< Abaruumi 16 >
1 Kaakano mbanjulira Foyibe mwannyinaffe, era omuweereza w’ekkanisa ey’omu Kenkereya.
Ana m eme ka unu mata nwanna anyị nwanyị, Fibi, onye na-ejere nzukọ ozi na chọọchị dị nʼobodo Senkria.
2 Mumwanirize mu Mukama waffe, nga bwe kigwanidde abatukuvu, era muyimirire naye nga mumuyamba mu nsonga yonna gye yeetaaga, kubanga naye yennyini yayamba bangi era nange kennyini.
Biko nabatanụ ya nʼime Onyenwe anyị dịka o kwesiri ndị ya. Nyekwaranụ ya aka nʼụzọ niile unu nwere ike, nʼihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị ọzọ aka.
3 Mundabire Pulisikira ne Akula, bwe tukola omulimu mu Kristo Yesu,
Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs.
4 abeewaayo wakiri okutemwako emitwe olw’obulamu bwange, era si beebaza bokka wabula n’Ekkanisa z’Abamawanga zonna.
Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha.
5 Mutuuse okulamusa kwange eri abo bonna abakuŋŋaana ng’ekkanisa mu maka gaabwe. Mundabire mukwano gwange omwagalwa Epayineeto, kye kibala eky’olubereberye eky’omu Asiya eri Kristo.
Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile.
6 Mundabire Maliyamu eyabakolera ennyo.
Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu.
7 Mundabire Anduloniiko ne Yuniya ab’ekika kyange, abaasibibwa awamu nange mu kkomera, era bassibwamu nnyo ekitiibwa abatume era be bansooka okubeera mu Kristo.
Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
8 Mundabire Ampuliyaato omwagalwa wange mu Mukama waffe.
Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nʼanya nʼime Onyenwe anyị.
9 Mundabire Ulubano, mukozi munnaffe mu Kristo, n’omwagalwa waffe Sutaku.
Keleenụ Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyi m.
10 Mundabire Apere, asiimibwa mu Kristo. Mundabire n’ab’omu nnyumba ya Alisutobulo.
Otu a kwa, keleenụ Apelis onye anwapụtarala nguzosike ya nʼime Kraịst. Keleenụ ndị ezinaụlọ Aristobulọs.
11 Mundabire Kerodiyoni muganda wange. Mundabire ab’omu nnyumba ya Nalukiso.
Keleerenụ m Herodian onye ikwu m. Keleekwanụ ndị bi nʼụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị nke Chineke.
12 Mundabire Terufayina ne Terufoosa, abaakola ennyo omulimu gwa Mukama waffe. Mundabire Perusi omwagalwa eyakola ennyo omulimu mu Mukama waffe.
Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa ndị a na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleekwanụ Pesis, onye m hụrụ nʼanya na onye na-arụsị ọrụ Onyenwe anyị ike.
13 Mundabire Luufo Mukama gwe yalonda, era ne nnyina ali nga mmange.
Keleere m Rufọs onye Onyenwe anyị nʼonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne.
14 Mundabire Asunkulito ne Felegoni, ne Kerume, ne Patuloba, ne Keruma era n’abooluganda abali nabo.
Ana m ekele unu Asinkritọs, Flegọn, Hamis, Patrobas, Hamis na ụmụnna anyị niile ndị ha na ha nọ.
15 Mundabire Firologo ne Yuliya, ne Nerewu ne mwannyina, ne Olumpa n’abatukuvu bonna abali awamu nabo.
Keleerenụ m Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị nsọ niile ha na ha nọ.
16 Mulamusagane n’okunywegera okutukuvu. Ekkanisa zonna eza Kristo, zibalamusizza.
Werenụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịta onwe unu. Nzukọ Kraịst niile nọ nʼebe a na-ekelekwa unu.
17 Noolwekyo mbakuutira abooluganda mwegenderezenga abo abaleeta enjawukana, n’eby’esittaza ebikontana n’okuyigiriza kwe mwayiga, era mubakubenga amabega.
Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.
18 Kubanga abantu ng’abo tebaweereza Mukama waffe Yesu, wabula embuto zaabwe. Bakozesa ebigambo ebirungi eby’okuwaanawaana nga balimbalimba emitima gy’abanafu.
Ndị dị otu a abụghị ndị ozi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ naanị nʼihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike.
19 Kubanga amawulire ag’okuwulira kwammwe gaabuna mu bantu bonna, kyenvudde mbasanyukira. Naye njagala mubenga bagezi mu kukola obulungi, era abalongoofu abeewala ekibi.
Mmadụ niile anụla maka nrube isi unu na-erubere oziọma ahụ. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi unu. Achọrọ m ka unu bụrụ ndị maara ihe banyere ezi ihe, ka unu bụrụ ndị na-amaghị ihe nʼihe banyere ihe ọjọọ.
20 Kaakano Katonda ow’emirembe ajja kubetentera Setaani wansi w’ebigere byammwe, mangu. Ekisa kya Mukama waffe Yesu kibeerenga nammwe.
Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
21 Timoseewo mukozi munnange, ne Lukiyo ne Yasooni wamu ne Sosipateri, baganda bange, babatumidde.
Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sosipata, ndị ikwu m na-ekele unu.
22 Nange Terutiyo awandiika ebbaluwa eno, mbatumidde mu Mukama waffe.
Mụ onwe m bụ Tatiọs, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nʼaha Onyenwe anyị.
23 Gaayo ansuza, n’ekkanisa yonna babalamusizza. Mundabire Erasuto omuwanika w’ekibuga, ne Kwaluto muganda we.
Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu. Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu.
24 Ekisa kya Mukama waffe Yesu Kristo kibeerenga nammwe mwenna. Amiina.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyeere unu niile. Amen.
25 Kaakano eri oyo ayinza okubanyweza ng’enjiri yange n’okubuulira mu Kristo Yesu bwe biri, ng’ekyama ky’okubikkulirwa eby’ebiro eby’emirembe n’emirembe ebyasirikirwa, bwe kiri, (aiōnios )
Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. (aiōnios )
26 kaakano nga bannabbi bwe baayogerera mu byawandiikibwa, ng’ekiragiro kya Katonda ataggwaawo bwe kiri, olw’okugonda mu kukkiriza eri Abaamawanga bonna abaamanyibwa, (aiōnios )
Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. (aiōnios )
27 Katonda omu yekka ow’amagezi, agulumizibwenga ku bwa Yesu Kristo, emirembe n’emirembe. Amiina. (aiōn )
Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen. (aiōn )