.
32 Ary Jonatana, rahalahin-drain’ i Davida, dia mpanolo-tsaina, lehilahy hendry sady be fahalalana izy; ary Jehiela, zanak’ i Hakmony, dia teo amin’ ny zanaky ny mpanjaka;
Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.
33 ary Ahitofela dia mpanolo-tsaina ny mpanjaka; ary Hosay Arkita no sakaizan’ ny mpanjaka;
Ahitofel bụ onye na-adụ eze ọdụ. Hushaị onye Akai bụ enyi eze.
34 ary ny manarakaraka an’ i Ahitofela dia Joiada, zanak’ i Benaia, sy Abiatara; ary ny komandin’ ny miaramilan’ ny mpanjaka dia Joaba.
Mgbe Ahitofel nwụrụ, Jehoiada nwa Benaya na Abịata nọchiri anya ya. Joab bụ ọchịagha igwe ndị agha eze.

< 1 Tantara 27 >